Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Onye uweoji ji onwe ya chụ aja anwụọla
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Arnaud Beltrame bụ onye uweoji mba France nyere onwe ya ka onye jichiri ndị mmadụ were tọghapụ otu nwaanyị mgbe a wakporo otu ụlọahịa n'obodo Trèbes.
Nwoke ahụ enyere aha ya bụ Redouane Lakdim gburu mmadụ atọ tupu o jiri Beltrame gbochie onwe ya mgbe ndị uweoji malitere ị gba ya egbe.
Beltrame nwụrụ site na mgbọ ndị ahụ bara ya ahụ.
Ndị mmadụ nọ na-egosi nwute ọnwụ ya wutere ha n'elu igwe okwu Twitter:
Akụkọ ga-amasị gị: