Nkeji Coronavirus
Gere akụkọ gbasara Coronavirus ka o si dị n'Afrịka taa.
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Gere akụkọ gbasara Coronavirus ka o si dị n'Afrịka taa.

Ebe foto si, Mbonu Watson
Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na akụkọ kwuru na e jidere otu ụkọchụkwu a hụrụ isi mmadụ n'aka ya n'ụmunze dị n'Anambara steeti abụchaghị eziokwu.
Ha kwuru na ya bụ onye a na-enyo enyo abụghị ụkọchụkwu nke e ji ahụ isi mmadụ n'aka ya.
Ndị ntorobia Umunze wakporo Rev Bishop Elijah Chukwuebuka nke ụlọụka, "God of Light Ministry' bụ ụkọchukwu na-ewu ewu na Umunze nke a ma ama maka ibu amụma na ịrụ ọrụ ebube, tie ya ihe ma kpụrụ ya ya na ngwogwo na ngwongwo ha hụrụ n'ogige ya kpụga be eze obodo ha maka ebubo ịhụ isi mmadụ n'aka ya.
Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na "Ndị ntorobịa hụrụ ya ka ọ na-agba aja. A hụrụ isi mmadụ, ọtụtụ ọkpụkpụ, foto ndị mmadụ e kere eke nakwa Akwụkwọ Nso e kere eke."
"Ihe a bụ ụkọchukwu a ma ama n'Ihite Umunze dịka onye amụma na-ahụ ụzọ."
Mana Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru ya bụ okwu metụtara "ebubo ịgwọ ọgwụ".
O sị na " ọ bụghị isi mmadụ ka a hụrụ n'aka ya, ọ bụ isi ewu nke e ji akwa mmemme kee."
Mohammed gara n'ihu kwuo na nwoke ahụ bụ dịbịa na-ezo onwe ya dịka ụkọchụkwụ nke ndị ntorobịa wakporo ma mebie okwu arụsị ya, kpụrụ ya gawa be Igwe ha ebe ha bụ ndị uweojii bịara gbapụtara ya.
Ka ọ dị ugbua, Igwe obodo ahụ enyela ya bụ nwoke iwu ka o si n'ala ha pụọ.

Ebe foto si, Hon Chiji Collins/Facebook
A chụtuola onyeisi ndị omeiwu Imo Steetị bụ Chiji Collins n'ọkwa ya.
Ọ bụ ndị omeiwu ibe ya chụpụrụ ya n'ụbọchị Fraịde 13 Nọvemba, 2020 dịka ha na-eme nzukọ n'ụlọomeiwu dị n'Owere.
Mgbe okwu i chutu ya dapụtara n'ụlọomeiwu, mmadụ 23 n'ime 27 kwadoro ka a chụọ ya.
Akụkọ sị na ha chụpụrụ Collins maka ebubo mpụ na mmebi ego, aka ike nakwa agwa ọjọọ na ihe ndị ọzọ.
N'ihi nchụpụ a, Paul Emeziem nke na-anọchiteanya okpuruọchịchị Onuimo ga-abụ onyeisi ndị omeiwu dịka ha họpụtara ya.
Mana ọnụ na-ekwuru Chiji Collins bụ Mike Ohaka sị na ọ bụghị eziokwu na a chụọla Collins.
Ọ sị na ndị omeiwu anaghị enwe nzukọ taa na ọ bụ n'izuụka na-abịa abịa.
Ohaka gara n'ihu kwuo na okwu banyere nke a ka na-aga n'ihu n'ụlọomeiwu.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọ ntaakụkọ Punch ekwuola na ụlọ ọrụ Petroluem Products Marketing Company (PPMC) bụ ngalaba na Nigerian National Petroleum Corporation ebuliela ego a na-ere mmanụ ụgbọala na depo ha site Naịra otu narị na iri anọ na ụma (N147.67) ruo Naira otu narị na iri ise na ise na ụma (N155.17).
Ha kwuru na ọ bụ n'akwụkwọ ozi maka nanị ndị ụlọọrụ PPMC nke Tijjani Ali binyere aka nke bu akara PPMC/C/MK/003 n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ka ya bụ ozi dị.
Ha kwuru na PPMC kwukwara na ego mmanụ ụgbọala n'ebe a na-ere ya na pụmpụ ga-abụ Naịra otu narị na iri isii na otu na ụma (N161.36).
Kama akụkọ ha kwukwara na onyeisi otu Indepndent Petroluem Marketers Association of Nigeria bụ Mike Osatuyi kwuru na ihe ọ pụtara bụ na ego mmanụ ụgbọala ga-agbago ruo ihe dịka N168 ruo N170.
Nkea na-eme dịka Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva kwuru na gọọmentị Naijirịa ewepụla aka kpamkpam n'ihe gbasara ịhazị ego mmanụ agbidi.

