Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.

Kpọga m na weebụsaịtị izizi

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Gịnị na-eme n'Oyigbo, Rivers State

    Oyigbo, otu obodo dị na Rivers Steeti bụ aha ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ na soshal midia n'isi ụtụtụ a.

    Ọtụtụ na-ekwu na ha na anụ ka ụda egbe na-ada aghara aghara kamgbe ime abalị.

    Ụfọdụ tinyere ihe nkiri ebe a na-anụ ka ụda egbe na-ada, ha wee na-ekwu na a na-awakpo ogbe ahụ.

    Onwebeghị onye ma kpọmkwem ihe na-eme n'eziokwu mana ọtụtụ na-akpọ oku ka ndị ọrụ nchekwa gbagara ndị bi na mpaghara ahụ ọsọ enyemaka.

    Oyigbo bụ obodo dị n'oke ala Abia steeti na Rivers steeti.

    Ọgbaaghara dapụtaraburu ebe ahụ n'oge etechabeghị aka dịka akụkọ kwuru na a wakporo ogbe ebe ndị si mpaghara ugwu bi n'ebe ahụ.

    Anya na ntị BBC ka dị n'ihe a na-emenụ iji chọpụtachaa nke merenụ.

  2. O nweghị mgbe m nyere iwu ka e mebie akụnaụba ndị Yoroba- Nnamdi Kanu

    Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ọ bụghị ya ziri ndị gara mebie ihe akụ na ihe enweenwe ndị Yoruba na Legọs steeti dịka ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu.

    "E mere m mgbasaaozi ezie, mana ndị chabiri ya bụ ndị chọrọ itinye nghọtahie na'etiti ndị chọrọ nnwereonwe."

    O nweghị mgbe m kwuru ka ndị mmadụ gaa weghara ihe ndị Yoroba."

    "Ihe mere bụ iwe ihe mere na Lekki kụzuru ndị ntorobịaụ ha gawa mebiwe ihe."

    Kanu kwuru ọ bụ "ndị ozi gọọmenti etiti" bụ kpara ya bụ nkata.

    O rụkwara ahụ aka sị na ọ bụ ka butere ntisa n'etiti Nnamdi Azikiwe na Obafemi Awolowo ma na-achọka itisa ndị Igbo na ndị Yoroba ugbua.

    Kanu kwuru nke na 'ehihie Tozde na mkparịtaụka mberede nke Ụlọọrụakụkọ Njenje Media TV haziri n'igwe okwu 'Zoom' nke Femi Fani Kayode bụbbu Minista njem ụgbọelu nọkwa na ya.

    Kanu toro ndị ntorobịa Naijiria maka ịpụta mee ihe

  3. "Nwoke na nwoke ịlụ onwe ha adịghị njọ" - Pope Francis

    Onyeisi ndị ụka kathọlịk bụ pope Francis ekwuola na n'uche obi ya, na nwoke ịlụ nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị ilụ nwaanyị ibe ya adịghị njọ.

    O kwuru na ndị dị etu a kwesịrị ịnwe ezịnụlo n'ihi na ha niile bu ụmụ Chinkeke.

    Na nkọwa ya ka o kwuru na ndị a kwesịrị ịgba akwụkwọ dịka iwu ikike dịrị onye siri dị.

    Ma kwuo na ekwesiri ịwepụta iwu kwadoro ha ịlụ onwe ha.

    Ọ bụ na ihe onyonyo Evgeny Afineevsky mere ka Pope Francis kwuputara nke a.

  4. Manchester United emekwaala ya ọzọ na Paris

    Ndị Manchester United ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie ndị Paris St Germain nke mba Fransị oge ha abụọ zutere n'asọmpi Uefa Champions League n'abalị Tuzde.

    Nke a echeterela ndị mmadụ etu Man Utd si merikwaa PSG na be ha n'asọmpi a afọ abụọ gara aga.

