Eji m anya hụ ntị n'aka Coronavirus izuụka abụọ gara aga- Toke Makinwa, 'Ibute ọrịa coronavirus n'enweghị di atọghị m ọchị'
Onye ọrụ redio a ma ama bụ Toke Makinwa ekwupụtala ihe ọ gabigara dịka ọrịa coronaviris tiri ya ịgba izuụka abụọ gara.
" Amaghị ebe m siri bute coronavirus."
"Eso m mee ngagharịiwe EndSARS mana nke abụghị na m na-ekwu na ọ bụ ebe m si nweta ọrịa a."
O kwuru na ya nwere njirimara ọrịa ịba mana egwu mere ya ka ya kpọọ onye ọrụ NCDC ha bịa nnyocha ahụ mana ha ahụghị coronavirus.
O kwuru na ya ṅụrụ ogwụ ịba mana ka abalị atọ ya ṅụchara ọgwụ ịba ahụ, ahụmgbu na njibi ahụ bịara karịa nke mere ya ji nweekwa nnyocha ọzọ nke gosiri na ya nwere ọrịa coronavirus.
O kwuru na mgbe ya na-agabiga ihe ahụ, na ihe kachasị ya njọ bụ oke echiche n'ihi na ya na-atụ egwu ọnwụ.
O kwuru na ibute ọrịa coronavirus n'enweghị di atọghị ọchị.
Toke kpọrọ ụmụ Naijiria oku ka ha kee nkwụcha ọkachasị ugbua ọrịa cornavirus bidokwara ikesa ọzọ.