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ narị abụọ na iri na abụọ ọzọ ebutela ọrịa coronavirus na Naijirịa. Mmadụ iri abụọ na isii n'ime ha si Imo steeti ebe mmadụ itolu si Rivas steeti.
E nweghị onye nwụru ọhụru site na ya bụ ọrịa.
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị

Ebe foto si, Screengrab
Taa ka e duru Gọvanọ Godwin Obaseki n'iyi ọrụ ka ọ malite ọchịchị agba nke abụọ ya dị gọvanọ Edo steeti.
Mana dịka ya bụ emume na-aga n'ihu, ajụ buturu onye uweojii na-akwụ Obaseki n'azụ nke Bekee na-akpọ 'Aide de-camp' (ADC).
Ọ bụ oge Obaseki na-agụpụta ozi ekele ya ka onye uweojii ahụ malitere ịsọ ganịganị ma gharịpụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọ nso ebe ahụ gbataara ya ọsọ enyemaka ma were nwayọọ dọba ya ọdụ n'oche.
Dịka ụlọorụ ntaakụkọ Premium Times si kwuo, Patrick Okundia, onye bụbu Kọmishọna ahụike n'Edo steeti, bịakwara nyere nwoke ahụ aka tupu a kpọrọ ya gaa n'ụgbọala ahụike dị nso ebe ahụ.
Otu onye welitere isi na ndị uweojii Edo steeti mechara gwa ndị ntaakụkọ na nwoke ahụ adịla nnọọ mma.
Ọ kọwara na o nwere ike ịbụ ike ọgwụgwụ mere nwoke ahụ ji gharịpụ.

Ebe foto si, Tokemakinwa/Instagram
Ụlọikpe ukwu dị na Legọs asịla onye ọrụ mgbasaozi na Redio bụ Omotoke Makinwa ka ọ kwụọ onye bụbu di ya Maje Ayida otu nde naịra maka imetọ aha ya.
N'ụlọikpe a, ọkaikpe Olukayode Ogunjobi sị na Makinwa na onye bipụtaara ya akwụkwọ a kpọrọ "On Becoming" bụ ebe ọ metọrọ aha Ayida, ga-akwụ puku narị naịra ise n'otu n'otu.
Ọkaikpe a sị Makinwa na ụlọọrụ Kachifo kwụọ ego a n'aka ụlọọrụ na-enyere ndị mmadụ aka nke Ayida chọrọ.
O nyere ha otu ọnwa ịkwụ ụgwọ a malite ụbọchị o kpere ikpe a ma wepu ebe ahụ o metọrọ aha Ayida n'ime akwụkwọ "On Becoming".
Ọkaikpe sị na nke a nọ peegi 54, akara 11 ruo 16 nakwa peegi 83 akara 1 n'ime akwụkwọ a.
Mkpebi ikpe a na-abịa n'ime afọ atọ Ayida kpụpụchara Makinwa na ụlọọrụ Kachifo n'ụlọikpe.
Gere nkeji coronavirus nke BBC Igbo.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ egbuola Kingsley Obasi, bụ onye enyemaka osote onyeisi ndị omeiwu Ebonyi steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Loveth Odah gwara BBC na ya bụ ihe mere na mgbede abalị ụbọchị Wenezde.
Odah kwuru na ya bụ nwa amadi eruwela nso na be ya oge ụmụokorobịa abụọ nọ n'elu ọgbatumtum wakporo ya, nara ya akpa ya ma gbaa ya egbe.
Oge a kpọtụụrụ ndị uweojii nọ nso ebe ahụ, ha gbatara ma buru ya gawa ụlọọgwụ ụlọọgwụ 'Federal Teaching Hospital' dị n'Abakiliki, ebe dọkịta gwara ha na ọ nwụọla.
Onye uweojii ahụ kwuru na ụdị ihe a anaghị emekarị oge ọbụla n'ihi na Ebonyi steeti bụ ebe dara jụụ.
O kwukwara na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ enyela iwu ka amalite nnyocha miri emi iji chọta ma nwụchie ndị kpara ya bụ arụ.

