Lee iwu ọhụrụ e wepụtara maka ndị mbịarambịa chọrọ ibi na UK ruo ebighi ebi

Aha onyonyo, Lee iwu ọhụrụ e wepụtara maka ndị mbịarambịa chọrọ ibi na UK ruo ebighi ebi
Lee iwu ọhụrụ e wepụtara maka ndị mbịarambịa chọrọ ibi na UK ruo ebighi ebi
Mgbe e biputara ya

Gọọmenti UK agbanweela ụzọ ndị mbịarambịa si enweta ikike ibi na Britain ruo mgbe ebighị ebi.

Na mbụ, ọtụtụ mmadụ na-enweta ikike a mgbe ha biri afọ ise na UK. Mana ugbua, okwu agbanweela maka na iwu ọhụrụ ụlọọrụ na-ahụ makai me obodo wepụtara kwuru na afọ ise agaghị ezuru gị dịka onye mbịarambịa n'UK inweta ikike obibi.

Iwu ọhụrụ a kwuru na tupu I tozuo inweta ikike ibi n amba UK, gọọmenti ga-elekwasị anya n'ọrụ ị na-arụ, ego ole ị na-akpata nakwa akparama agwa gị.

Ndị na-akpata nnukwu ego nwereike nweta ikike obibi ahụ mgbe afọ atọ gachara.

Ndị dọkịta, ndị nọọsụ, ndị nkuzi, na ndị ọzọ na-akpata ihe karịrị paụnd puku iri ise kwa afọ, nwereike itozu inweta ya bụ ikike obibi mgbe afọ ise gachara ebe ndị ọzọ ga-eche ihe ruru afọ iri.

Ndị mebiri maọbụ metọọ iwu immigration, ga-eche ruo afọ iri abụọ maọbụ karịa makai kike ahụ.

Praịm mịnịsta Andy Burham, kwuru na ebumnobi iwu ọhụrụ a bụ iji mee ka e nwee ezi udo na ọganihu obodo mba UK.

Tupu mmadụ enweta ikike obibi na-adịgide adịgide nke a kpọọrọ permanent residency n'olu Bekee, ọ ga-abụ onye na-enweghị akụkọ mpụ, na-asụ Bekee nke ọma, ma na-akwụ ụtụisi dịka iwu siri kwuo.

Atụmatụ ọhụrụ a metụtakwara ndị gbara ọsọ ndụ a kpọrọ refugees na Bekee.

Ndị batara n'ụzọ gọọmenti kwadoro nwereike inweta ikike obibi mgbe afọ ise gachara.

Mana ndị ji ụzọ iwu megidere gụnyere iji ụgbọmmiri bata, nwereike ichere ruo afọ iri atọ maọbụ karịa.

Gọọmenti UK kwuru na a gaghị achụpụ onye ọbụla n'ihi mgbanwe ndị a, mana ọtụtụ ndị mbịarambịa ga-eche ogologo oge tupu ha enweta ikike ibi na Britain.