Odogwu Asaba: Ndị ọkaiwu nke gọọmentị ewetala akwụkwọ ọhụrụ n'ikpe metụtara ebubo ndina n'ike na ibute ọnwụ Favour Agbro

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ikpe agaghị n'ihu taa n'Ụlọikpe Ukwu nke Delta Steeti dị n'Asaba dịka ndị ọkaiwu na-ekpechitere gọọmentị Delta State n'ikpe Ifeanyi Ogbonna, onye a ma ama dịka 'Odogwu Asaba' wetara akwụkwọ ọhụrụ ma zigara onye a na-ekpe ikpe akwụkwọ ndị ahụ.

Onye okwu ụlọikpe were anya kọwara na nke a nwere ike ịpụta na o nwere ihe ọhụrụ a chọpụtara n'okwu ahụ nke mere ka a chọọ ịhazighari ebubo maọbụ usoro ikpe ahụ.

Iji gaa n'ihu n'ikpe metụtara Ogbonna bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo idina Favour Agbro n'ike ma bute ọnwụ ya, ụlọikpe nyere ohere ka ndị ọkaiwu onye a na-ekpe ikpe nwee oge gụọ akwụkwọ ọhụrụ ndị ọkaiwu steeti wetara n'ụlọikpe ahụ ma kwadebe nzaghachi ya.

Ya mere, ụlọikpe yigharịa ikpe Odogwu Asaba gaa abalị 19 nke ọnwa Nọvemba afọ 2026.

Ọkaiwu pụtara n'ụlọikpe n'aha ezinaụlọ Favour bụ Awele Ideal, gbara ama a n'ozi ọ biputara n'akara Facebook ya na Wenezde abali 28 Oktoba, afọ 2026.

Cheta na Ogbonna na-eche ebubo ndina n'ike na igbu mmadu ihu, banyere ọnwụ nwaagbọghọ ahụ bụ Favour Agbro nke merenụ na Juun, afọ 2026.

O kwuru na e yigharịrị ikpe ahụ mgbe ndị ọkaiwu na-ekpechitere gọọmentị gbara akwụkwọ ọhụrụ ma zigara onye a na-ekpe ikpe akwụkwọ ndị ahụ.

Nnọkọ ụlọikpe na-abịa n'abalị iri na itoolu n'ọnwa Nọvemba ka a ga-eji malite ịnụ ikpe ahụ nke ọma.

Ogbonna na-eche ebubo ndina n'ike na igbu mmadu ihu, banyere ọnwụ nwaagbọghọ ahụ bụ Favour Agbro nke merenụ na June 2026.

E yigharịrị ikpe ahụ n'ụbọchị 21 Ọktoba, mgbe ndị ọkaiwu Gọọmentị Delta rịọrọ ụlọ ikpe ka enyekwuo ha oge iji tinye nkwupụta ndị akaebe ha.

Ụlọikpe nyere ndị ọkaiwu gọọmentị ụbọchị asaa ka ha tinye akwụkwọ ndị ahụ, tupu ọ yigharịa ikpe ahụ ruo taa.

Nnọkọ ụlọikpe taa ga-egosi ma ndị ọkaiwu gọọmentị emezuala ịhe ụlọikpe nyere ha iwu ime, na ihe nke a ga-apụta maka usoro ikpe ahụ.

Ndị ọkaiwu na-agbachitere Ogbonna n'ikpe ahụ bụ Ugochukwu Okoli, N.N. Onuzurike, na C.S. Chukwudolue nke 'Triple O & C Chambers'.