Microsoft na-enwe nnukwu nsogbu metụtara Outlook, Copilot Ai ha na mba ruru 74

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ teknụzụ Microsoft na-enwe nnukwu nsogbu na mba ruru iri asaa na anọ n'ụwa niile nke metụtara akụrụngwa ha dị icheiche.
Akụrụ ngwa ndị Microsoft nke a metụtara gunyere Teams, Outlook, na Copilot Ai.
Microsoft sị na nsogbu ahụ mere na ọtụtụ enweghị ike iji akụrụngwa ha dị icheiche arụ ọrụ ma na-ekwu na ha na-enwe ihe iche aka mgba imezi ihe mebiri.
Microsoft kwuru na usoro ha ji emezi ihe mebiri adịghị adabacha ka ha si chọọ dịka ndekọ na-egosi na ihe a bidoro kemgbe awa iri na otu garaaga.
Ụlọọrụ Microsoft kwuru sị na ọbụghị mwakpo ịntaneti nke Bekee kpọrọ 'cyber-security' butere ihe mere n'ụlọọrụ ha.
Dịka ọtụtụ ndị mmadụ ji akụrụngwa Microsoft arụ ọru na-ekwu ka o si emetụta ha; igwe mmadụ ndị ọzọ na-ekwu na nke ahụ emetụtaghị ha.

Ebe foto si, Getty Images
Etu ihe si emetụta ụfọdụ ndị mmadu
Otu jikọrọ ndị nọ na ngalaba ire maọbụ ịrụpụta ọgwụ n'United Kingdom bụ 'UK National Pharmacy Association' gwara BBC na nke a na-emetụta ndị otu ha na mba ahụ niile.
Ha kwuru na nke a mere na ha enweghịike ịkpa nkata maọbu gwa ndị ọrịa ha na-enye ọgwụ okwu site n'izigara ha ozi edemede na akụrụngwa Bekee kpọrọ 'email'.
N'aka nke ọzọ, ndị nkuzi aha ha bụ Jack na Matt gwara BBC na nke ahụ metụtakwara ha maka na ọtụtụ ụmụakwụkwọ ha enweghị ike iji akụrụngwa 'One Drive' nwete ihe e zigara ha n'Email ha.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwa arịrị maka na ha adịghịike enwete ozi dị n'Email' ha.





























