Ka chi foo nu
Daal dịka ị nọnyere anyị taa...ka ọ dị echi
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Daal dịka ị nọnyere anyị taa...ka ọ dị echi

Ebe foto si, NYSC Twitter
Adenike Adeyemi bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ngalaba na-ahụ maka ndị na-efe ala nna ha bụ Nigerian Youth Service Corps ekwuola na ha agaghị emechi ogige ọzụzụ NYSC ọbụla ha chọpụtara otu onye bu Coronavirus na ya.
O kwuru na ọ bụ dịka onyeisi ngalaba NCDC bụ Chikwe Ihekweazu kwuru nke a dịka ha mere nzụko n'ihe onyonyo maka ndị ntoroọbịa na-akwado ife ala nna ha.
O kwuru na ha dị njikere dịka NYSC na NCDC ga-etiko aka ọnụ hụ na enweghi onye ga-ebu ọrịa coronavirus ga-abata ogige ọzụzụ ahụ.

Aka chịburu Abia steeti bụ Theodore Orji ekwuola na Onyeisiala Muhammadu buhari kwesịrị ịkpọ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' ka ya na ha nwee ọgbakọ gbasara ihe bụ iwe ha na Naịjirịa.
Dịka ụlọntaakụkọ Punch si depụta, Orji kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Sọnde n'Abuja.
O kwuru na ihe ga-eme ka iwe dị ndị mmadụ n'obi dajụọ bụ ma ọ bụrụ na gọọmentị kpọọ ha ka a nọrọ ala kpazie ihe bụ iwe ha.
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na e nwere ndị iwe dị n'obi, onyeisiala kwesịrị ịkpọ ha ka ya na ha kpaa."
"O kwesịrị ịchọpụta ihe bụ iwe ha ma gbaa mbọ etu ọ ga-esi mezie ya."
"Ọ bụghị ihe ọjọọ ma onyeisiala kpọọ ndị Ipob ka ha nwee ọgbakọ. Ọ bụrụ na ọ kpọghị ha, ha ga-aga n'ihu na-awa ya isi."
"Obi adịghị anyị (ndị Igbo) mma na mpaghara ndị ọzọ nwechara steeti isii, anyị enwee naanị ise. O gosiri na a na-emegbu anyị emegbu. Ọ bụ ya na-akpata esemokwu na-adapụta na mpaghara anyị."

Ebe foto si, Reuters
Eze Obi Chukwuka nke mbụ bụ eze obodo Ute-Okpu nke dị n'okpuru ọchịchị Ika North East nke Delta steeti ekwuola na ọ bụ ọrịa ịba ọchananya, nke Bekee kpọrọ 'Yellow Fever', gburu ihe ruru mmadụ iri na ise n'obodo ya.
Chukwuka kwuru na ndị a nwụrụ n'ime ụbọchi abụọ ma gosikwa njirimara ọrịa ahụ nke gụnyere ọgbụgbọ tupu ha anwụọ
O kwuru na gọọmentị ga-ezitere ha ọgwụ mgbochi a n'ụbọchị Tuzde.
O kwukwara na ha na-ebuga ndị butere ya bu ọrịa n'ụloọgwụ dị n'Agbọ maọbụ ụloọgwu gọọmentị etiti nke dị n'Asaba.
BBC Igbo kpọtụụrụ kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Delta steeti bụ Ononye Mordi ka o tinye ọnụ na ya bụ okwu.
Moord kwuru sị " Eee ọ bụ ọrịa yellow Fever gburu ihe dịka mmadụ iri atọ n'ụfọdụ obodo na Delta steeti"
O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Oktoba ka ha nwetara mkpesa maka ya bụ ọrịa.
Mordi kwukwara na gọọmentị Delta steeti ga-agba ọgwụ mgbochi ọrịa a n'ebe ọ dị ukwu na anaghị ndị mmadụ ego ọbụla.

