Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.

Kpọga m na weebụsaịtị izizi

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Etu ihe mberede ụgbọloko na ụgbọala si taa isi mmadụ 18

    Ụgbọala Bus na ụgbọloko sọkọtara isi na Thailand, gbuo mmadụ ruru iri na asatọ ma merụọ ọtụtụ ndị ahụ.

    Ihe mberede a mere n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde n’ebe ji kilomita iri ise dị nso na mpaghara ọwụwanyanwụ Bangkok.

    Ndị uweojii Thailand sị na ndị nọ n'ime ụgbọala a na-aga n'ụlọokpuruchi ịga mechie obubu ọnụ Buddhist.

    Foto si ebe ahụ na-egosi ka ụgbọala a sọgharịrị n'akụkụ ya dịka ọ kpọkasịchara n'okporo ụgbọloko ahụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata sị na ha chọrọ iji ngwaọrụ 'crane' ebupụta ụgbọala ahụ.

    Mmadụ dị iri isii nọ n'ime ụgbọala ahụ na-eme njem mgbe ihe mberede a mere dịka gọvanọ mpaghara ahụ bụ Maitree Tritilanond si kwuo.

    Praịm minista mba Thailand bụ Prayut Chan-O-Chan ezigala ozi iti aka n'obi ma kpọọ oku ka e mee nyocha ọfụma.

    Ihe mberede ụkporoụzọ na-emekarị na mba, nke a abụghị mbụ.

    N'ọnwa Maachị afọ 2018, ihe karịrị mmadụ iri na asatọ nwụrụ ebe ọtụtụ merụrụ mgbe ụgbọala hapụrụ ụzọ ma sọnye isi n'osisi na mpaghara ọwụwanyanwụ Thailand.

  2. Ọtụtụ mmadụ etinyela aka n'akwụkwọ ka Amerịka machie ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata mba ha

    Mmadụ karịrị puku iri etinyela aka n’akwụkwọ mkpesa e degara mba Amerịka ka ha kwụsị ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata Amerịka ma ọ bụrụ ha ekposaghị ngalaba uweojii SARS.

    Ntinyeaka n’akwụkwọ a malitere n’ụbọchị Fraịde dịka ọkpụkpọ oku ka e kposaa ngalaba uweojii na-arị elu.

    Onye malitere ya bụ onye ntaakụkọ Farida Adamu

    Cheta n’ọnwa gara aga na mba Amerịka kwuru na amachiela inye ụfọdụ ndị ịbata mba ha n’iyi agwa ha kpara na ntuliaka ọkwa gọvanọ Bayelsa na Kogi Steetị n’afọ 2019.

    N’otu aka ahụ ka ndị a kpọrọ oku ka gọọmentị mba Amerịka machikwuo ndị ọchịchị Naịjirịa ịbata Amerịka ruo mgbe ha ga-ekposa ngalaba uweojii SARS.

  3. Nwakpo n'ike bụ nsogbu kachasị emetụta nwata nwaanyị - FIDA

    Dịka taa bụ ụbọchị ncheta nwata nwaanyị n'ụwa a kpọrọ 'International Day of Girl Child' otu jikọtara ụmụnwaanyị ọkaiwu etinyela ọnụ na nsogbu ụmụnwaanyị na-agabiga ọkachasị ụmụaka.

    Otu a kpọọ 'International Federation of women lawyers sị na nsogbu kachasị emetụta nwata nwaanyị bụ idina ya n'ike (Rape) n'ime nsogbu ndị ọzọ.

    Ha kpọrọ oku ka steetị niile tinye iwu ga-enye aka belata ụdị arụ a a na-akpa megide ụmụnwaanyị n'obodo.

    Onyeisi otu a nke ngalaba Ebonyi Steetị bụ Grace Iheanacho Chima gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abakiliki, sị na a nwe ọtụtụ akụkọ banyere mwakpo ụmụaka nwaanyị dị n'ogogo ọnwa itoolu ruo afọ asaa kwa ụbọchị.

