Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Mmadụ 64 anwụọla dịka ụgbọoloko abụọ sukpọrọ onwe ha na Spain
Ndị ọ dị n'aka kwuru na opekatampe mmadụ iri isii na anọ (64) anwụọla oge ụgbọoloko na-agba nnukwu ọsọ sukpọrọ ụgbọoloko ọzọ na mpaghara ndịda Madrid na mba Spain.
Ọnụọgụgụ ndị a nwụrụ anwụ emeela ka ọdachi a bụrụ nke kachasị njọ mba Spain na-ahụta na ngalaba njem ụgbọoloko kemgbe afọ 2013, bụ mgbe mmadụ iri asatọ (80) nwụrụ oge ụgbọoloko gbapụrụ n'okporo ya na mpaghara ndịda-ọdịda anyanwụ Spain.
Ihe karịrị mmadụ narị ise (500) na-eme njem tupu ụgbọelu ndị ha nọ n'ime ya esukpọọ onwe ha, ka ọnụ na-ekwuru gọọmenti mpaghara ahụ kwupụtara.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara Spain
Praịm Minista mba Spain bụ Pedro Sánchez sịrị na ihe mberede ọjọọ ahụ metụtara ụgbọ oloko abụọ tụrụ ya n'anya, ma kwuo na ya na minista na-ahụ maka ime njem na-enwe mkparịtaụka oge niile.
Ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọ oloko bụ Adif kwuru na ihe mberede ahụ mere n'etiti ụgbọ oloko Renfe na ụgbọ oloko Iryo, ndị na-agba site Madrid ruo Seville.
Otu na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ ụkwụ na Spain bụ Royal Spanish Football Federation (RFEF) ekwuola na ha eyigharịala ụbọchị a ga-enwe asọmpi iri abụọ na anọ (24) iji dọnyere ndị zutere ihe ọdachi ahụ ukwu.
E kwesịburu ịgba asọmpi ndị ahụ n'ụbọchị Wenezde 28 Ọktoba maka agba nke mbụ n'ịmaaka Copa del Rey nke mba mba Spain.
N'otu aka ahụ, ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Spain akagbuola emume achụmtavootu ha e kwuru ga-adị n'ụbọchị Wenezde 28 Ọktoba 2026.
Praịm Minista Pedro Sánchez na ndị ha na ya so achị akagbuokwala ihe omume niile ha nwere ime n'ọha, dịka e kwuru na ha na-elebara ọnọdụ ahụ anya nke ọma.
Onye ndu otu na-agba gọọmenti ụkwụ bụ Alberto Núñez Feijóo na ọtụtụ ndị na-azọ ọkwa na ntuliaka ọha ga-adị n'ụbọchị 29 Nọvemba 2026 emekwaala etu a.
Ka ọ dị, onyendu otu "far-right" bụ Santiago Abascal kwuru na Vox agaghị esonye na nke a, ma kọwaa ya dịka mbọ "iji iru uju kụnyụọ nkatọ" nke akụrụngwa njem ụgbọ oloko mba ahụ.