Enweghi ihe na-esere mụ na Peter Obi, ihe anyị na-eme bụ ndọrọndọrọ ọchịchị - Gọvanọ Soludo

Foto Peter Obi na Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra state
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra state akọwaala na ya na Peter Obi ji aha Nigeria Democratic Congress (NDC) azọ ọkwa onyeisiala anaghị ese okwu ma kwuo na ha abụọ nwere ezi mmekọrịta pụrụiche.

Gọvanọ Soludo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC News Igbo nwere n'Awka isiobodo state ahụ ma kọwaa na ọ bụ naanị n'ihe gbasara ọchịchị na ndọrọndọrọ ka ya na Peter Obi na-enwe nghọtahie.

Soludo kọwara na ezinaụlọ ya na Peter Obi dị na mma ma kwuo na nwunye ya mụtara nwa ha na mmiri Chukwu.

N'okwu ya, "Mụ na Peter Obi bụ ezigbo enyi. Ezinaụlọ anyị abụọ dị na mma. Nwunye ya mụrụ nwa m na mmiri Chukwu, nwunye m mụrụ nwa ya na confirmation. Mana abata n'ihe gbasara ọchịchị, nye m nke m, nye m nke m, bụ ụzụ ahịa. Ọ bụ ndọrọndọrọ ọchịchị ka a na-eme."

Soludo mere ka o doo anya na, "ebumnobi nke ya dị iche. O nwere onye o chere kwesịrị ịbụ Gọvanọ n'Anambra. Mụ onwe m na-azọkwa nụ. Ọ kwadoro onye ọ chọrọ. Mana enwetara m mmeri site n'amara Chineke. Mana ọ bụghị ihe m buuru ya n'obi.

Ọ kọwara ihe mere o jiri degara Peter Obi akwụkwọ n'afọ 2022 mgbe ọ na-akwado ịzọ ọkwa onyeisiala.

Soludo gara n'ihu kwuo, "Agwaghị m Peter Obi ọ zọla maka na ọ malitela ịzọ. Enweghị ka ị ga-esi sị mmadụ, onye ji ọkọlọtọ pati azọ onyeisiala, ị gaghị edere ya akwụkwọ si ya azọla. Ihe m kọwaara ya oge ahụ, n'ụfọdụ ihe m dere ebe asịrị m ya na ọ ga-agba onye nke atọ. N'eziokwu edekwara m sị ya na nsonye ya ga-anapụ PDP ọtụtụ vootu ma mee ka ọ dị mfe Tinubu inweta mmeri.

Ọ kọwakwara na ọ bụrụgodị na pati chọrọ i were ọchịchị na Nigeria jikọtara aka ọnụ, nke ahụ apụtaghị na ha ga-emeri pati nọ n'ọchịchị ma kwuo na nke ahụ bụ ebe mmalite.