    Ọ sị na na-akpatakarị nke a bụ enweghi ezi ọzụzụ na nlekọta site na nne na nna mụrụ ụmụaka ndị a, na e kwesịrị ịkwụsị ya tupu obodo a laa n'iyi.

    Iheanacho sị ihe ọzọ a na-ema ụmụaka nwaanyị gụnyere; ịtụ ha mgbere, ịkpagbu ha, enyeghi ha ezi ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ, ịnye ọrụ siri ike, ịlụnye ha di na nwata, ịkpasị ha oke na ije ndị ọzọ.

    Ọ kpọrọ oku ka gọọmentị lebara ụmụaka ụmụnwaanyịa anya n'ụzọ zuruoke iji kwụsị arụ ndị a a na-akpa megide ha.

  4. Igbo bụ Igbo, unu abọọla chi?

    I meela n'isonyere anyị n'ụbọchị gara aga.

    Anyị ji ụkpa ekele anabata unu n'ụbọchị taa.

  5. Ka chi fo nụ

    N'ebe a ka anyị ga-eweta mgbasaozi nke taa n'isi njedebe.

    Ka ọ dịnụ echi.

  6. Ọ bụghị anyị gburu onye nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomoso - Ndị uweojii

    Ndị uweojii n'Oyo steeti ekwuola na ọbụghị ha gburu nwata nwoke ahụ nwụrụ na ngagharịiwe n'Ogbomosho.

    Cheta na Gọvanọ steeti ahụ kwuru na ọ bụ mgbọ tụgburu nwata nwoke a aha ya bụ Jimoh Isiaq.

    Mana onụ na-ekwuru ndị uweojii na Oyo steeti bụ Olugbenga Fadeyi kwuru na ndị otu ya nọ mgbe ihe na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe.

    Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ News Agency of Nigeria si kwuo, Fadeyi kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o nyere ndị ntaakụkọ.

    O kwuru sị: "Ndị uweojii nọ ya mgbe ngagharịiwe a na-eme kwuru na ha agbapụghị kama otu ọnụ egbe."

    "Anyị hapụrụ ndị ahụ na-eme ngagharịiwe ruo ihe karịrị otu awa, mana ụfọdụ n'ime ha chọziri ịwakpo ụlọọrụ anyị."

    "Ọ bụ oge ahụ ka ndị uweojii ji gbaa anwụrụ ose (tear gas) iji chụsaa ha, mana anyị agbaghị egbe ọbụla.

    Otu dị icheiche, tinyere Amnestry International kwuru na ọnwụ Jimoh Isiaq dị ndị uweojii n'isi.

  7. Mgbọ ndị uweojii atụgbuola otu onye na ngagharịiwe n'Oyo steeti

    Otu onye aha ya bụ Jimoh Isiaka alaala mmụọ dịka mgbọ ndị uweojii tụrụ ya oge a na-eme ngagharịiwe n'obodo Ogbomoso dị n'Oyo steeti.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Seyi Makinde kwupụtara nke a n'akara Twitter ya na mgbede Satọde.

    O kwuru na aka ike nakwa mmekpa ahụ ndị uweojii na-emeka ụmụ mmadụ na Naịjirịa bụ nnukwu ihe mwute.

    Makinde kwukwara na mmadụ asaa ọzọ merụkwara ahụ na ngagharịiwe ahụ; aha abụọ n'ime ha bụ Abdulrasaq Olawale na Oluwadamilare Gbolohunmi.

    O kwuru sị: "Ngagharịiwe a egosila na ndị iwu Naịjirịa nyere ikike ichekwa ụmụ mmadụ anaghị eme nke a."

    "O gosikwala mkpa ajụjụ anyị na-ajụ kamgbe dị, nke bụ ihe kpatara na ndị gọvanọ enweghị ike ịchịkọta ndị uweojii nọ na steeti ha."

    Makinde gara n'ihu kpọọ oku ka ndị ntorobịa steeti ahụ wetuo obi maka ihe a merenụ n'ihi na ọ gwala onyeisi ndị uweojii Oyo steeti bụ Nwachukwu Enwonwu, na ndị isi ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha bịa kọwaara ya ihe kpatara ọnwụ nwata nwoke ahụ.

    Ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na Twitter gosiri na e liela ya bụ nwata nwoke dịka usoro okpukperechi ndị alakụba si dị.

  8. Ngagharịiwe maka SARS eruola mba Canada

    Ụmụ Naịjirịa bi na mba Canada sonyekwara ndị nọ na Naịjirịa na-eme ngagharị iwe ma na-akpọ oku ka gọọmentị mechie ngalaba ndị uweojii a kpọrọ Sars.

    Ihe onyonyo e tinyere na Twitter gosiri ebe ha jicha ọkọlọtọ Naịjirịa ma na-ekwe ukwe njirimara Naịjirịa bụ 'National Anthem'.

    ọtụtụ n'ime ha na-etikwa mkpu ka gọọmentị mechie SARS n'egbughị oge.

  9. SARS: Mba Sweden etinyela ọnụ katọọ aka ike ndị uweojii na Naịjirịa

    Mba Sweden ekwuola na ha anaghị akwado mmekpa ahụ ndị uweojii na-emekpa mmadụ na Naịjirịa.

    Ha kwuru nke a dịka ihe onyonyo na-apụta na soshal midi etu ndị uweojii si eji aka ike achụsasị ndị na-eme ngagharịiwe.

    N'ozi ha zipụrụ n'akara Twitter ha, ụlọ nnọchite anya mba Sweden na Naịjirịa kwuru na ha agaghị akwado mkpagbu ikike dịịrị ndị mmadụ ine ngagharịiwe ma kwuo uche ha.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na ndị uweojii gbagburu otu onye aha ya bụ Jimoh Isiaq n'obodo Ogbomosho nke dị n'Oyo steeti.

    Ụlọọrụ na-ahụkwa maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International, tinyekwara ọnụ ma kwuo na ọ bụ ndị uweojii gburu onye ahụ.

    BBC achọpụtachabeghị ihe merenụ kpọmkwem, mana ya bụ akụkọ ka ga-abịa.

    Ndị uweojii ekwubeghịkwa ihe ọbụla gbasara ya.

  10. Ezenwaanyị Elizabeth etunyela Rashford ugo pụrụ iche

    Ezenwaanyị Eliza etunyela ọgba bọọlụ ndị Manchester United bụ Marcus Rashford ugo pụrụ iche maka mbọ ọ gbara inye ụmụaka onweghị ka ọ ha ha nri, n’oge a kpọchiri obodo maka ọrịa covid-19.

    Nturu ugo bụ nke Bekee kpọrọ ‘Member of the Order of the British Empire’ (MBE).

    Rashford tinyere ego ya ma kpọkwaa oku ka ndị mmadụ tụkọta ego iji na-enye ụmụntakịrị nri.

    Dịka a malitere ịgbape obodo obere obere, Rashfor gakwara n'ihu n'atụmatụ ahụ ma rịọkwaa gọọmentị ka ha tinye aka.

    Oge Rashford malitere atụmatụ a, o bu n'obi na ndị mmadụ ga-etinye aka tụkọta otu narị puku paụnd (£100,000), mana ka ọ dị ugbua, ego a tụkọtara agafeela nde paụnd iri abụọ (£20 million).

  11. Burna Boy etinyela ọnụ n'okwu maka ịkwụsị SARS

    Otiegwu aha ya na-ewu n'ụwa niile bụ Burna Boy etinyela ọnụ ya n'okwu gbasara mmekpa ahụ ndị uweojii na-emekpa ndị mmadụ na Naịjirịa.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ya maka ịgbachị nkịtị kamgbe ngagharịiwe malitere ịrị ibe ya elu maka nke a.

    O kwuru na ya agaghị agbachị nkịtị gbasara nke a n'ihi na ya bụ ihe jọgburu onwe ya.

    Burna Boy gara n'ihu kwuo sị: "Ihe kacha m mkpa ugbua bụ ka ndị ka e mechie ngalaba ndị uweojii a bụ SARS."

    "O doro m anya na ihe a na-emebu na mbụ bụ ịgbanwe aha ha, nye ha aha ọhụrụ, mana ugbua, ihe anyị chọrọ bụ ka e mechie ya kpamkpam."

