State 30 akwadola atụmatụ ihiwe ndị uweojii nke state na Nigeria

Ebe foto si, Nigeria Police / Facebook
State iri atọ n'ime state iri atọ na isii dị na Nigeria akwadola atụmatụ ihiwe ndị uweojii nke state dịka ụlọomweiwu Sinetị si kwuo.
Onyendu ndị pati kacha n'ụlọomeiwu sinetị bụ Opeyemi Bamidele mere ka a mata nke a n'ọgbakọ ndị omeiwu nwere n'ụbọchị Wenezde 4 Nọvemba 2026.
O kwuru na ndị omeiwu Sineti Nigeria enyela state isii na-ekwubeghị ebumnobi ha banyere atụmatụ iwu ahụ ruo 15 Nọvemba, 2026 ka ha kwuo obi ha banyere tupu ụlọomeiwu ebugara Onyeisiala Tinubu maka ibinye aka ya.
Opeyemi gara n'ihu kwuo na state 30 kwadoro atụmatụ ihiwe ndị uweojii state agafela ọnụgụgụ 24 nke iwu Nigeria kwadoro maka ihiwe ndị uweojii state.
Sinetọ Opeyemi kọwara na state ndị ahụ kwadorola iwu ahụ gụnyere Adamawa, Akwa Ibom, Anambra, Bauchi, Bayelsa, Borno, Delta, Ebonyi, Ekiti, Imo, Gombe, Kaduna, Jigawa, Kebbi, Kwara, Lagos, Ogun, Rivers, Sokoto, Yobe, Zamfara na ndị ọzọ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Onyeisi ụlọomeiwu Sinetị bụ Godswill Akpabio adịla na mbụ rịọ state isii ndị ahụ na-ekwubeghi ebumnobi ha ka ha mee ngwangwa.
Akpabio kwuru na ọ bụrụ na state isii ndị ahụ enweghị ihe ha kwuru ruo n'ohere e nyere ha agafee na ndị omeiwu Sinetị ga-ahụta ya dịka na ha 'enyeghị nkwado' ọbụla.
Nke a bụkwa etu ndị omeiwu niile nọ n'ụlọomeiwu sịneti si ahụ ya.
Usoro e si eme ka iwu ndị uweojii nke state dị ire

Ebe foto si, Nigeria Police / Facebook
Usoro ọzọ bụ iziga mkpebi ụlọomeiwu state ndị ahụ n'Ụlọomeiwu Etiti ka e nyochaa ma kwado ha, tupu e zigara ya Onyeisiala maka nkwado ikpeazụ.
Mịnịstrị ikpe ziri ezi ga-enyocha ma kọwaa ọrụ, ego, na nlekọta ndị uweojii state ahụ.
N'okpuru atụmatụ a, steeti ọbụla chọrọ inwe ndị uweojii nke ya ga-ebu ụzọ mee iwu ga-ehiwe ha, ma mezuo usoro niile Gọọmentị Etiti hiwere.
A gaghị amalite ọrụ ndị uweojii state ruo mgbe e nyochara state ahụ ma nye ya asambodo, ebe Gọọmentị Etiti ga-anọgide na-elekọta ha.
Mgbanwe iwu a chọrọ iweta

Ebe foto si, Nigeria senate / Facebook
Atụmatụ iwu ndị uweojii nke state a chọrọ ịgbanwe iwu Nigeria nke afọ 1999.
Ka ọ dị ugbua, ọ bụ naanị gọọmenti etiti Nigeria nwere ndị uweojii dịka iwu obodo si kwuo nke mere e ji chọọ ka a gbanwe ya.
Iwu ahụ na-achọ ka state niile nọ na Nigeria nwee ike ihiwe ma na-elekọta ndị uweojii nke ha.
Ọ chọrọ ịkpachi ebe ndị uweojii nke gọọmenti etiti na-eri mperi nke gụnyere ọnọdụ enweghị ezigbo nchekwa n'obodo dị icheiche.



























