Ndị agboro awakpoola 'convoy' Peter Obi na Calabar

Rabiu Kwankwaso na Peter Obi Nke NDC
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụfọdụ ndị mmadụ merụrụ ahụ dịka ndị agboro ndọrọndọrọ ọchịchị wakporo ụgbọala so onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka 2027 n'aha otu NDC bụ Peter Obi dịka ọ gara Calabar, isiobodo,Cross River State.

Obi na Osote ya bụ Rabiu Kwankwaso gara Calabar maka ọgba obodo nke pati ha n'ụlọnkwari dị nso n'amaegwuregwu' U.J. Esuene Stadium'.

Tigbuo-zọgbuo dapụtara nke na ọ bụrụ na ọ bụghị ndị uweojii, nnukwu ihe ndapụta kara ime dịka ndị nkwado otu APC gara ime ngarị okporo na nso ebe ndị NDC nwere ọgbakọ, zutere ndị nkwado NDC.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ndị ntorobia bu mma na ihe mmerụahụ ndị ọzọ wakpoo otu ụgbọala n'ime ụgbọala ndị achụmtavootu Peter Obi oge ha gara n'obi Obong nke Calabar, ebe ihe onyonyo ọzọ nke onye enyemaka Peter Obi bụ Esther Umo wepụtara gosiri nwoke na-ebe ma gosi ebe mkpọ egbe tipuru aha ya ma merụọ ya ahụ n'ụkwụ.

N'okwu ya banyere ihe mere, Peter Obi boro ebubo sịrị, "Ndị APC na-atụ okwute nke mere ka ụfọdụ ndị mmadụ gbaghachi azụ. Ndị nchekwa mụ na ha so sị ka anyị soro ụzọ ọzọ, ma a asị ha, na Nigeria nke a? Aga m arịte ka anyị ga zute ha. Oge ha hụrụ ihe na-eme, ha apụwa."

Akụkọ na-abịa