Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Luis Enrique na-eru ụjụ maka ọnwụ ada ya
Obi mgbawa na arịrị juru onye bụbu onye nchịtọka otu egwu bọọlụ mba Spen bụ Luis Enrique obi ugbua.
Nke a bụ dịka ọ na-eru ụjụ maka ọnwụ nwa ya nwaanyị bụ Xana onye nwụrụ site n'ọrịa kansa ka ọ gbachara afọ itoolu.
Enrique bụ onye wepụtara ozi maka ọnwụ nwa ya na Twitter na mgbede Tọzde dịka ọ na-ekele ndị ụlọọgwụ nyere aka lekọta nwa n'ọnwa ise ikpeazụ ya.
O kwuru na nwata ahụ ga-abụ "kpakpando ga-ana atụziri ezinaụlọ anyị."
Enrique kelekwara ndị mmadụ maka nkwado ha.
Ka ọdị ugbua, otu dị icheiche etiela Enrique aka n'obi maka ọdachi a dakwasara ezinaụlọ ya.
Ha gụnyere UEfa, Manchester United, Laliga wdg.