    Burna boy kelere ndị niile sonyere na ngagharịiwe na-aga n'ihu na steeti dị icheiche na Naịjirịa ugbua.

    O kwukwara na ya ga-ewepụta ego iji nyere onye ọbụla merụrụ ahụ na ngagharịiwe a aka.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya ga-emepe ngalaba ga-enye aka ịkuziri ndị na-eto eto maka ntọala Naịjirịa nakwa Afrịka.

    Burna Boy kpọpụtara aha ụfọdụ ndị akụkọ kwuru na ha nwụrụ n'aka ndị uwe ojii ma kwuo na agaghị echefu aha ha.

  12. Ndị uweojii ejirila egbe kụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe na Ogbomosho

    Ihe onyonyo pụtara na soshal midia na-akọwa na ndị uweojii ji mgbọ egbe chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe maka mkagbụ ha na-ebo ndi uweojii SARS n'Ogbomosho di n'Oyo steeti.

    Otu onye nọ oge ihe mere gwara BBC na mgbo egbe tụrụ otu onye mana ya akpọrọla ya gaa ụlọ ọgwụ.

    Onye ahụ zitere BBC ihe onyonyo gosiri ebe a ba-acho ịzọ onye bu akpa yiri nke mgbọ egbe.

    Ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Oyo steeti Fadeyi Olugbenga gwara BBC na onweghi onye ọbụla ha gbara egbe, ma kwụọ na ọ bụ anwụrụ anya mmiri ka ha jiri kụsasịa ndị a na-eme ngagharịiwe.

  13. Emebiela ọtụtu ihe dịka ọgbaghara dara n'etiti ndị Awụsa na Yoroba n'Ikorodu dị na Legọs

    Mpaghaara obodo Igbo-Olomu dị n'Isawo-Agric nke di n'okpuru ọchịchị Ikorodu, na Legọs steeti chiobi ha n'aka dịka ọgbaghara dara n'ebe ahụ ụbọchị Fraịde.

    Onye ntaakụkọ BBC bi n'ogige ihe a na-me kwuru na ebe niile juru oyi ugbua dịka ndi mmadụ nọ na-ezere isi ha n'ime ụlọ ha.

    Akụkọ na-ekwu na nsogbu a malitere n'ụbọchi Monde dịka ikorobia ụfọdụ si agbụrụ abụọ a lụsịrị onwe ya ọgụ n'ebe ahụ.

    Ugbua, ọkụ ndị a na-ese okwu mụnyere agbaala ọtụtụ ọdọ ahịa.

    Ihe onyonyo ndi mmadụ tinyere na soshal midia na-egosi oge ọgbaghara ka dị ọkụ, dịka nke a etinyere na Twitter n'ụbọchị Tọzde.

  14. Algeria adụnyela Naịjirịa otu ọnụ akara n'asọmpi enyi na enyi

    Otu egwuregwu bọọlụ mba Ọjerịa ji otu ọkpụ goolu anasataghị merie ndị Super Eagles nke Naịjirịa n'asọmpi enyi na enyi ha gbara na Fraịde.

    Goolu a bịara n'ime nkeji isii a malitere asọmpi a site n'aka Ramy Bensebaini nke Ọjerịa.

    Naịjirịa nwara ike ha ịsa goolu a mana ndị Ọjerịa fooro ntụtụ taa sị na nke a agaghị eme, ebe na Naịjirịa kwechikwara nke ga.

    Nke a bụ asọmpi mbụ oche goolu ndị Naịjirịa bụ Maduka Okoye na-amalite.

  15. Agwaala onyeisi ndi uweojii ka ọ mee ihe maka SARS - Buhari

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru na ya na onyeisi ndi uweojii bụ Muhammed Adamu zutere n'obi gọọmentị n'Abuja maka okwu ngalaba uweojii a na-akpọ SARS.

    Buhari sị na ya agwaala maazị Adamu ka ọ gbaa mbọ lebanye anya n'okwu ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe na-eme banyere mmekpa ahụ ha na-ebe ndị ọrụ uweojii SARS.