Ebe foto si, Imo State New Media
Ndị Gọvanọ ọwụwa anywanụ Naịjirịa, onyeisi ndị uweojii bụ Muhammad Adamu na ndị ọzọ ónú na-eru n'okwu na Naíjiría enweela nzụkọ gbasara ọdịmma ndị Igbo niile.
Onyeisi ndị ọrụ onyeisiala bụ Ibrahim Gambari nọchịrị anya onyeisiala sokwa na ndị gara nzụkọ ahụ.
Na nzụkọ ahụ nke ha nwere n’obi gọọmentị n’Enugwu, ha kpọrọ oku ka ewepụta atụmatụ ga-ekpochapụ ndị omekome na ndị Fulani bu egbe ejegharị n’ala Igbo niile.
Ha kelekwara onyeisiala maka ọrụ na-aga n'ihu n'akwammiri Niger nke abụọ, ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dí n'Enugwu, okporoụzọ awarawara si Enugwu gawa Porthacourt nakwa ọrụ ndị ọzọ na-aga n'ihu na mpaghara Ọwụwa Anywanwụ.
Otụ ụgbọala tanka adachiela ụzọ n'akwa mmiri Festac.
Ndị ọrụ nchekwa ụzọ ekwuola na otu tanka bụ mmanụ ụgbọala adachiela ụzọ na Festac.
Ha kwuru na ha agbachiela ụzọ ebe ahụ ma nye ndị mmadụ ndụmọdụ ịkee nkwụcha.
N'ozi ahụ ha kwukwara na agwaala ndị ọrụ mmenyụọkụ na ndị ọrụ gbatagbata maka ọnọdụ ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onye meriri ntụliaka ọkwa onyeisiala na mba Amerịka?
Asịsa ya na akụkọ ndị ọzọ dị mkpa ka anyị nwere ịwetara unu taa.
Jisinu ike.
Ka chi foo

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu Chelsea ezila na ebe onye bi ka ọ na-awachiri dịka ha ji ọkpụ goolu anọ asatara nanị otu were mee ndị otu Sheffield United ọbia na be ha.
Ọ bụ na nkeji itolu ka ndị otu Sheffield gbalịrị nye otu goolu nke mere ka ndị mmadụ chee na ndị Chelsea alaala na mgbuka.
Ọ bụ David McGoldrick nyere ya bu goolu dịka a gbara kọna nke oji ụkwụ ya gbakaa neti ndị otu Chelsea.

Ebe foto si, Reuters
Na nkeji iri abụọ na ato ka Chelsea sara ya bu goolu site n'aka Tammy Abraham.

Ebe foto si, Getty Images
Na nkeji iri atọ na anọ ka ndị chelsea gbara kọna nke Ben Chilwel were ohere onye na-agba azụ ndị Sheffield bụ Max Lowe nyere were nye goolu nke abụọ.

Ebe foto si, Getty Images
N'agba nke abụọ na keji iri asaa na saa ka Thiago Silva mezuru ya atọ.

Ebe foto si, Getty Images
Max Lowe mekwara nghọtahe ọzọ nke nyere Timo Werner ohere ịnye goolu nke anọ na nkeji iri asatọ na ya bu asompi.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images
Manchester United ejirila ọkpụ goolu atọ asatra otu merie ndị otu Everton n'asọmpị Premier League n'ụbọchị Satụde.
Ya bụ asọmpị bidoro nke ọma dịka Bernard nke Everton nyere goolu mbụ na nkeji iri na itolu ya bụ asompi bidoro.

Ebe foto si, Getty Images
Kama na nkeji iri abụọ na ise ka Bruno Fernades ji isi takaa netị ndị Everton nke mere ka ha jiri ọtụ goolu otu goolu.

