Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari enyela ndi Omeiwu mba ahu akwụkwọ mkpata na mefu nke 2021.
Tupu Buhari enye ndị Omeiwu akwụkwọ onyeisi ndi Omeiwu Ukwu bụ Ahmad Lawan sị na a ga-achabi ndị na-anọ n'ime ụlọ omeiwu maka nje coronavirus.
Ọ bụ naịra 379 ka gọọmentị sị na a ga-eji gbanwee dọla na bọọjetị a.
Ha sikwa na a ga-eji agbọ mmanụ erere dọla 40 hazie bọọjeti a.
Ọ bụ naịra 305 igote otu dọla ka e ji mee nke afọ gara aga, dịka e tinyere ego mmanụ agbịdị ka dọla 57 nke otu agbọ mmanụ.
Naịjirịa na-emepụta agbọ nde 2.18 kwa ụbọchị n'afọ 2019 mana ọ bụ nde 1.86 ka a na-empụta kwa ụbọchị.
Buhari kwuru na ọ bụ mmepe obodo ka ha ga-etinye n'uchu na bọọjetị nke 2021 a.
Buhari sị na akụnaụba Naịjirịa nwere ezigbote nsogbu sitere na coronavirus, mana agbanyeghi nke a o mere ọfụma karịa mba ndi ọzọ.
Ọ sịkwa na e nwere olieanya na akụnaụba mba ahụ agaghị eme ọfụma dịka afọ 2020 na-abịa na ngwụcha.
Buahri sị na gọọmnetị ya na-agba mbọ ị hụ ndụ dịrị Naịjirịa mfe.
Ọ sị na a ga-ebite ego ji kwalite bọọjetị a ruo ịtarị naịra anọ na ụma.