America ejidela nwafọ Nigeria maka ebubo chandum ego ruru $100m n'ihe nrite ụtụisi

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị ọrụ nchekwa mba America ejidela nwafọ Nigeria aha ya bụ Akinade Adedeji Raheem maka ebubo igwu chandum ọnụ ego ruru $100m n'ihe nrite ụtụisi.

A na-ebo Akinade Adedeji Raheem ebubo izuru ndekọ ndị mmadụ, jiri ya na-anara ihe nrite ụtụisi.

E jidere Raheem na mba Benin ma kpụrụ ya laa mba America bụ ebe ọ ga-azara ọnụ ya.

Ebubo a na-ebo Akinade Adedeji Raheem

Gọọmenti mba America na-ebo Raheem ebubo igwu chandum, ibupụ ego nakwa izuru ndekọ njiri mara ndị mmadụ.

Nke a so na uru mmekọ na njikọ aka ọnụ ndị ọrụ nchekwa n'ụwa niile na-eme nke nyereaka mee ka e jide ọtụtụ ndị na-egwu chandum n'internet a na-akpọ 'yahoo boys'.

Ọkaiwu na Georgia bụ Theodore Hertzberg kọwara chandum a na-enyo enyo na Raheem gwuru ndị mmadụ dịka ihe gbara ọkpụrụkpụ ma kwuo na enweghị onye mpụ na nrụrụaka ga-agbanarị ikpe nkwụmụọtọ nke mba Amerika.

Etu Raheem na ndị otu ya si egwu chandum ahụ - America

Ụlọọrụ na-ahụ maka iwu obodo n'America bụ 'US Department of Justice' kwuru na Raheem na ndị otu bụ ndị na-atụ ụtụisi nke ọma n'America ka ha na-ezuru ndekọ na akara njiri mara ha nke a kpọrọ 'social security numbers' nwere ya na-eme mpụ.

Ha kwuru na Raheem na-ejiri akara 'social security number' ndị ha wetere tinye akwụkwọ ka a kwụọ ha ihe nrite ụtụisi.

Ha sị na Raheem na ndị otu ha nwete ego ahụ, ihe ha ga-eme bụ ijri ya zụrụ ụgbọala bubata na Nigeria nakwa mba ndị ọzọ.

Mana akwụkwọ gọọmenti America gbara Raheem gosiri nao nye ọzọ aha ya bụ Abayomi Quadri Eletu so na-egwu chandum ahụ.

Raheem bi na mpaghara Atlanta n'oge ahụ mana Eletu na-esi na United Kingdom na Nigeria.