    Ọ bụ Man Utd bu ụzọ nyete goolu n'agba nke mbụ oge Bruno Fernandez gbakpu penariti e nyere ha.

    Anthony Martial ji aka ya nye onwe ha goolu iji saara PSG n'agba nke abụọ.

    Mana Marcus Rashford gosiri ihe o ji bụrụ odogwu oge o nyere goolu ọzọ oge ọ fọdụrụ nkeji olemole ka asọmpị ahụ bịa na njedebe.

    Man Utd bụzi ndị nke abụọ n'otu G nke asọmpi 'Champions League afọ a; RB Leipzig bụ ndị nke mbụ dịka ha jikwa ọkpụ goolu abụọ a saghị asa merie ndị otu Istanbul Basaksehir.

    Lee ka asọmpi 'Champions League' ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde si gaa:

    Zenit St Petersburg 1 - 1 Club Bruges

    Dynamo Kyiv 0 - 2 Juventus

    Chelsea 0 - 0 Sevilla

    Rennes 1 - 1 FK Krasnoda

    Lazio 3 - 1 Borussia Dortmund

    Barcelena 5 - 1 Ferenvárosi

    RB Leipzig 2 - 0 Istanbul Basaksehir

  5. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Ndewo dịka ị na-esonyere anyị taa.

  6. Daalu maka ịnọnyere anyị taa, Ka ọ dị echi

    Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'Owerre nchị, ka chi foo!

  7. Kedụ otu Mbappe ga-ahọrọ n’afọ ọzọ na-abịa?

    Ọgba boolu ndị otu Paris Saint Germain bụ Kylian Mbappe dịka ọ chọzighị ịnọ n’otu ahụ ma nkwekọrịta ya na ha bịa na njedebe.

    Mbappe, onye dị afọ iri abụọ na otu na-agbara mba Fransị bọọlụ, sonyere otu PSG kemgbe afọ 2017.

    Mana dịka ọ dị ugbua, kepukepu na-ekwu na ọ bụ otu Liverpool na Real Madrid ka anya ha dị n’ahụ ya ịnwale ma ha a ga-azụta ya.

    Amabeghị otu Mbappe ga-ahọrọ n’ime otu abụọ ndị a.

    N’aka nke ọzọ otu Tottenham na-akwado ịtinyeso ego n’ụgwọ ọnwa ọgba bọọlụ ha bụ Son Heung-min iji me ka ọ dọtịkwuo oge ya n’otu ahu.

  8. Ka ọ dị nụ echi!

    Daalụ bụ maka isonye anyị.

    Echi ga-aka mma!

  9. Virgil van Dijk: Liverpool ha alaala na mgbuka?

    Ụfọdụ na-ekwu na egwu ejidela ndị otu Liverpool dịka onye ndu ha na onye na-agba azụ bụ Virgil van Dijik merụrụ ahụ n'ikpere ya dịka ha zutere ndị otu Everton nsonso a.

    Dijik na-ekwu na ọ ga-anwa ike ya iji hụna ọgbakere ma bido asọmpị n'oge na-adịghị anya.

    A ga-awa ya ụkwụ nke mere na amabeghị mgbe ọzọ ọ ga-enweike ịgba bọọlụ ọzọ.

    Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnọdụ a

  10. A nwụchiela mmadụ 25 maka igosi asambodo covid-19 adịgboroja

    N’afrịka, ndị uweojii mba Uganda anwụchiela ndị njem iri abụọ na ise a na-enyo maka igosi asambodo nnyocha covid-19 adịgboroja.

    E jidere iri abụọ na atọ n’ime ha ka ha na-akwado ime njem n’ọdọụgbọelu Entebbe dị nso isiobodo Kampala, ebe a nwụchiri abụọ ndị ka batara abata.

    Mara na mba Uganda ka mepere okeala ha na mba ndị ọzọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba, ka ọnwa isii ha ji buso mfesa ọrịa coronavirus agha gachara.

