Ihe anyị ma maka ọgbaaghara dapụtara n'Asaba nke butere ọnwụ otu onye n'oge achụmnta vootu pati NDC

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Eze Asaba dị na Delta state akatọla mwakpo na ọgbaaghara butere ọnwụ otu onye mgbe ndi pati Nigeria Democratic Congress (NDC) mere achụmnta vootu n'Asaba dị na Delta state n'ụbọchị Satọde 7 Nọvemba 2026.
Epiphany Azinge kwukwara na ọbụghị eziokwu na ya boro onye ga-eji ọkọlọtọ pati NDC zọọ ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi na ndị otu ya ebubo ibute ọgbaaghara n'obodo ahụ.
N'ozi o weputara n'akara Facebook ya nke ọnụ na-ekwuru obieze ahụ bụ Philips E. Nwokolo binyere aka, ka Azinge doro ndi otu ndọrọndọrọ niile aka na nti ka ha ghara ịji ime ihe ike ọbụla mebie udo na ịdịn'otu dị n'obodo Asaba.
Ọ gwakwara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche ka ha na-asọpụrụ ọchịchọ obi nke ndị mmadụ n'oge niile.
N'otu aka ahụ, ọ dụrụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọdụ ka ha chọọ nchekwa zuru oke tupu ha amalite ime ọgbakọ achụmnta vootu.
Banyere akwụkwọ ozi na-efesa na soshal midịa nke e ji aha na akara obieze katọọ onye ga-azọ ọkwa onyeisiala na pati NDC bụ Peter Obi na ndị otu 'Obidient/OK Movement' bụ nke boro ha ebubo ịkpalite ọgbaaghara ahụ, Azinge kwuru na akwụkwọ ozi ahụ esighị n'aka ya pụta.
Ọ gara n'ihu gwa ọha na eze ka ha leghara ozi ahụ anya dịka o kwuru na ọ bụ ozi adịgboroja.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Gịnị kpatara ọgbaaghara ahụ?
Ndị uweojii kwuru na otu onye nwụrụ ebe mmadụ ise merụrụ ahụ n'ọgbaaghara ahụ nke dapụtara n'ihe dịka elekere 12:15 ehihie n'ụbọchị Satọde, abalị asaa nke ọnwa Nọvemba, n'okporoụzọ Nnebisi dị n'Asaba.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta state bụ Bright Edafe, kwuru na ha nwetara ozi na-egosi na e nwereike inwe ọgbaaghara tupu pati NDC amalite ọgbakọ achụmnta vootu ahụ.
Dịka o siri kwuo, ha dụrụ ndị nhazi ahụ ọdụ ka ha ghara ime ngagharị n'okporoụzọ mepere emepe, kama ka ha họrọ ebe a kara aka nke ndị uweojii ga-enwe ike ichekwa.
Mana ndị nhazi ọgbakọ ahụ gara n'ihu mee ngagharị ahụ n'agbanyeghị ndụmọdụ ahụ, tupu esemokwu amalite.
N'aka nke ọzọ, gọọmenti Delta Steeti kwukwara na ndị nhazi ahụ leghaara ndụmọdụ ndị uweojii anya, ebe Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ okporoụzọ ime obodo na mgbasa ozi bụ Charles Aniagwu, kpọrọ ihe ahụ mere ihe na-adịghị anabata.
Ọ gwara ndị uweojii ka ha mee nnyocha zuru ezu ma hụna a kpụpụrụ onye ọbụla aka ya dị n'ọgbaghaara ahụ n'ụlọikpe.
Ihe ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị NDC kwuru

Ebe foto si, Senator Ovie Omo-Agege
Onye bụbu osote onyeisi n'ụlọomeiwu ukwu Nigeria bụ Sinetọ Ovie Omo-Agege, boro ebubo na ọ bụ ndị omekome sitere n'aka ndị nọ n'ọchịchị bụ pati APC wakporo ndị otu NDC oge ha na-eme ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị ha, mana o nyeghị ihe akaebe ọbụla kwadoro ebubo a.
N'ozi o wepụtara n'akara soshal midịa ya na Sọnde, Omo-Agege kwuru na-emebiri ihe karịrị ụgbọala 30, ebe ihe karịrị mmadụ 10 merụrụ ahụ.
Ọ gwara gọvanọ Delta bụ Sheriff Oborevwori, ka o hụna e mere nnyocha ma taa ndị aka ha dị n'ihe ahụ ahụhụ.
Ọ kpọkwara ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ka ha hụna ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nwere ohere ime ọgbakọ achụmnta vootu n'udo na-enweghị egwu mwakpo.
Ka ọ dị ugbu a, ndị uweojii ekwuola na ha amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọgbaaghara ahụ na ndị so na ya.
Mana Kọmishọna ndị uweojii bụ Samuel Erale, ekwuola na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nwere ikike ime ọgbakọ achụmnta vootu ma ọ bụrụhaala na ha na-eme ya n'ụzọ iwu kwadoro.




























