Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Igbo bụ Igbo ụnụ asaala chie! Ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala, ma azụ anwụla.

  2. Ka chi fo!

    I mere nke ọma wee nọnyere anyị taa.

    Chọtakwa anyị n'ụtụtụ ka anyị wetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị.

  3. Oha na eze na ndị na-azọ ọkwa onyeisi Ohaneze ga-enwe nzukọ

    Njirimara Ohaneze

    Otu Igbo dị iche iche ga-agbakọ ụbọchịụka maka nzuko ọha na ndị na-azọ ọkwa onyeisi otu Ohaneze Ndigbo.

    Dịka ndị na-ahazị ọgbakọ ahụ si kwuo, ọgbakọ ahụ nke a ga-eme n'elekere anọ nke ehihie n'igwe okwu 'Zoom' bụ oge mmadụ anọ ndị na-azọ ọkwa ahụ nke bụ oke Imo steeti ga-agwa ndị mmadụ okwu maka ebunobi ha.

    Ndị a gụnyere Chidi Osuagwu, Joe Nwaorgu, Chris Asoluka, Goddy Uwazurike na George Obiozor.

    N'ọnwa Jenụwary afọ 2021 ka a ga-enwe ntuliaka otu ahụ jikọrọ ndị Igbosi na steeti asaa ebe a na-asụ Igbo ;Abia, Anambara, Delta(Anioma), Ebonyi, Enugu, Imo na Rivers(Ikwerre).

  4. Gere akụkọ gbasara coronavirus dịka ọ dị n’Afrịka taa

  5. 'Ọnụọgụgụ ndị Naijirịa eruola ihe dịka mmadụ 206,000,000' - NPC

    National Population Commission

    Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ mmadụ na Naịjiria bụ Nigerian Population Commission bụ NPC n’ịchafụ ekwuola na ọnụọgụgụ ụmụ Naịjiria esila n’otu nde narị na iri itoolu na asatọ ruo nde narị abụọ na isii ugbua.

    Onyeisi ngalaba a bụ Nasir Kwarra kwuru n'ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ n'Abuja n'ụbọchị Tuzde kwuru na dịka Naijirịa agụbeghị ndị Naijirịa n'isi n'isi kamgbe afọ iri na anọ, na ọ ga-esi ike ịmata ọnụ ọgụgụ mmadụ ole kpọmkwem.

    O kwuru sị, "Ọ bụ onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ga-ekwu mgbe ọzọ a ga-eme ọnụọgụgu mmadụ na Naijirịa".

  6. Gọọmentị amịpụla naịra ise n'ego mmanụ ụgbọala

    Onye na-ere mmanụ agbidi

    Gọọmentị Naịjirịa amịpụla naịra ise n'elu N168 a na-akwụbu maka mmanụ ụgbọala.

    Ha kwuru na site n'ụbọchị 14 nke Disemba gawa n'ihu, na a ga na-akwụzị N162.44 n'elu otu lita mmanụ ụgbọala.

    Mkpebi a bịara ka gọọmentị etiti na ndị ọrụ mechara nzukọ nke bidoro n'elekere itoolu nke abalị Mọnde ruo elekere otu nke isi ụtụtụ Tuzde.

  7. Nwaanyị dị afọ 91 abụrụla onye mbụ natara ọgwụ mgbochi coronavirus n'ụwa

    Margaret Keenan

    Otu nwaanyị gbara afọ iri itoolu abụrụla onye mbụ a gbara ọgwụ mgbochi maka Coronavirus na mba Briten.

    Margaret Keenan, si n'obodo Enniskillen, natara ọgwụ mgbochi ya n'ụlọogwụ dị na Mahadum Coventry, n'ụbọchị Tuzde.

    Ọ pụtara na mba ahụ amalitela iji ọgwụ mgbochi nke ụlọorụ Pfizer na BioNTech egbochi ọrịa ahụ.

  8. Otu SERAP akwadowela ịkpụpụ onyeisiala na ndị gọvanọ ụlọikpe

    Otu na-ahụ maka ikike ruru mmadụ akpọrọ SERAP n’ịchafụ ekwuola na ha na-akwado ịkpụpụ onyeisiala nakwa gọvanọ steeti niile dị na Naịjirịa ụlọikpe.

    Iwe ha bụ na atụmatụ nke ewepụtara iji gbazite ego n’ime ụgwọ ezumike ndị mmadụ abụghị nke iwu kwadoro nke mere na ha chọrọ ịkwụsị ya.

    Ha kpọrọ oku ka ndị ọzọ chọrọ ịsonye na ya bụ akwụkwọ ha na-akwado ịgba n'izuụka abụọ zitere ha ozi

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  9. Unu abọọla chi?

    Nnọọnụ na peeji anyị taa.

    Ihe niile dị mkpa mere na Naịjirịa ka unu ga-achọta ebe a.

    Udo!

