A hụla mmadụ abụọ a na-enyo na ha bu Ebola- NCDC

Mmadụ abụọ yi uwe nchekwa
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ na-eru anyị ntụ na-ekwu na mmadụ abụọ eburula ọrịa a na-enyo na ọ bụ Ebola Ọwụwa Anyanwụ Ugwu Nigeria, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi nkesa ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention (NCDC).

NCDC kwuru n'ozi mgbasaozi ha wepụtara n'akara ọbaozi ha na X n'ehihie Satọde na e dotala mmadụ abụọ ahụ iche ma malite ịchọ ndị ha na ha zukọtarala.

Ụlọọrụ ahụ kwuru na o dobeghị anya kpọmkwem na ọ bụ Ebola , dịka ha ga-eme nnyocha tupu ekwubie nke ahụ.Ha gara n'ihu dọọ aka na ntị ka ụmụamala na-edowe onwe ha na mgburugburu ha ọcha iji chekwaa onwe ha.

Cheta na Nigeria enweela onye mbụ butere ọrịa Ebola na Nigeria na nsonso a.

Nwaanyị ahụ bu nwunye, onye ọrụ nnọchite obodo Switzerland si mba Uganda bata Nigeria mana e mechara bupụ ya na Nigeria.