Ebe foto si, Getty Images
Fernandes gosiri na ọ naghị achị dịka ọ chọkwara iji Freekick nye golu ọzo kama ochee bọolụ ndị Everton fooro ntụntu taa na ya bụ bọọlụ agaghị abanye na neeti ha.
Mbọ Bruno Fernandes mụtara mkpụru dịka o nyere goolu ọzọ na nkeji iri atọ na abụọ nke mere ka manunited jiri otu goolu karịa ndị Everton.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ fọrọ nkeji ole na ole ga-egbuchie ya bụ asọmpị ka Edinson Cavani onye ewebatara n'agba nke abụọ gosiri na agadi nwanyị anaghị aka nka n'egwu ọ maara agba dịka ọ nyere goolu mbụ ya kamgbe o bidoro ị gbara ndị Manunited,
Nke a mere ka ọ bụrụ goolu atọ ka manunited jiri si ndị Everton...Ka ọ dị mbọsị ọzọ.

Ebe foto si, Science Photo Library
Gọọmentị Enugwu steeti ekwuola na ọrịa ahụ gbara ndị mmadụ gharị nke na-egbu ndị mmadụ nsonso a na steeti ahụ bụ ọrịa Yellow Fever.
Ya bụ ọrịa wakporo obodo Ette Uno na Umuopu nke dị n'okpuru ọchịchị Igbo-Eze North na steeti ahụ.
Ọ bụ kọmịshọna ahụike steeti ahụ bụ Emmanuel Ikechukwu Obi kwuru nkea n'akwụkwo ọ depụtara.
O kwuru na Yellow Fever abụghị ọrịa ọhụrụ ma kọwaa na njirimara ya bụ ọrịa gụnyere anya ịcha mmemme na ahụọkụ.
Obị kwuru na ngalaba gọọmentị Enugwu steeti na-ahụ maka ọrịa na ngalaba Nigerian Centre for Disease Control na ngalaba ndị ọzọ enweela nzụkọ n'ụtụtụ Satụde n'elekere iri iji mara ụzọ ha ga-esi chụọ ya bụ ọria ọsọ kpamkpam n'okpuru ọchịchi Igboeze.
Ọ mara ọkwa ka mmadụ niile rubere iwu ịdị ọchọa nke so ọrịa coronavirus ma tinye kwa neti iji gbochie anwụnta ịbata n'ụlo.
O kwukwara ka ndị mmadụ debe mbara ha ọcha, kpochapụ akwa mmiri ha, ma na-eyi kwa uwe na-egbochi anwụnta ịta mmadụ.
Obị kwukwara na onye ọbụla hụtara njirimara ya bụ ọrịa n'ahụ ya maọbụ n'ahụ onye ọzọ, ka ha were ọsọ gaa n'ụlọọgwụ.
Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu akwaala arịrị n'akara Twitter ya maka ọnọdụ okporoụzọ gọọmentị etiti dị n'Abia steeti.
O kwuru na o nwere ọtụtụ ụzọ dị na steeti ahụ bụ nke gọọmentị etiti mana n'ihi ọnọdụ ha, ndị Abia steeti ji ya eme njem azụ ahịa na-ata ahụhụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụzọ ndị ọ metụtara gụnyere pkporouzo Aba - PH, Aba - Ikot Ekpene, Umahia - Ikot Ekpene, Umahia-Ohafia-Arochukwu.

Ebe foto si, Ngozi Okonjo-Iweala
Onyeisi nzụkọ na-ahụ maka nhopụta onyeisi otu ' World Trade Organisation' ekwuola na ha ebugharịala ụbọchi e kwesiri ịhọpụta onyeisi ngalaba ahụ nke Ngozi Okonjo-Iweala nke Naijirịa na Yoo Myung-Hee nke mba Saụt Kọrịa na-azọ.
E kwesịrị ịme ya bụ nhọputa n'abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 kama e higharịrị ya mana ha ekwughi ụbọchi ọzọ a ga-eme ya bụ nhọpụta.
Ha kwuru na e tinyebeghị ụbọchi ọzọ maka ya bụ nhọpụta ma sịkwa na ọ bu maka etu ọnọdụ ihe siri dị na etu ahụike mba ụwa dị mere ha ji higharịa ya bụ nhọpụta.
Ọ bụ naanị mba Amerịka kwadoro Mung-Hee ebe mba ndị ọzọ kwadoro Okonjo-Iweala.
Ọ bụkwa ọnodu a mere ka ehiyarịa ya bụ nhopụta.

