Atiku, Buhari na-atụ arịrị ọnwụ Domkat Bali, Mịnista nchekwa oge Buhari chiburu
Generalụ Dọmkat Bali bụ Mịnịsta Onyeisiala Muhammadu Buhari oge ọchịchị ya dịka onyeagha(1984 -1985), anwụọla.
Bali, onye Langtang dị na Plateau steeti, nwụrụ taa bụ Fraide ka ọ gbachara afọ 80.
Bali bụkwa Mịnịsta nchekwa n'ọge ọchchị Ịbrahim Babangida.
Tupu o tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka onye agha n'afọ 1990Ọ jiri ọtụtụ nnukwu ọkwa n'amịị gụnyere GOC nke First Infantry Division, Kaduna," Commandant" kọleji ndị agha "Nigerian Armed Forces Command and Staff College" malite n'afọ 1981 rue 1983.
Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ezinaụlọ Bali na steeti ya aka n'obi maka ọnwụ ya.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu binyere aka, Buhari kwuru na ike Bali kpara ndịka onye agha nakwa ịhụnanya o nwere na ANaijiria ga na-aga n'ihu ịkpalite ndị agha ndị ka na-etolite etolite.
N'ozi iti aka n'obi nke Atiku Abubakar zigara ezinaụlọ ya na Twitter, o kwuru na nnukwu onye agha kajara akaja furu Naijiria ma kpee ekpere ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
















