Onyeisiala Bola Tinubu ewepụtala atụmatụ 'manifesto' ya, mana ndị Nigeria aga-atụkwasị ya obi?

Ụmụnwaanyị yicha akwa njirimara ndị pati APC guzoro n'ihu onyeisiala Bola Tinubu, onye yi akwa anụnụ ma kpuru okpu mmeemmee
Nkọwa foto, President Tinubu na-azọ ọkwa nke ugboro abụọ mana ihe isi ike na oke ọṅụ ahịa bụụrụ ya nnukwu ihe iche aka mgba
    • Onye dere ya, Ondiro Oganga
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Onyeisiala Nigeria bụ Bola Ahmed Tinubu ewepụtala 'manifesto' nke o ji azọ ọkwa ọchịchị nke ugboro abụọ, ma kwe nkwa iwuli ọnọdụ akụnụba, ịkwalite nchekwa nakwa ọnọdụ ụlọ obibi.

Atụmatụ a Tinubu wepụtara na-ele anya na tupu afọ 2031, akụnụba Naịjirịa ga-eji pasentị isii too, a ga-ewe mmadụ 78,000 n'ọrụ nchekwa, ma rụọ ụlọ obibi 200,000 ga-adị ọnụ ala.

Nigeria ga-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ọnwa Jenụwarị afọ 2027, nke Peter Obi, Atiku Abubakar onye bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa, na Tinubu so na ndị na-azọ ya bụ ọkwa.

'Manifesto' bụ akwụkwọ nke ndị na-azọ ọchịchị na-ewepụta iji kọwaara ọha na eze ihe ha bu n'obi ime ma ha nweta ọkwa ọchịchị, iji mee ka ndụ dịwanyere ndị mmadụ mfe.

Joshua Osiyemi, bụ onyeisi 'Tracka' bụ ngalaba ụlọọrụ ndekọ BudgIT, gwara BBC na Tinubu na ndị pati ya chọrọ iji 'manifesto' ọhụrụ a mee ka Nigeria kwụrụkwa n'ụkwụ ya ọzọ.

Ka o merichara ntuliaka 2023, Tinubu tinyere ọtụtụ mgbanwe gbara ọkpụrụkpụ n'ọchịchị Nigeria gụnyere mwepu 'fuel subsidy' ijikọta usoro mgbanwe ego si mba ofesi, nakwa itinye iwu ụtụisi ọhụrụ.

Ọ bụ eziokwu na ndị ọkachamara n'okwu akụnụba kwuru na mgbanwe ndị a dị mkpa, mana ha butere nnukwu ihe isi ike na Nigeria.

"Ọnụahịa mmanụ ụgbọala ji ike gbalie elu, nke mere ka ọnụahịa ihe niile soro ya gbalie," Osiyemi gwara BBC.

"Ọtụtụ ezinụlọ na Nigeria ekwuola na puku naịra iri anaghị ezuru ha n'ụbọchị," ka o kwuru dịka ụfọdụ ngụkọ siri gosi.

Otu n'ime ngụkọ a gosiri na ọnụahịa osikapa si mba ofesi gbaliri elu karịa pasentị 184 site n'ọnwa May 2023 oge Tinubu malitere ọchịchị ruo ọnwa October 2025.

Ọnụahịa nri ndị ọzọ dịka agwa, garri na achịcha gbalikwara elu nke ukwuu.

Mana ụlọọrụ SBM Intelligence mekwara nnyocha gosiri na ego e ji esi otu ite osikapa jollof gbadatara ala ruo pasenti 11.5 n'etiti ọnwa June na September 2026, nke bụ mgbadata ala kachasị n'ime afọ iri ha ji mewe ngụkọ ha kpọrọ 'jollof index'.

Ụlọakụ mba ụwa nakwa ụlọọrụ 'International Monetary Fund (IMF) etokwaala ọchịchị Nigeria maka mgbanwe ndị a ha tinyere, dịka ngụkọ 'inflation' gosikwara na mgbali elu ọnụahịa kwụ ugbua na pasenti 14, dịka ọ gbadatara na pasentị 34 ọ dịbu n'afọ 2024.

Tinubu kọwara na nkwụsị 'fuel subsidy' emeela ka Nigeria nwee ego karịrị otu tarị naịra n'ime ọnwa abụọ mbụ ha ji kwụsị ya. Mana o kwukwara n'ọdị nso na ya ga-agba mbọ iwedata ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

Onye bụbu osote onyeisiala Nigeria bụ Atiku Abubakar yi akwa ọcha na-ekwu okwu
Nkọwa foto, Onye bụbu osote onyeisiala Nigeria bụ Atiku Abubakar so na ndị na-azọsa Tinubu ọkwa onyeisiala n'afọ 2027

Atiku akatọọla Tinubu maka iwepụ 'fuel subsidy' ma kwuo na ya ga-eweghachite ya ma o merie okwa onyeisiala.

"A kwụdoro m n'ihe m kwuru. Aga m eweghachite 'subsidy' iji mee ka ndụ dịwanye mfe ma dịwanye ọnụala maka ụmụ Nigeria," Atiku dere na X.

Mana ndị ọkacha mara na-ekwu na mweghachi 'subsidy' agaghị adị mfe nye ọnọdụ akụnụba Nigeria.

"Budget Nigeria maka afọ 2026 bụ ihe dịka tarị naịra 68.32tn, nke tarị naịra 15.8 bụ ihe e ji akwụghachi ụgwọ Nigeria ji. Nke a pụtara na ọnọdụ akụnụba anyị esichaghị ike iweghachite subsidy," Osiyemi kwuru.

Dịka ọ fọdụrụ naanị ọnwa abụọ tupu ntuliaka, ihe isi ike na oke ngalaọnụ ahịa bụ ihe kacha dị ndị mmadụ mkpa.

N'ihi nke a, Tinubu na-ekwe nkwa na ya ga-ewedata ọnụ ahịa obibi ndụ, wulite ọnọdụ akụnụba ruo pasenti isii, ma belata ọnọdụ ewneghị ọrụ ndị ntorobịa ruo ọkara.

Tupu ihe ndị a enwee isi, Nigeria ga-ebuli mmepụta mmanụ agbịdị ma bawanyekwa nkọpụta ihe oriri. Mana ebe a kacha akọpụta ihe oriri bụ na mpaghara Ugwu, ebe enweghị nchekwa merela ka ịkọ ugbo raa ah u nke ukwuu.

Egwu ntọrọ anaghị ekwekwa ndị ọrụ ugbo gaa ọrụ n'ugbo ha, nke mere ka nkọpụta nri gbatuo.

Tinubu kwere nkwa na ya ga-etinye mmadụ 28,000 n'otu ndị agha ma werekwa mmadụ 50,000 n'otu ndị uweojii, iji kwalite nchekwa, mana Okonkwo kwuru na ọnọdụ enweghị na mpaghara ugwu abụghị naanị ihe iwe ndị ọrụ nchekwa ọhụrụ ga-egbo.

Iwulite ọnọdụ nchekwa bụ otu ihe gbara ọkpụrụkpụ nke Peter Obi bụ onye ji pati Nigeria Democratic Congress (NDC) azọ ọkwa onyeisiala na-ekwe nkwa na ya ga-eme ma ọ bụrụ na ya merie.

Obi wepụtara atụmatụ ọchịchị nke ya n'ụbọchị 10 nke ọnwa November, bụ nke ọ kpọrọ "A New Nigeria is Possible", ma kwuo na ijikọta Nigeria ọnụ na iwute nchekwa so n'ihe kacha mkpa ọ ga-eme.

