Etu Gọọmenti Nigeria si họpụta ndị ha ga-enye N50,000 ego nkwado na-efu

Ebe foto si, Bola Tinubu / Facebook
Gọọmenti Nigeria site na Mịnịstrị na-ahụ maka ọdịmma mmadụ nke Bekee kpọrọ 'Humanitarian Ministry' enyela nkọwa etu ụlọọrụ National Emergency Relief and Stabilisation Intervention (NERSI) si họpụta ndị a ga-enye ego nrite puku naịra iri ise.
Ha mere ka a mata nke a site n'akwụkwọ ozi Janet Mcdickson Noah bụ onyeisi ngalaba mgbasaozi ha kesere ndị ntaakụkọ.
Ọzị gosiri Usoro gọọmenti Nigeria si họrọ ndị ha ga-enye ego ahụ nakwa etu ndị ahụ ga-esi enwete ya bụ ego.
Ego ahụ bụ nke gọọmenti Nigeria wepụtere iji nyere ndị ihe na-esiriike aka ma kwadoo ezinaụlọ ha maka etu ọnụahịa ọtụtụ ihe na-arịelu si emetụtata ha.
Usoro e si họpụta ndị a ga-enye ego N50, 000

Ebe foto si, Bola Tinubu /Facebook
Janet Mcdickson Noah kọwara na ọ bụ ndekọ dị icheiche gọọmenti Nigeria were ka ha ga-esi wepụta aha ndị ga-erite erere ego nkwado ahụ.
Ọ sị na ndekọ ahụ bụ nke gosiri ndị ihe na-esiriike nakwa ndị ogbenye na mpaghara Nigeria niile.
Ọ gara n'ihu kwuo na enweghị ebe mmadụ ga-edebenye aha ha ma kwuo na a ga-ezitere ndị a ga-enye ego ahụ ozi n'ekwentị ha.
Ọ sị na ọ bụ ụlọakụ nwereikike ga-ezigara ndị ahụ ozi ma kwuo na ego ahụ abụghị nke ha ga-akwuchinye azụ.
Ndụmọdụ nchekwa ndekọ onwe
Janet nyekwere ndị mmadụ ga-erite erere ego ahụ ka ha muru anya hapụ inye onye ọbụla ndekọ njiri mara ha dị icheiche.
Ọ sị ha enyekwala mmadụ nke Bekee kpọrọ 'Personal Identification Number (PIN), One-Time Password (OTP) maọbụ Bank Verification Number (BVN)'.
Ma kwuo nae be ha ga-enwete nke bụ eziokwu banyere ihe ọbụla gbasara ego ahụ bụ n'akara ekwenti NERSI bụ 0700-022-2222.




























