Tinubu ekwuola na ọdịmma ụmụntorobịa na ọ dị n'ihu ha gbadoro ụkwụ n'ịtụnyere ndị APC na ntuliaka 2027

Ebe foto si, Bayo Onanuga / Facebook
Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na ọdịmma nakwa ọ dị n'ihu ụmụntorobịa na Nigeria gbadoro ụkwụ n'itinyere otu ndọrọ ndọrọ ọchndị All Progressives Congress.
Bola Tinubu gwara ụmụntorobịa nke a n'oge ọ jere ịchụnta vootu na Portharcourt, Rivers state n'abalị asaa nke ọnwa Nọvemba 2026.
Tinubu kenere ndị Rivers state maka itinyere ya vootu na ntuliaka 2023 ma rịọ ha ka ha tụnyere ya na ntuliaka Onyeisiala n'afọ 2027.
Tinubu gwara ụmụntorobịa sị "mana ụmụntorobịa Nigeria, anam ekiri unu, ntuliaka bụ maka unu, ọbụghị maka m, ọ dị n'ihu unu gbadoro ụkwụ na ntuliaka a".
"Ọganihu anyị wetere enweghị nlọghachịazụ. Unu ka ọ dịrị iji ngwaagha unu nwere bụ PVC (Parmanent voter's card). Ọ bụrụ na ịnatabeghị nke gị bịkọ gaa nara ya".
Tinubu gara n'ihu gwa ndị ntorobịa sị ha "ngwaagha unu nwere maka ụbịam na agụọ bụ ịtụnyere mmepe na nhazị akụnụba anyị nke m na-achọ ime".
"Ndị nke chịrị n'oge garaaga ji ụgwọ ha akwụghị ndị nara ezumuike nka ọnụ ego ya ruru njeri pụrụ njeri naịra".

Ebe foto si, Bayo Onanuga / Facebook
Ihe mere ị ga-eji atụnyere Tinubu - Shettima, Akpabio, Adams Oshiomhole
Ndị nkwado Onyeisiala Bola Tinubu nakwa ndị so gaa ịchụnta vootu na Rivers state ekwuola ọtụtụ mere ndị mmadụ ji kwesi ịtụnyere Tinubu na ntuliaka Onyeisiala a ga-eme n'afọ 2027.
Mmadụ dịka Onyeisiala Nigeria bụ Kashim Shettima, Onyeisi ụlọomeiwu Senate bụ Sịnetọ Godswill Akpabio nakwa onye bụbu Gọvanọ Edo state bụ Adams Oshiomhole kwuru ihe dị icheiche ha ji na-akwado Tinubu ma na-agwa ụmụ Nigeria tụnyere ya vootu.
Kashim Shettima bụ Osote Onyeisiala Nigeria gwara ndị Rivers state sị "N'afọ anọ garaaga, unu nyere anyị ntụkwasị obi, a ma m na unu ewepụbeghị ya".
Shettima sị na ọchịchị "atọọla ntọala" mana ugbua "oge eruola ka anyị wuo ụlọ n'elu ya".
Ọ gara n'ihu kwuo na "akụnụba Nigeria kwụsiri ike ma kwụrụ chimchim" maka na Onyeisiala Tinubu nwere mkpebi dị icheiche siri ike o kpebiri nke ụmụ Nigeria ga-erite ere na ya n'ọdị n'ihu nke gụnyere "mgbanwe usoro ụtụsisi" nakwa "igbanwe ngalaba ọrụ ugbo" dgz.

Ebe foto si, Bayo Onanuga / Facebook
Godswill Akpabio bụ Onyeisi ụlọomeiwu sịnate Nigeria kwuru sị na ụmụakwụkwọ ndị na-erite erere n'atụmatụ gọọmenti wepụtere ịgbazinye ha ego a na-akpọ NELFUND so n'ihe kwesiri iji kwado Onyeisiala Bola Tinubu ịchị Nigeria ọzọ na ntuliaka 2027.
Akpabio kwuru na ugbua "Nigeria na-enwete ego n'ụtụisi ha na-anata karịa n'ego ha na-erete na mmanụ agbịdị".
Ọ sị na "Tinubu wepụrụ ego enyemuaka 'fuel subsidy' mana Nigeria ekewaghị ma kọkwa ya dịka nnukwu mkpebi siri ike Tinubu kpebiri dịka Onyeisiala.
Ọ gara n'ihu kwuo na "Tinubu ekwela nkwa inye ndị Rivers state ọdọ ụgbọmmiri 'seaport' n'olu Bekee ma gbakwụnye na ọdọ ụgbọelu ha nwere .
Adams Oshiomhole bụbu Gọvanọ Edo state so na ndị kwuru okwu n'ọgbakọ ahụ ma sị na ọ bụrụ na Tinubu banye n'ọchịchị ọzọ n'afọ 2027 na ihe ọ ga-eme gunyere:
- Ime ka ụlọọrụ ndị si Nigeria pụọ lọghachite azụ.
- Mee ka ọrụ dị.
- Dozie ngalaba nchekwa,
- Mezie ngalaba ọrụ ugbo,
- Hazie njem okporoụzọ nakwa njem ụgbọoloko.
Ọ gara n'ihu kwuo sị na Tinubu ga-emezi ngalaba ọkụ latrịk.

