Ebe foto si, Daily Trust
Dahiru Buba, nwoke ahụ ji ụkwụ si Gombe gaa Abuja iji ṅụrịa maka mmeri onyeisiala Muhammadu Buhari n'afọ 2015, na-arịọzi enyemaka ugbua dịka ụkwụ mgbu ekweghị ya ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.
Dịka ụlọntaakụkọ Daily Trust si depụta, nwoke a na-ebegara gọvanọ Gombe steeti akwa maka enyemaka.
Nwoke a kwuru na naanị ihe o ritere kamgbe ọ gara ije ahụ tụrụ Naịjirịa niile n'anya bụ naanị asambodo.
O were Buba abalị iri na ise iji si Gombe bịaruo Abuja n'oge ahụ, mana ugbua, agwọ na ihe o loro atọgbọrọla.
O kwuru sị: “Kamgbe m gachara ije ahụ, ụkwụ mgbu a na-akawanye njọ kwa ụbọchị."
"Ana m arịọ gọvanọ m bụ Inuwa Yahaya nke Gombe Steeti nakwa ndị isi pati anyị ka ha gbatara m ọsọ enyemaka ka m wee nwee ike inweta ezigbo ọgwụgwọ."
Buba gara n'ihu kwuo na ahụ ụfụ akarịala ya ahụ n'ihi ụdị ụfụ njikọ ọkpụkpụ ya na-afụ ya.
Nke ka njọ bụ na o nwezighị ike ịkwụnwu ụgwọ akwụkwọ ụmụ ya.

Ebe foto si, Ifeanyi Ararume/ Frank Ibezim
Ụlọikpe akagbuola mmeri Frank Ibezim merịri na ntuliaka imeụlọ otu APC ma nye Ifeanyị Ararume ikike ịnọchite pati ahụ na ntuilaka maka ọkwa onye na-anọchite mpaghara Imo-North n' Ụlọomeiwu Ukwu.
Ọkwa ahụ ghere oghe kemgbe Senetọ Benjamin Uwajumogu bụ onye nọbu n'ọkwa ahụ nwụrụ n'afọ 2019.
Jọstịs Garba Ringim, onye nyere mkpebi ahụ ụbọchị Fraide kwuru Ibezi esonyeghị na ntuliaka otu APC mere n'abalị atọ nke ọnwa Septemba afọ 2020 dịka kọmiti nyochara ndị tinyere akwụkwọ ịzọ ọkwa ahụ gụpụrụ Ibezim na mmadụ ise ndị ọzọ sị na ha etozughị.
Ringim ,onye kwupụtara na ọkwa onye ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka ahụ bụ nke Ararume, gara n'ihu nye Inec iwu ka ha were aha Ararume tichie nke Ibezim ozigbo.

Ebe foto si, Facebook/FRSC
Samuel Akinfolarin, bụ onye omeiwu nta ma bụrụkwa onyeisi ngalaba omeiwu na-ahụ maka ndị ọrụ okporoụzọ bụ Federal Road Safety Corps (FRSC), ekwuola na onweghị mgbe o ji kwuo ka e nye ndị ọrụ FRSC egbe ka ha were na-echekwa onwe ha.
Akinfolarin gwara BBC Igbo na ihe ọ rụtụru aka bụ na iwu hiwere ndị ọrụ nchekwa n'afọ 2007 nyere ha ikike iji egbe chekwa onwe ha.
O kwukwara sị "Dịka ngaghariiwe End SARS na-ewu, o nweghị onye isi dị mma ga-ebido ikwu okwu maka inye ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ egbe".

