Gịnị mere Pastor Jimmy Odukoya ji ewu dịka o gosiri ọha nwunye ọhụrụ ya?

Jimmy Odukoya na MoJasmine
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka Onye ihe ejije Nollywood a ma ama tupu ọ bụrụ pastọ bụ Jimmy Odukoya gbara n'anwụ na ọ lụọla nwaanyị ọhụrụ, ụmụ afọ Nigeria kpụ ya n'ọnụ na soshal midia..

Odukoya , onye bụzi onyeisi ụlọụka 'Fountain of Life Church, Lagos, gbara ama ahụ n'Ụbọchịụka dịka ọ kpọrọ nwunye bụ Mo Jasmine oku ka ọ pụta n''ihu ndịụka.

Ngwa ngwa Ụkọchukwu Jimmy bụ nwa ụkọchukwu abụọ a ma ama lara mmuo; Tunde Odukoya na Bimbo Odukoya gbara n'anwụ na ọ lụrụ nwaanyị ọhụrụ, ọtụtụ ụmụ Naijiria jiri ya mere isi akụkọ dịka ha na-arụtụ aka na ọ lụbuola nwaanyị, ha gbaa arụkwaghịm.

Ụfọdụ na-akatọ ya maka ịlụ nwaanyị ọhụrụ dịka onye nke ya na ya lụburu ka dị ndụ, ebe ụfọdụ na-akwado ya sị na ọ ka mma di na nwnye na-ese okwu gbasra kama otu igbu ibe ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Jimmy lụburu Kemi Banjoko n'afọ 2013 na London, onye ya na ya mụtara ụmụ abụọ tupu ha gbasaa n'afọ.

Nke yiri ibe ya bụ na nwanne ya tọrọ ya bụ Tolu Odukoya bụ onye ya na ya bụ ndị ndu ụka nne na nna ha hapụrụ nluburu di, Olumide Ijogun, mana ya gbasara n'afọ 2021.

Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Jimmy Odukoya

Jimmy Odukoya
  • A mụrụ ya n'afọ 1987 na Nigeria.
  • Nne na nna ya a bụ ndị ụkọchukwu a ma ma na Nigeria bụ Pastọ Bimbo Odukoya na Pastọ Tunde Odukoya, ndị nwe ụlọụka 'Fountain of Life Church,Ilupeju,Lagosc, tupu ha laa mmụọ
  • Pastọ Bimbo bụ ụkọchukwu nwaanyị a ma ama maka ozi metụtara mmekọrịta dị n'etiti nwoke na nwaanyị na alumdi na nwunye tupu ọ nwụrụ site na mmerụahụ sitere n'ihe mberede ụgbọelu Sosoliso n'abalị 11 nke ọnwa Disemba afọ 2005.
  • Nna ya bụ Daniel Taiwo Odukoya nwụrụ n'afọ 2023
  • Jimmy Odukoya gụrụ 'Business Administration na mahadum'Oral Roberts University bụ ebe o nwetakwara nzere 'Masters ya.
  • Onye ihe ejije, Pastọ sonyela na ọtụtụ ihe ejije gụnyere; "The Woman King," "Husband of Lagos" na "Baby Bump" wdg.