Ebe foto si, Isiala Ngwa South LGA/Facebook
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na isiụlọọrụ okpuruọchịchị ime obodo Isiala Ngwa Saụt dị n'Omoba, Abia Steetị agbaala ọkụ.
Onye na-arụ ọrụ n'ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ọkụ a malitere n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọsde.
O kwuru na a mabeghị ihe kpatara ọkụ a ji malite n'isiụlọọrụ ahụ.
Mana gọọmentị Abia Steeti akatọọla ọkụ a gbara isiụlọọrụ a ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka e nyocha, nwuchie ma taa ndị kpara arụ a ahụhụ.
Nke a dị n'ozi odeakwụkwọ gọọmentị a bụ Chris Ezem wepụtara.

Ebe foto si, Isiala Ngwa South LGA/Facebook
Akụkọ gaara n'ihu kwuo na onyeisi ọrụ Gọvanọ Abia Steetị bụ ACB Agbazuoere abịala ebe ahụ ma hụ ka ọkụ a si gbaa na ihe ndị ọzọ o mebiri.
Agbazuere si n'okpuruọchịchị a ma bụrụkwa onyeisioche ya n'afọ ole na ole gara aga.

Ebe foto si, The Governor of Borno state/Facebook
Ndị agha Naijirịa na-ekwu na Abubakar Shekau,Maman Al-Barnawi bụ ndị isi otu oyiegwu na mmadụ iri asatọ na anọ ọzọ abụrụla ndị ha chọrọ ịnwuchi nke taa nke echi.
Ọ bụ gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum na onyeisi ndịagha Naijirịa bụ Tukur Buratai kpughere aha ndịa.

Ebe foto si, Governor Borno/Twitter
Ha mere nkea dịka ha na na-edu ndị agha nkiti bụ Civilian Joint Task Force n'iyi ọrụ.
N'aka nke ọzọ, onyeisi ode akwụkwọ mba Amerịka bụ Michael Pompeo ekelela mba dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ọkachasị Naijirịa maka nzụkọ ha nwere maka imeri otu oyi egwu bụ ISIS na mpaghara ọdịda anywanwụ Afrịka.

Ebe foto si, The Governor of Borno state/Facebook

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba NCDC edepụtala na mmadụ otu narị na iri asatọ ọzọ anwụọla site n'ọrịa coronavirus na Naijirịa.
Ọnụ ọgụgụ ha gosikwara na mmadụ narị anọ na anọ esila n'aka ya bụ rọia gbakee ebe mmadụ abụọ ọzọ anwụọla site na ya.
Ha gosiri na mmadụ anọ n'ime ha si Rivas steeti ebe abụọ sị Crossriver.
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Hie ma teta ụra nke ọma.