"Onweghi onye ga-atọrọ ụmụakwụkwọ ma gbagbaa n'ime ọhịa ọzọ. Ọ bụrụ na ị tọrọ ụmụaka gbabaa ime ọhịa, ị gaghị anọ naanị gị ebe ahụ, anyị ga-achị gị bịa ebe ahụ," Obi kwuru.

Tinubu kwekwara nkwa iwulite ọnọdụ ọkụ latrik na Nigeria ruo 10,000MW, iji kwalite ọnọdụ azụmahịa na nrụpụta ihe, mana Okonkwo kọwara na onweghị ihe dị n'ime 'manifesto ndị APC kọwara etu ha ga-esi mee nke a n'ihi na ọ ga-ewe nnukwu ego.

Peter Obi na-ekwu okwu n'ọgbakọ pati ndị NDC
Nkọwa foto, Peter Obi bụ onye ji pati NDC azọ ọkwa onyeisiala kwuru na iwulite nchekwa na ọkụ latrik so n'ihe kacha mkpa ọ ga-eme ma ya merie

Ụlọọrụ Nigerian Electricity Regulatory Commission na-ekwu na Nigeria nwere ikike imepụta ọkụ latrik ruru 13,625MW n'ebe ngwụcha afọ 2024, mana ọkụ latrik ha mepụtara n'afọ ahụ dị naanị 4,223MW, n'ihi na akụrụngwa ha nwere emeela ochie, anaghị emezi ha nke ọma, gaasị e ji emepụta ọkụ latrik adịghị n'uju, ego e ji arụ ọrụ dịkwa nta.

"Gọọmentị agaghị ewneike ibuli ego latrik nke ukwuu ka ndị mmadụ ghara ibili n'iwe, mana nke a emekwaala ka ndị chọrọ itinye ego na ngalaba ahụ na-atụ uche maka na ha agaghị enweta nnukwu ọmụrụnwa na ya," Okonkwo kwuru.

Enweghị ọkụ latrik emeela ka ọtụtụ ezinụlọ na ụloahịa dabere n'igwe na-enye ọkụ, nke mekwara ka ọnụ ahịa obibi ndụ gbalie karịa.

'Manifesto' Tinubu kwekara nkwa ịrụ ụlọ obibi ọnụ ala ruru 200,000, mana nke a bụ ihe ntakịrị dịka ndị ọkacha mara na-ekwu na Nigeria kwesiri inwe ụlọ obibi ruru nde 14.9 n'afo 2025 iji belata ụkọ ụlọ.

"Ọtụtụ ihe dị n'ime 'manifesto' ahụ yiri egbeokwu, mana ọ bụrụ na ha tinye uche ime ha, ụfọdụ n'ime ha ga-ekwe omume," Osiyemi kwuru.

"Ihe kacha mkpa ma ọ bụrụ na APC chọọ inweta mmeri na ntuliaka a, bụ na ha ga-agba mbọ inweta ntụkwasị obi ụmụ Nigeria ọzọ," Okonkwo kwuru.

"N'afọ 2023, APC nwetara mmeri nihi na ndị na-ama ha aka kewara onwe ha ụzọ abụọ ma wepụta mmadụ abụọ gbara ọkpụrụkpụ bụkwa ndị si mpaghara abụọ dị icheiche. N'ikpeazụ ọ bụrụkwa ihe gbasara mpaghara na agbụrụ onye si."

Dịka ntuliaka 2027 na-eru nso, Tinubu, Atiku na Obi bụkwa ndị kacha sie ike na ndọrọndọrọ a, mana otu ihe ahụ cheburu ndị pati na-anọghị n'ọchịchị aka mgba na 2023, ka dịkwa ugbua: ijikọta ọnụ ma nwata nkwado na mpaghara ndị ọzọ na-abụghị ebe nke ha si pụta.

"Ọ ga-adịkwa etu ọ dị na 2023," Okonkwo kwuru.

"Ndị APC esiwanyela ike ugbua dịa pati nọ n'ọchịchị, ebe ndị nke ọzọ agbadatala na nkwado ha nweburu na 2023."