  10. A ga-anwuchi onye ọbụla na-anakọ ego n'ụzọ Anambra steeti.

    Aka onye nọ nga

    Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha ga-anwuchi onye ọbụla ejidere na-anara ndị na-eme njem ego n'ụzọ na steeti ahụ.

    Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke kọmịshọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Don Adinuba ka ha kwuru nke a.

    Ha kọwara enwetela akụkọ na e nwere ndị na-anakọ ndị na-eme njem na steeti ahụ ego.

    Ebe ndị a gụnyere Onịcha, Obosi,Nnewi, Amasea, Ogidi, Nkpọ dgz.

    Gọọmwentị steeti a kwuru na omume ndị omekome a megidere iwu steeti ahụ ma kọwaa kwa na ego ndị a na-anata anaghị erute gọọmentị steeti ahụ aka.

    Akwụkwọ ozi ha kwuru ka ndị madụ mee mkpesa mgbe ọbụla ha hụru onye dị etu a na-anakọ ego n'ụzọ.

    Ha kwuru na ọ bụ iwu na ọdịmma ka e ji achị Anambra steeti ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha hụ na ehiwere ma mezuo iwu a.

  11. Gọvanọ Benue Steeti ekpeziela onye ntaakụkọ Channels na nwunye ya

    Jimin Geoffrey

    Gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Orthom ekpeziela onye ntaakụkọ Channels bụ Pius Angbo na nwunye ya bụ Dọkinta Ifeyinwa Angbo.

    Cheta na Ifeyinwa Angbo mere ihe onyonyo ebe o gosiri ihu ya dịka dị ya bụ Pius Angbo tiri ya ihe.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Jimin Geoffrey

    Kama Mazị Angbo arịọla nwunye ya na ụmụnwaanyị niile mgbaghara ma kwuo na ọ gaghị akpa ụdịrị agwa ahụ ọzọ.

    Jimin Geoffrey
  12. Coronavirus Minutes

  13. Ụgbọoloko ebidola ime njem site Oyo Steeti gawa Legọs steeti.

    Ụgbọ oloko

    Gọọmentị Naijirịa ekwuola na ụgbọ oloko ebidola ime njem site Ibadan dị n'ọyọ steeti gawa Legọs steeti taa bụ ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba afọ 2020.

    Ụgbọoloko a nke na-agba kilomita iri atọ maọbụ anọ kwa awa ga-eji ihe dịka otu awa na ụma iri anọ eme ya bụ njem.

    Ya bụ ụgbọ hapụrụ Ibadan n'elekere asatọ nke ụtụtụ ma rute Abeokuta n'elekere asatọ na ụma iri ise na asatọ ma hapụ Abeokuta were rute Legọs, Ebutte Metta n'elekere iri na ụma anọ nke ụtụtụ.

    Dịka onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala Naijirịa aha ya bụ Tolu Ogunlesi depụtara n'akara Twitter ya were kọwa na ọsọ ya bụ ụgbọoloko na-agba ga-agbalite mgbe ha rụchara ihe ha kwesịrị ịrụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Channels TV ekwuola na ha ga-enyocha onye ọrụ ha eboro ebubo mwakpo nwunye ya

    Ụlọ ntaakụkọ Channels TV ekwuola na ha na-enyocha ebubo eboro otu onye ọrụ ha na o tiri nwunye ya ihe.

    Nke a pụtara ihe dịka nwunye nwoke ahụ depụtara na soshal midia ma gosi foto ebe o merụrụ ahụ na-ekwu na di ya tiri ya ihe.

    Nwaanyị ahụ sị na aha ya bụ Ifeyinwa Angbo kpọrọ di ya aha ma kwuo na o tobeghi aka ọ mụchara nwa nke anọ ha tupu nwoke a etie ya ihe.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na ha ga-ata nwoke ahụ ahụhụ maọbụrụ na ikpe mara ya.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Igbo enweela ọgbakọ n'Enugwu

    Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si ala Igbo enweela nzụkọ nke ukwu a kpọro 'Ime Obi Ohaneze NdịIgbo'.

    Ogbakọ ahụ bụ nke e mere na Nike Lake dị n'Enuwgu.

    Ndị bịara n'ọgbakọ ahụ gụnyere Ike Ekweremadu, Hope Uzodimma, Nnia Nwodo, Peter Obi, Uche Ogah, Chris Ngige, Rochas Okorocha na ndị ọzọ.

    Dịka aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma si kwuo, ihe bụ isi okwu na ya bụ nzụkọ bụ mmekọrịta n'etiti ndị Igbo na mpaghara ndị ọzọ maka ọdịmma ndị Igbo na Naịjirịa.

    Igbo summit
    Igbo Summit 5
    Igbo Summit 6
  16. Ndị oso chi egbu chọrọ imechu INEC ihu na ntuliaka a - Festus Okoye

    Festus Okoye

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec ekwuola na ụfọdụ ndị oso chi egbu chọrọ imebi mbọ niile ha gbara na mmeju ntuliaka a e mere n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba.