Ebe foto si, Ikedi Ohakim/Facebook
A kpụla aka chịbụrụ Imo steeti bụ Ikedi Ohakim Ụlọikpe Ukwu dị n' Abuja ụbọchị Wenezde maka ebubo ịnye ndị uweojii ozi asị megide otu nwaanyị a kpọrọ Chinyere Amuchienwa.
N'akwụkwọ ahụ nke ọ bụ onyeisi ndị uweojii Naijiria gbara, a na-ebo Ohakim ebubo ịghara ndị uweojii ụgha na Chinyere Amuchienwa ji egbe were maja ya.
E bokwara ya ebubo ikwu na ya nwere ala ya chọrọ ire na Legọs nke bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola nwe ya.
Mana Ohakim kwuru na aka ya dị ọcha n'ebubo ndị a.
Dịka ụlọakụkọ Nation siri kwuo, Ọkaiwu Ohakim bụ Ken Njemanze rịọrọ ka a tọhapụ Ohakim n'ogige ndị uweojii, ebe ọkaiwu wetara ikpe ahụ bụ Stanley Nwodo,jụrụ si na a hapụ Ohakim na ọ ga-enye dịka ndị uweojii kpọrọla ya oku ọtụtụ oge mana ọ zaghị ya.
Na mkpebi ya, ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Jọstịs Samira Bature gwara Ohakim ka ọ kwụọ nde naira iri ma kpọtakwa onye ga-ana ya n'akaebe ga-abụ onye nwere agba ma birikwa n'Abuja.
E higharịrị ikpe ahụ buga ya n'abalị 25 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Gere akụkọ banyere coronavirus n'Afrịka taa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị butere coronavirus n’Amerịka n’ụbọchị Tusde dị puku narị na puku iri atọ na otu bụ ọnụọgụgụ kachasị kwa ụbọchị.
Ọrị a gbukwara mmadụ ruru otu puku, narị atọ na iri anọ na asaa n’ime otu ụbọchị ahụ, nke kachasị kamgbe ọnwa Ọgọstụ.
Nke a mere ka ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa na mba Amerịka kamgbe ọ batara karịa nde iri na ụma abụọ, ebe ndị nwụrụla dị puku abụọ narị abụọ na puku iri atọ na itoolu, narị isii na iri asatọ na atọ.
Nke a dị n'ozi nyocha ngalaba ahụike mahadum John Hopkins wepụtara.

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akwadola otu ọkaiwu a kpọrọ Oladimeji Ekengba ka ọ kpụpụ onyeisiala Buhari n'ụlọikpe maka ọjụjụ ọ jụrụ idu ndị ọkaikpe mmadụ iri atọ na atọ n'iyi ọrụ na-agbanyeghi na ọ bụ otu jikọtara ndị ọkaiwu họpụtara ha.
Akwụkwọ ọkaiwu a gbara nke a kpọrọ 'order of mandamus' ga-amagide onyeisiala n'ike ka o duo ndị ọkaikpe a n'iyi dịka ndị otu NJC si họpụta ha.
Onyeisiala adịla na mbụ nye mmadụ iri na otu so ndị NJC họpụtara ọrụ ma hapụ mmadụ iri abụọ na otu ndị ọzọ.
N'ikpe ọ chabiri n'ụbọchị Wenesde, ọkaikpe Inyang Ekwo sị na ọkaiwu Ekengba wepụtara akwụkwọ zuru oke n'ihu ụlọikpe nke mere e ji nye ya ikike a.
Kama ọ sị na inye ya ọkaiwu a ikike ịgba onyeisiala akwụkwọ apụtaghị na o meriela n'ikpe ahụ.
Ndị ọ gbara akwụkwọ gụnyere Onyeisiala na ọkaiwu gọọmentị etiti.
Cheta na ọkaikpe Ekwo na Sepụtemba chabiri ikpe ọzọ na Onyeisiala ji dara iwu site n'iziga aha mmadụ iri na otu ahụ n'ụlọomeiwu maka nyocha.
Ọkaikpe a sị na ọ bụ naanị nhọpụta onyeisi ọkaikpe ka a na-enye ndị omeiwu ka ha nyochaa.

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba nchekwa Naijirịa bụ State Services akpọpụla Kabiru Mohammed ụlọikpe maka ebubo na ọ wepụrụ ihe onyonyo adigboroja gosiri agbamakwụkwọ onyeisiala Naijirịa na Sadiya Umar Farouq bụ mịnista na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa.
Ngalaba a nwuchiri kabiru kamgbe ọnwa Jenuarị kwukwara na Mohammed ejirila ọnụ ya kweta na ọ bụ ya wepụtara ihe onyonyo adigboroja ahụ.
Ụlọikpe nụrụ na ya bụ ihe onyonyo metọrọ ndị nọ na ya ma bute nsogbu n'etiti ha na ndị ezinụlọ ha.
Ngalaba a gwara ụlọikpe ka ha hapụ inye Kabiru ohere ịpụta n'aka ndị uweojii ka ha nwee ike mecha nyocha ha nke ọma .
Kama ụloikpe tọhapụru ya n'aka ndị uweojii dịka ọkaiwu ya kwuru na ihe ọ mere nyere ohere n'iwu ka atọhapụ ya n'aka ndị uweojii.
Eyiharịrị ya bụ ikpe n'ụbọchi ise nke ọnwa febụarị afọ 2021.