Ebe foto si, Nassnig.org
Akinfolarin kwuru na ndị nzụkọ ụlọomeiwu na ndị otu FRSC nwere nzụko ebe ndị FRSC kwuru na ndị mmadụ na-awakpo ndị otu ha ọtụtụ oge n'ụzọ ebe ha na-arụ ọrụ ha.
O kwuru na a ga-enwe nzụko n'etiti ndị omeiwu, ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ na ngalaba ndị ọzọ okwu nchekwa ndị ọrụ FRSC metụtara ka ha mara etu ha ga-esi chekwa ha mgbe ha na-arụ ọrụ ha.
Nke a na-eme dịka ndị mmadụ na-egosipụta iwe ha dịka akụkọ pụtara n'ụfọdụ akwụkwọ mgbasa ozi na-ekwu na ndị ọrụ FRSC ga-ebido buwe egbe.

Ebe foto si, Facebook/FRSC
N'aka nke ọzọ, ndị ọrụ FRSC nke onye kwuchitere ha bụ Bisi Kazeem kwuru na ọ bụ nghọtahie.
Kazeem kọwara na Akinfolarin kwuru sị "Ọ bụrụ na ndị FRSC na-ebu egbe, mwakpo a na-awakpo ha agaghị adị nke ukwu".
Kazeem kwuru na ndị otu FRSC ga-eme ihe ọbụla gọọmentị si ha mee ma kwukwaa sị: "Anyị kpọtụrụ ndi ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ha na-agbatara anyị ọsọ enyemaka ndi dịka ndị uweojii, ndị 'Civil Defense' maọbụ ụfọdu mgbe ndịagha".
O kwuru na e nwere ọtụtu ihe ha ga-etinye uche ma ọ bụru na a chọrọ inye ha egbe, nke gụnyere iwepụta ego maka ya, ikuziri ha maka egbe na ihe ndị ọzọ.
Kazeem kwuru na onweghị mgbe onye omeiwu jiri kwuo ka ndị FRSC buwe egbe kama ọ rụtụru aka na e nwere iwu nke nyere ndị ọrụ ha ikike ibu egbe maka nchekwa ha.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal Midịa
N'aka nke ọzọ ọtụtu ndi Naijirịa apụtala katọọ atụmatụ ọbụla nke ga-enye ndị ọru nchekwa okporoụzọ ikike ibu egbe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

Ebe foto si, @NGRPresidency
Ọkaikpe Kachasị nke Naijiria bụ Jọstịs Tanko Mohammed eduola ndị ọkaikpe Ụlọikpe Kachasị mmadụ asatọ iyi ọrụ taa bụ abalị isii nke ọnwa Novemba, afọ 2020.
Nke a welitere ọnụọgụgụ ndị ọkaikpe nke Ụlọikpe Kachasị site na iri na abụọ ha dịbu ruo iri abụọ.
Ndị e duru na ya bụ iyi ọrụ gụnyere Emmanuel Agim, onye 'South-South', Samuel Oseji, onye 'South-South',Helen Ogunwumiju, onye 'South-West' na Tijani Abubakar, onye 'North- East'.
Ndị ọzọ bụ Abdu Aboki, onye 'North West', M. M. Saulawa, onye 'North West' na Adamu Jauro, onye 'North East'.
Ha ṅụrụ iyi ịkwado Iwu ala Naijiria.
Onyeisiala Mohammadu Buhari agaghịkwa aga ụlọọgwụ na mba ofesị ọzọ ma eme uche ndị ụlọomeiwu sineti.
Onye nkwuru nke a bụ Sinatọ Danjuma La'ah mgbe ndị ọrụ ụlọọgwụ dị n'obi onyeisiala bịara ịkọwa maka ego ha tinyere na bọjet nke afọ 2021.
Ndị ụlọọgwụ ahụ wetere ego dị ijere Naịra iri na itoolu (N19Bn) nke otu ijeri na ụma atọ (N1.3bn) n'ime ya bụ maka idozi ụlọọgwụ ahụ.
Ndị omeiwu ahụ gwara ha na ha ga-anabata ya bụ ọkpụrụkpụ ego mana ha kee nkwụcha ịrụ ọrụ ya na ya so.
H akwuru na ha agaghị akwụfucha ụdị ụgwọ ahụ ma hapụ ka onyeisiala na-aga ụlọọgwụ na mba ofesi.

Ebe foto si, Bayo Omoboriowo