Gịnị bụ ntuliaka 'midterm' na mba America nakwa ihe mere o jiri dị mkpa?

Nwoke na-atụnye vootu n'ime igbe e ji eme ntuliaka n'America
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

N'ụbọchị 3 Nọvemba 2026, a ga-enwe ụfọdụ ntuliaka dị mkpa na America (US).

Ntuliaka ndị a agaghị ekpebi onye ga-abụ onyeisiala. N'agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta, Onyeisiala Donald Trump ka ga-anọ n'oche ọchịchị.

Maka ọtụtụ ndị America na-atụ vootu, nke a bụ ohere iji gosi ihe ha chere banyere etu Onyeisiala Trump si arụ ọrụ, nakwa etu ha si ele otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ Republican Party anya.

BBC Newsround gwara ụfọdụ ụmụaka bi n'America okwu iji mata ụfọdụ nnukwu nsogbu na isiokwu ndị mmadụ na-atụle tupu ntuliaka etiti oge (midterm elections) a.

Gịnị bụ ntuliaka etiti oge (midterms)?

Onye ntaakụkọ BBC yi uwe na-acha akwụkwọ ndụ nọrọ n'ihu ụlọomeiwu mba America bụ 'Capitol building'
Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ BBC bụ Nada Tawfik gwara ndị America ajụjụọnụ n'isi ụlọomeiwu mba America, ebe a na-eme iwu mba ahụ

Onye ntaakụkọ BBC na mpaghara North America bụ Nada Tawfik kwuru "na ntuliaka etiti oge (midterms) dịka ihe ga-ekpebi ụzọ obodo a ga-esi gawa n'afọ abụọ na-abịa, ruo mgbe a ga-enwe ntuliaka onyeisiala ọzọ n'afọ 2028".

Ntuliaka etiti oge a bụ maka ịhọpụta ndị na-eme iwu n'obodo, nke a na-akpọ ụlọomeiwu, bụ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Republican Party na-achịkwa ugbua.

Otu Democratic Party, nke na-ama ndị Republican aka, na-atụ anya inwetaghachị ọchịchị ụlọomeiwu ahụ. Ọ bụrụ na ha mee nke a nke ọma, ọ ga-ebelata ikike Onyeisiala Donald Trump nke ukwuu.

Ọ bụrụ na ndị Democrat merie ma nweta ọchịchị ahụ, o nwereike isiri Onyeisiala Trump ike ịkwado ma mee ka ụfọdụ iwu ọ chọrọ gafee n'ụlọomeiwu.

Kedụ nnukwu nsogbu dị na ntuliaka etiti oge n'America?

Ụmụaka abụọ na-achị ọchị n'ihu onyonyo na-akparịtaụka ihe onyonyo
Nkọwa foto, Caston (akaekpe) na Catniss bi na Texas nke America, ha gwara Emma-Louise okwu banyere uche obi ha

Nye ụmụafọ America bụ Caston na Catniss dị afọ 11, ọnụahịa mmanụ ụgbọala maọbụ gaasị bụ otu n'ime isiokwu kachasị ndị mmadụ na-ekwu ugbua.

Caston kwuru na "ndị mmadụ na-ewe iwe," ebe Catniss kwuru na "ị nwereike ịnụ ka ndị nkuzi na-ekwu maka ya ọbụna site n'otu akụkụ ụlọakwụkwọ ruo n'ọzọ."

Ọnụahịa mmanụ ụgbọala arịgoola elu nke ukwuu n'afọ a n'ihi agha dị n'etiti America na Iran, ọtụtụ ndị na-atụ vootu na-ata Onyeisiala Donald Trump ụta.

Catniss, onye na-akwadoghị Onyeisiala Trump, kwuru na " ọ naghị eme ihe ọbụla iji belata ọnụahịa mmanụ ụgbọala maọbụ ọnụahịa ihe ndị ọzọ." O kwuru na "ọnụahịa ihe niile arịgoola elu karịa ka ọ dị mbụ."

Mana Caston, onye na-akwado Onyeisiala Trump, kwenyere na ọ na-agbalịsi ike ime ka ọnụahịa ihe daa, "ka mmadụ niile nwee ike ịzụta ihe ha chọrọ ka agụụ ghara ịgụ ndị mmadụ."

Nwoke na-agbanye mmanụ ụgbọala n'ime ụgbọala
Nkọwa foto, Ndị America na-enwe nsogbu ọnụahịa mmanụ ụgbọala ịrị elu

Isiokwu ọzọ dị mkpa ndị na-atụ vootu na-ekwu maka ya bụ mbata ndị si mba ọzọ. N'okwu a, Catniss na Caston nwere echiche dị iche iche.

Caston kwuru:

"Echere m na [Onyeisiala Trump] arụọla ezigbo ọrụ n'ihi na ọ na-echekwa okeala anyị nke ọma ka ndị mmadụ nwee nchekwa, nakwa ka o chekwaa obodo anyị.

Ụfọdụ ndị mmadụ ekwesịghị ịnọ ebe a n'ihi ụfọdụ ihe maọbụ ha batara n'obodo a n'enweghị ikike iwu kwadoro."

Ma Catniss kwuru na "[Onyeisiala] Trump emebeghi nke ọma ma a bịa n'okwu ahụ."

"Na mbụ America bụ obodo ebe mmadụ niile nwere ike ịbata, ma anyị niile abụrụ ndị America ọnụ. Ugbua, ọ na-eme ka okwu a bụrụ nnukwu nsogbu karịa ka ọ kwesịrị ịdị."