Ụlọomeiwu Imo amalitela inyocha 'Speaker' a chụdara n'ọkwa
Ụlọomeiwu Imo steeti amalitere ịnyocha ọnwa iri na asaa Onyeisi ha a chụturu na nsonso a bụ Collins Chiji nọrọ n'ọchịchị.
Ha nyeburu Chiji ọsọ n'ọnwa Novemba afọ 2020 maka ebubo nrụrụaka, ọchịchị aka ike na ihe ndị ọzọ.
Omeiwu Ekene Nnodimele, bụ onye na-anọchite anya mpaghara Orsu bụ onye kpalitere okwu site na ịkpọ oku ka enyocha Chiji.
Onyeisi ọhụrụ bụ Paul Emeziem na ọtụtụ ndị omeiwu kwadoro ka e mee nnyocha ahụ nke e mechara gụọ ya onyeisi oche kọmiti ga-eme nnyocha ahụ.
Ndị ọzọ nọ na kọmiti ahụ gunyere Frank Ugboma, Uche Ogbuagu, Eddy Obinna, Dominic Ezerioha, Emeka Nduka na Johnson Duru.