    Buhari sị na ya enyela iwu ka anwụchie onye uweojii ọbụla aka ya dị n'ajọ ihe ndị a na-ebo ndị SARS.

    Ọ rịrịọ arịrịọ ya ndi mmadụ nwee ume ala dịka ha na-eme ngagharịiwe n'udo.

  16. Unu asaala chi?

    Anyị na-enye unu ekene pụrụ iche dịka unu na-esonye anyị taa.

    Akụkọ pụrụiche ga-esi ebe ruo unu aka.

    Ya gazie.

  17. Ka chi fo

    Ụmụ Igbo, anyị ga-akwụsị ebe a taa.

    Ka chi fo nụ.

  18. Ndi amakaekwu agbabuola onye omeiwu na mba Gana

    Na Ghana akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị omekome gbagburu otu onye omeiwu mba ahụ.

    Ndị ajọ mmadụ a gbagburu Ekow Quansah Hayford n'ụzọ ebe o sị emume ịchụnta votu patị ha alọta n'isiututu Fraịde.

    Akụkọ kwuru na ndị amakaekwu mmadụ isii ji egbe nwakporo ya bụ nwaamadị na-anọchị anya ndị Mfantseman ka ọ na-alọta ebe elekere nke mbụ ụtụtụ Fraịde.

    Ọbaozi ntaakụkọ ndị Joy Online si na ya bụ nwaamadị kọwaara ha onwe ya tupu ha agbaa ya ọnụ egbe abụọ sị ya na ọ bụ ya bụtere nsogbu dị na Gana.

    Redio Citi Fm kwukwara na ha gbakwara draịva ya egbe, mana ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Onweghị ihe metutara mmadụ atọ ndị ọzọ so ha.

    Cheta na ntuliaka ndị Gana na-abịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba.

  19. Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe na Malawi

    Ọzọ dịka ibe ya, n'Afrịka, bụ na ndị mmadụ emeela ngagharịiwe maka ihe ha kpọrọ ịkpaoke ụmụnwaanyị n'owuweọrụ na gọọmentị Malawi.

    Ndị mere ya bu ngaghịiwe sị na onyeisiala ha bụ Lazarus Chakera eweghị ụmụnwaanyị n'ọrụ dịka iwu kwesiri.

    Iwu be ha kwuru na ọnweghị ụmụnwoke maọbụ ụmụnwaanyị ga-akarị pasent iri isii n'ọchịchị ebe ha si na ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị erughị pasent iri atọ.

    Ndị kpokobara ya bụ ngaghrịiwe bụ ndị Women’s Manifesto Movement sị na onyeisiala ha anaghị eme ihe ha turu anya.

    Nke a mere ka onyeisiala ha si njem abali atọ o mere na Tazania gbalata na mberede.

  20. Ụlọikpe na Port Harcourt amaala onye mgbuisi, Gracious David-West, ikpe ọnwụ

    Ụlọikpe na Port Harcourt, River steeti, ekpebiela ikwugbu ya bụ nwaamadị na-egbu ụmụagbọghọ na họtelụ n'Igweọcha, River steeti.

    E kpere David-West ikpe ọchụ n'isi ụmụnwaanyị itoolu ya na ịkpankata igbu onye ọzọ.

    Onye okaikpe kpebiri ya bụ ikpe bụ Jọstis Adolphus Enebeli kpebiri na ọ bụ Graciuos David-West gbara afọ iri anọ gburu Maureen Ewuru, Jennifer Nwokocha, Blessing Effiong Linda Warifa Samuel, Dorcas Francis, Kelechi Bridget, Onuoha Rose, Samuel Anthonia Ibe ma kpakwaa nkata igbu Benita Etim.

    Ikpe David-West malitere na Pọtakọtụ kemgbe ọktoba 2019 mgbe ndị uweojii kpaara ya aka n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa ahụ.

    Onweghị onye gosiri onwe ya maka ịgwado David-West maọbụ ndị o gburu kemgbe ya bụ ikpe malitere.

    Onweghịkwa ndị bịara iburu ozu ụmụnwaanyị ndị ahụ n'ụlọ ndowe ozu.