Kedụ ka El Niño ga-esi metụta ụmụafọ Nigeria?
Ụlọọrụ Nigerian Meteorological Agency kwuru na mmetụta El Nino nwereike imetụta mmiri ozuzo ma mee ka ebe niile na-ekpo ọkụ.
El Nino nwereike ibute oke idemmiri na Sokoto, Kebbi, Zamfara, Katsina nakwa ọtụtụ state ndị ọzọ na mpaghara ugwu Nigeria.
Oyo, Ogun, Osun, Ekiti, Edo na Delta state ga-enwe oke ekpomọkụ.
NiMet kwuru na nke a nwereike imetụta ndị ọrụ ugbo na state ndị a.
NiMet kọwara na El Nino nwereike imetụta ọkụ latrik n'ihi na mmiri ezughịoke n'ogige hydropower plant e ji emepụta ọkụ latrik.
El Nino nwereike imetụta ọnụahịa ihe oriri dị iche iche.
Maka etu ọ ga-esi metụta ahụike gị, Dọkịnta Eze Nwite dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla belata ịga ije n'anwụ ọkachasị n'elekere iri abụọ nke ehihe ruo elekere anọ nke gbede.
O kwuru ka onye ọbụla na-aṅụ mmiri etu o kwesiri ma kpọọ oku ka gọọmenti nakwa ụlọọrụ ahụike dị iche iche gbaa mbọ fesaa ozi nye ọhanaeze iji hụ na ha chekwara onwe ha.



