Etu nwaakwụkwọ Babcock University si chọrọ isi n'ụlọelụ atụpụ onwe ya

Ebe foto si, Babcock University/facebook
Mahadum 'Babcock University' dị n'Ogun state ekwuola na nwata akwụkwọ ha gbalịrị ịkwụ ụdọ na-anata nleta n'ụlọọgwụ mahadum ahụ.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia n'ụbọchị Monde gosiri ka otu nwata nwokoroọbịa na-agbali isi na mpịọ dị n'ụlọelu ebe obibi ụmụakwụkwọ mahadum ahu wụtuo n'ala, ebe ndị ogbo ya na-agba mbọ ijide ya ka ọ ghara ịwụpụ.
Akụkọ na-efegharị kwukwara na nwamadi ahụ nwụrụ.
Mana ozi mgbasaozi nke osote ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Johnson Akintayo kwuru na ọ dị ndụ ma na-anata nleta. O kwukwara na otu nwata akwụkwọ ibe ya bụ onye merụụ ahụ dịka ọ na-azọ ya ndụ na-anatakwa ọgwụgwọ.
Ozi ahụ kwuru sị, "Anyị ji ohere a agwa ọha ndị mmadụ na nwata akwụkwọ akụkọ kwuru na ọ nwụrụ, na-anata nleta n'ụlọọgwụ."
"Ụmụakwụkwọ ya na ya bi gbochibidoro ihe dị mwute ime."
"Ya bụ nwatakwụkwọ na otu onye so na ndị zọpụtara ya merụụ ahụ ma na-anata nleta ahụike."

Ebe foto si, Babcock University/Facebook
Ka ọ dị ugbua, o dobeghị anya ihe tinyere nwata akwụkwọ ahụ n'ụdị agwa ahụ mana mahadum ahụ kwere nkwa ime nnyocha chọpụta etu mmiri si banye opi ụgbọgụrụ.































