Akụkọ kachasị n'abalị a: Agaghị ezupụnwuzi ego Naịjirịa na Swizaland ọzọ

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a

Ego Abacha bupuru

Sani Abacha
Nkọwa foto, Abacha bụ onye agha, chịrị Naịjirịa afọ ise dịka onyeisiala tupu ọ nwụọ n'afọ 1998

Ndị mba Swizaland ekwuola na ha eweghachịtachaala ego Abacha zufere na mba ha.

Onye na-anọchite anya Swizaland na Naịjirịa bụ Eric Mayoraz kọwakwara na e nwere iwu ọhụrụ ndị mba Swizaland tinyere ga-egbochi ndị mmadụ izubata ego na mba ha.

"Atụghị m ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo"

Ndị a na-enyo enyo

Ekene Okechukwu bụ otu onye n'ime mmadụ abụọ a kpọrọ aha na ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo bụ onyeisi ndị Ohaneze Ndigbo, agọọla na o sonyeghị.

N'ajụjụọnụ BBC Igbo gbara ya n'ebe e ji ya eji, Okechukwu bụbụ onye uweojii si na ọ bụ maka ekwentị ya furu efu ka e ji kpọọ ya aha.

N'akụkọ mba ofesi

Ụlọọrụ a wakporo

Ndị agha nnupụisi alakụba bekee kpọrọ 'islamist militants' awakpoola isiụlọọrụ ndị agha ọtawaike (task force) nke Afrịka dị na mba Mali taa.

Ndị ntaakụkọ Reuters dere na ndị nnupụisi a bidoro ịgba egbe ma ogbunigwe nke a kpọrọ 'rocket', ma na-achọ iwabata n'ime ụlọọrụ ahụ.

N'egwuregwu,

Marouane Fellaini bụ onye egwu etiti ndị Manchester United ebinyela aka n'akwụkwọ ga-adọtị ọrụ ya n'otu ahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Fellaini dị afọ iri atọ ga-anọkwu afọ abụọ na Man Utd tupu o kwuwe okwu ma ọ ga-apụ gaa ebe ọzọ ma ọ gaghị apụ.

Gee nkeji nke abalị a ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Otu nwoke akwaala arịrị maka etu ezinaụlọ ya si sonye na ndị e gburu na Platu steeti. O kwuru sị "ụmụ m ndị na-enye m nri anọzịghị ndụ."

Aha onyonyo, Ụmụ m ndị na-enye m nri anọzịghị ndụ