Onye bụ Shirley Emehelu nwaafọ Nigeria e mere 'Lieutenant Governor' na mba America?

Ebe foto si, NJOHSP/ Facebook
A họpụtala nwaafọ Nigeria bụ Shirley Emehelu dịka Osote Gọvanọ nke Bekee kpọrọ 'lieutenant governor' nke steeti New Jersey na mba America.
Emehelu bụ onye nke ise ga-abụ 'lieutenant governor' bụkwa onyeisiojii Africa mbụ na-enweta ọkwa ahụ.
Shirley Emehelu bụ onye ọkaikpe iwu a mụrụ na Nigeria, onye nwetara ọkwa osote gọvanọ bụ ọkwa a maara dịka 'Lieutenant Governor' nke steeti New Jersey dị na mba America.
Gọvanọ steeti ahụ, Mikie Sherrill, họpụtara ya n'ụbọchị Mọnde, abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba 2026, ka ọ nọchie Dale Caldwell, onye gbara arụkwaghịm n'ọnwa Septemba.
Nhọpụta a mere ka Emehelu bụrụ onye mbụ si mba ọzọ kwabata ga-abụ osote gọvanọ New Jersey. Ọ bụkwa oge mbụ ụmụnwaanyị abụọ ga-anọ n'ọkwa gọvanọ na osote gọvanọ steeti ahụ n'otu oge.
Ebe ka Shirley Emehelu si?

Ebe foto si, New Jersey Office of State Controller/ Facebook
A mụrụ Emehelu na Nigeria n'ọnwa Disemba afó 1977, mana nne na nna ya kpóró ya kwaga mba America mgbe ọ dị naani afọ atọ.
Ezinaụlọ ya buru ụzọ bie na Chicago tupu ha akwaga Pittsburgh.
Nne na nna ya bụ ndị dibịa Bekee, ebe nna nna ya bụ Dọkinta Fabian Anene Ositadimma Udekwu bụ otu n'ime ndị ọsụ ụzọ kacha gbaa ọkpụrụkpụ n'ịwa obi n'Africa.
Emehelu gụrụ akwụkwọ na Mahadum 'Yale University', ebe o nwetara akara ugo mmụta mbụ ya, tupu ọ gaa 'Yale Law School' nweta akara ugo mmụta 'Juris Doctor'.
Ọ lụrụ di ma mụọ ụmụ abụọ, ma biri na Montclair, New Jersey.
Kedu etu o siri ruo n'ọkwa a?

Ebe foto si, New Jersey Office of State Controller/ Facebook
Emehelu malitere ọrụ iwu n'afọ 2004 n'ụlọọrụ iwu Debevoise & Plimpton.
N'afọ 2010, ọ banyere n'ọfịs onye ọkaikpe gọọmentị America, ebe ọ nọrọ afọ itoolu na-ekpe ikpe gbasara mpu na nrụrụaka.
Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka iweghachite akụ na ụba e nwetara n'ụzọ iwu na-akwadoghị na ịlụso ịsacha ego ọgụ.
N'afọ 2022, ọ sonyeere ọchịchị New Jersey dịka 'Executive Assistant Attorney General', bụrụkwa onye nke atọ kacha elu n'ọkwa ọchịchị ụlọọrụ onye ọkaikpe ukwu steeti ahụ.
Mgbe Mikie Sherrill malitere ọchịchị ya n'afọ 2026, ọ họpụtara Emehelu ka ọ bụrụ onye na-ahụ maka nyocha ego gọọmentị, iji lụso nrụrụaka na mmefu ego na-ezighị ezi ọgụ.
O mechara rụọ ọrụ dịka onye na-achịkwa ọrụ odeakwụkwọ steeti tupu nhọpụta ọhụrụ a.
Gịnị ka nhọpụta ya pụtara?

Ebe foto si, New Jersey Office of State Controller/ Facebook
Nhọpụta Emehelu bụ nnukwu ihe nlereanya nye ndị si mba ọzọ kwabata na America, ọkachasị ndị nwere mgbọrọgwụ n'Africa, n'ihi na ọ bụ onye mbụ kwabatara na New Jersey ga-enweta ọkwa osote gọvanọ.
Emehelu kwupụtara na ọ ga-eji amamihe iwu na ahụmịhe ọrụ ọha ya gbaa mbọ belata ọnụ ahịa obibi ndụ, meghee ohere ọhụrụ n'akụnụba, ma hụ na gọọmentị na-arụrụ ndị bi na steeti ahụ ezigbo ọrụ.
Nhọpụta ya emeela ka aha nwaanyị nwere mgbọrọgwụ na Nigeria banye n'akụkọ ihe mere eme nke ọchịchị New Jersey, ebe ọ na-amalite ọrụ ọhụrụ dịka otu n'ime ndị isi kacha elu na steeti ahụ.