    Ugbua, ha na-ana ndị njem akwụkwọ gosiri na ha ebughi ọrịa covid-19, site na nnyocha e mere na-akarịghị ụbọchị ise tupu onye ahụ emee njem.

    Ndị njem na-abata n'ime mba ahụ kwesịkwara iweta akwụkwọ gosiri na ha ebughi ya bụ ọrịa n'ime ụbọchị atọ tupu ha abanye ụgbọelu ga-ebulata ha.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ 10,590 ebutela ọrịa coronavirus na mba ahụ, ebe mmadụ 97 nwụrụla n'ime ha.

  11. Igbo ndị ọma ka ọ dị nụ echi

    Hie nụ ụra n'udo ma chete soro anyị echi.

  12. Igbo ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Nnọọnụ na peeji anyị taa!

    Anyị amalitela iwetere unu akụkọ dị iche iche na-ekpo ọkụ n'ala Igbo nakwa mba ụwa niile.

  13. Igbo ndị ọma ebe a ka anyị ga-awụsa ọwa nke taa

    I meela n'isonye anyị taa, ka ọ dị echi.

  14. Manchester City ewerela Arsenal gụrụ akara atọ dị ọkụ

    Manchester City gosiri Arsenala ihe nwoke ji kara ibe ya dịka ha ji oru ọkpụ goolu a na-asataghị otu merie ha n'asọmpi Premier League.

    Goolu a si n'aka Raheem Sterling na nkeji 23' n'ọkara nke mbụ n'asọmpi.

    Arsenal nwara ike ha dịka dimkpa ha bụ mana Manchester City ekweghi ha nyeta goolu.

    N'otu ahụ Manchester City gbalịkwara inye Arsenal goolu ọzọ mana ha jụwara isi ruo mgbe asọmpi a gwụrụ na nkeji 90'.

    Ugbua Arsenal bụ ndị ise ebe Manchester City bụ ndị iri n'ogogo tebụlụ.

  15. Ndịagha Naịjirịa sị ha ga-amalite emume a kpọrọ 'Ọchị Agụiyi' na Naịjirịa niile

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ga-amalite atụmatụ a kpọrọ 'Ọchị Agụiyi' bụ Crocodile Smile na bekee n'ebe niile na Naịjirịa.

    Ozi a si d n'akwụkwọ si n'aka ọnụ na-ekwuru ndịagha na Naịjirịa bụ Sagir Musa.

    Emume a nke bụ ihe ha na-adị emekarị kwa ngwụcha ọnwa anọ afọ ọbụla ga-amalite n'ụbọchị 20 ọnwa Ọktoba ruo ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ 2020.

    Ha sị emume a ga-agbakwasị ụkwụ n'ibuagha megide mpụ na-eme n'ịntanet iji nyocha ma chọpụta mgbasaozi akụkọ maọbụ echiche ọjọọ na-eme n'elu ịntanet.

    Ha sị na nke a ga-abụ mbụ ndịagha mba Afrịka ga-eme emume ga-ebuagha megide mpụ n'ịntanet.

    Ha kwukwara na ọ ga-enyocha inyochapụta ndị Boko Haram batarala n'obodo dị na mpaghara ugwu nakwa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa.

    Ha kwere ngwa na ọ bụ maka udo na ọganihu ndị Naịjirịa ka na-achọ ma rịọ ka ụmụ Naịjirịa kwadoo ha n'oge niile ha ga-eme ya bụ emume.

  16. Chelsea akpọrọla ụkwụ ọcha n'aka Southampton

    Southampton fooro ntụtụ taa ma sị na Chelsea agaghị emeri ha n'asọmpi Premier League dịka ha ji ọkpụ goolu atọ atọ gbaa onwe ha onye lawa onye lawa.

    Chelsea malitere inye goolu abụọ na nkeji 15' na 28' site n'aka Timo Werner bụ onye nyere goolu abụọ a.

    Danny Ings nke Southampton sara otu goolu na nkeji 43' tupu ọkara mbụ apịachie ọnụ.