    N'ozi onye kọmishọna ụlọọrụ a na-ahụ maka mgbasaozi bụ Festus Okoye wepụtara, ọ sị n'agbanyeghi na ntuliaka a gara nke ọma mana ụfọdụ ndị chọrọ imebi usoro a.

    Okoye sị na a wakporo ụfọdụ ndị ọrụ ha n'oge ntuliaka ahụ.

    "N'ụfọdụ ebe, a wakporo ndị ọrụ anyị ma mebisie ngwa ọrụ ha, ụfọdụ ndị mmadụ jụrụ ka e were igwe kaadị 'reader' nyocha a ha.

    "N'ebe ọzọ, ndị ekperima ekweghi ndị ọrụ Inec malite ọrụ ha, ndị a siri ọnwụ ka ndị ọrụ Inec kwụọ ha ụgwọ tupu ha amalite ọrụ.

    "Ụdị agwa ndị a na-emebi aha obodo a ma na-egbukwa mmụọ ndị ọrụ anyị ji arụ ọrụ," dịka n'akwụkwọ ozi Okoye wepụtara.

    Okoye sị na ọ bụ n'ihi nke a mere na-akpọpụtabeghi mpụtara ntuliaka nke mpaghara Bakura dị na Zamfara Steetị.

    Ọ sị na ha mere ọgbakọ na Sọnde ma kpebie na ntuliaka ga-adị na Wenesde ụbọchị 9 nke ọnwa Disemba 2020.

    Okoye gara n'ihu kwuo na e mechaala ntuliaka na mpaghara ndị ọzọ ma kpọpụta mpụtara ha.

  17. Igbo ndị ọma anyị ekele ooo

    Ọ bụ obiọma ka anyị ji anabata unu n'ụbochị taa.

  18. Tottenham vs Arsenal: Tottenham echiela Arsenal ọnụ na 'korota' ụzọ Nsukka.

    Ndị otu Arsenal

    Tottenham egosila ndị otu Arsenal na nwoke na nwoke ibe ya ha bụ n'ọnụ.

    Ọ bụ dịka ha zutere onwe ha taa n'asọmpị Premier League ka ikuku kuru were gosi ụwa niile otule Arsenal.

    Ọ bụ na nkeji nke iri na atọ ka Son Heung-Min nke Tottenham gbanyere goolu n'elu aka ekpe ọnụ postu ndị Arsenal.

    Ndị otu Tottenham

    Goolu Son nyere dịka ọ kpalitere mụọ ndị otu ya.

    Ebe mbọ niile Arsenal gbara ịsa ya bu goolu lara n'efu.

    Dịka ọ nọ na nkeji iri anọ na ise kpọmkwem ka Giovani Lo Celso wetere bọọlụ, gbapụ ya ọso were nye Son Heung-Min onye nyere ya Harry Kane.

    Harry Kane chiri onwe ya eze dịka ọ gbakara netị ndị Arsenal were mee ya goolu abụọ tupou egbochie agba nke mbụ.

    Harry Kane ka ọ na-enye goolu abụọ

    Mbọ niile Arsenal nyere ịsa goolu abụọ gbara ọnyụpa dịka ndị Tottenham jiri ya mee ha oji n'ụlo ha.

  19. Gọvanọ Abia steeti akwụsịla onyeisi ndị ọrụ ya ọrụ

    Dr. ACB Agbazuere na Odumeje

    Akwụkwọ ozi gọọmentị Abia steeti depụtara na-ekwu na Gọvanọ Steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu enyela ikike ka achụọ onyeisi ndị ọrụ nke Gọvanọ steeti ahụ bụ Dr. ACB Agbazuere n'ọrụ.

    Ọ bụ onye ode akwụkwọ steeti ahụ bụ Chris Nzem depụtara ya bụ ozi were sị na ọ bụ onye ode akwụkwọ nke obi gọọmentị steeti ahụ bụ Alozie Odoemelam ga na-arụ ọrụ onyeisi ode akwụkwọ dịka o siri dị.

    Akwụkwọ ozi ha ekwughị ihe mere ha jiri chụọ ya n'ọrụ.

    Ọ bụ n'ụbọchi ole gara aga ka ewepụtara ihe onyonyo gosiri ebe Dr. ACB Agbazuere na-abọ onye ụkọ chukwu eji Odumeje mara ego n'ụlọ ọrụ ya.

    Lee ihe onyonyo ahụ ebe a.

  20. NHS ga-amalite inye ndị Briten ọgwụ mgbochi na Tuzde

    Njụoyi ebe a na-etinye ọgwụ mgbochi karịrị puku 80 na UK
    Nkọwa foto, Njụoyi ebe a na-etinye ọgwụ mgbochi karịrị puku 80 na UK

    Ngalaba National Health Service (NHS) nke mba Briten ga-amalite inye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi coronavirus n’ụbọchị Tuzde.

    Ha kwuru na ha ga-esi na ndị agadi gaferela afọ iri asatọ nakwa ndị na-elekọta ha n’ụlọ ebe a na-etinye ha, malite.