A chọrọ m ikpe ziri ezi n'isi nwa m e gburu egbu - Nne Mmesoma
A chọrọ m ikpe ziri ezi n'isi nwa m e gburu egbu - Nne Mmesoma
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Amaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Mgbe e biputara ya
Nne Mmesoma Umeora bụ nwaada otu nwoke gburu n'obodo Uga dị n'Anambra state, gwara BBC ihe ọ chọrọ maka ọnwụ nwa ya nwaanyị.
Ọ sị na ihe ya chọrọ bụ ikpe ziri ezi ma kọwaa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọ ma gbasara nwa ya nwaanyị na nwoke a na-enyo enyo na ọ bụ ya gburu nwaada ahụ.
Cheta na ndị uweojii Anambra State kwuru na ha nwụchiri nwokoroọbịa aha ya bụ Chima Ofoeke, onye a na-enyo enyo na ọ bụ ya gburu Mmesoma.
Mmesoma Umeora dị afọ iri abụọ na atọ ma bụrụkwa nwafọ Uga dị n'Anambra state.
Skip Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a and continue readingLee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
O kwuru na a nwụchiri Ofoeke site na mkpesa nne Mmesoma nyere n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Umuchu.
Nne Mmesoma gwara ndị uweojii na ezinaụlọ ya na-achọ nwa ya nwaanyị achọ kamgbe ụbọchị 16 Ọktoba 2026.