    N'ime ọkara nke abụọ, na nkeji 57' Che Adams mezuru ya goolu nke ndị Southampton.

    Na-egbughi oge, Kai Havertz nyere ndị Chelsea goolu nkeji 59' iji mee ya nke atọ.

    Mana Jannik Vestergaard nke Southampton mere ka odo Chelsea anya na ha mụ anya site n'inye goolu nke atọ ha na nkeji 90'.

    Nke a mere ka a ga-asị na Chelsea na Liverpool tetere ụra n'otu akwa ndina dịka ha abụọ enweghi ike merie n'asọmpi ha gbara taa.

    Ugbua Chelsea bụ ndị isii n'ogogo tebụlụ Premier League.

  17. Ọ bụ na mma agha Liverpool anaghị aghọzi nkọ?

    Otu egwuregwu Everton ekweghi ka Liverpool ṅụrụ mmiri tọgbọ iko n'asọmpi Premier League ha gbara nke ha ji ọkpụ goolu abụọ abụọ si onye laba.

    Liverpoo bu ụzọ nye goolu na nkeji 3' site n'aka Sadio Mane mana Everton sara mgbe Michael Keane nyere goolu na nkeji 19'.

    Otu egwu abụọ ndị kwechiri na onweghi onye ga-emeri ibe ya ruo na nkeji 72' mgbe Mohamed Salah nyere goolu ọzọ.

    Na-egbughi oge, Dominic Calvert-Lewin saara ndị Everton goolu na nkeji 81' nke gbawara obi ndị Liverpool.

    Mana ebe obi Liverpool nọzi gbaa riri bụ mgbe ogbu pịpịrọ gụpụrụ goolu Jordan Henderson yere na nkeji 90' ma sị na ọ bụ nke a kpọrọ "offside".

    Kamgbe a malitere asọmpi Premier League nke afọ a, Liverpool ahụbeghi gbaa, ọ dịzi ka mma agha ha ọ nwụọla nkọ.

    Ha ji akara iri nọrọ n'ogogo abụọ na tebụlụ Premier League ebe Everton ji akara iri na atọ bụrụ ndị mbụ.

  18. Chibuike Amaechi na-eleta ọrụ ụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan ugbua

      • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo

    Minista na-ahụ maka njem bụ Chibuike Rotimi Amechi nọ na Legọs ugbua ebe ọ gara njem nleta etu ọrụ si aga n'ụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan.

    Ya ndị na-elekọta ya bụ ọrụ bu ụzọ gaa n'ọdọụgbọoloko nke dị na Yaba tupu ha-esi ebe ahụ gawa nke dị n'Agege na mpaghara Legọs

    Lee photo etu o si aga dịka anyị si hụ ya.

    Ọ gakwara n'ọdọụgbọoloko nke dị n'Iju dị na mpaghara mpụta Legọs.

    Cheta na Amaechi kwere nkwa na gọọmentị etiti na-akwado ịgbape njem ụgbọoloko nke ga-esi nke si Legọs gawa Ibadan dị n'Oyo steeti.

    Ọ bụ ya bụ ọrụ ka ọ bịara Legọs ịleta ma marakwa ebe arụrụ ya be.

  19. Mmadụ 212 ebutela coronavirus ọzọ na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ MAKA mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ "Nigeria Centre for Disease Control" (NCDC) ekwuola na nnyocha ọhụrụ ha mere gosiri na mmadụ 212 ọhụrụ ebutere coronavirus ọzọ.

    Nke a butere ndị ọrịa ahụ fesarala mmadụ 61,194.

    Mmadụ 52,304 n'ime ha agbakeela ma laa be ha ebe mmadụ 1,119 lara mụọ site n'ọrịa a.

  20. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Daalụ nụ maka ịsonye anyị taa.

    Anyị ga-ewetara unu akụkọ niile dị mkpa gbasara ihe na-akpọtụ na Naịjirịa na mba ndị ọzọ.