Ndị uweojii New York ejidela nwata nwoke dị afọ 17 maka igbu nwaakwụkwọ Ghana

Ebe foto si, @ASKGHMEDIA
Ndị uweojii New York na mba America ekwuola na ha jidela nwaokoroọbịa dị afọ 17 a na-enyo enyo n'aka ya dị n'igbu Javits Frimpong, nwaakwụkwọ Ghana dị afọ 15, bụ onye a gbagburu ka ọ na-aga ụlọakwụkwọ
Ndị uweojii New York (NYPD) kwupụtara njide ahụ n'ozi ha wepụtara n'akara X ha, n'ụbọchị Wenezde, abalị 11 nke ọnwa Nọvemba, ebe ha kwuru na ha ga-ebo nwata ahụ ebubo igbu ọchụ.
Akụkọ ụlọọrụ mgbasa ozi ABC7 New York kwuru na ndị uweojii akpọrọla onye a na-enyo enyo maka ịjụ ya ajụjụ.
Ha kwukwara na nwaokoroọbịa ahụ ga-aza ajụjụ banyere ebubo igbu mmadụ n'ebughị n'obi na ebubo metụtara iji ngwa ọgụ.
N'ihi na onye a na-enyo enyo erubeghị afọ iri na asatọ, ndị uweojii ekwughi aha ya. Ha ekwughịkwa ihe kpatara e ji gbagbuo Frimpong.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Kedụ ka e si gbuo nwaakwụkwọ Ghana ahụ?
Cheta na a gbara Frimpong egbe n'afọ ya n'ụbọchị 29 Ọktọba 2026, ka ọ na-aga ụlọakwụkwọ n'akụkụ East 17 1st Street na Crotona Place, nke dị na mpaghara Claremont na Bronx.
E bugara ya n'ụlọọgwụ, ebe ndị dọkịta nọrọ kwupụta na ọ nwụọla.
Akwụkwọ akụkọ 'The Guardian' kọrọ na Frimpong si Ghana kwaga mba America ihe dịka otu afọ tupu ọnwụ ya, ka ya na nna ya, bụ Thomas Frimpong, biri.
Nna ya gwara ụlọmgbasa ozi ahụ na nwa ya nwoke mere mkpesa na ụmụakwụkwọ ibe ya na-emegbu ya n'ụlọakwụkwọ, nke mere ka a kwụsịtụ ụmụakwụkwọ abụọ ịbịa akwụkwọ nwa oge.
Mana ndị nnyocha ekwenyebeghị na mmegbu ahụ nwere njikọ na ogbugbu ya. Ndị uweojii si na ha na-enyocha ihe dị iche iche nwere ike ịbụ ihe kpatara ya.
Njide a na-abịa n'oge ezinụlọ Frimpong na ndị Ghana bi n'America na-eti mkpu ka e kpee ikpe ziri ezi maka ọnwụ nwa ahụ.




























