Junior Ezeonu, Carol Kazeem, Owolewa na ụmụafọ Nigeria ndị ọzọ meriri na ntuliaka ụlọomeiwu America

Ebe foto si, Other
Mba America mere ntuliaka n'ụbọchị Tuzde 3 Nọvemba 2026 iji họpụta ndị omeiwu ha nke gụnyere ndị Sineti na ndị ụlọnnọchiteanya.
Mpụtara ntuliaka ahụ gosiri na ndị otu Democratic Party meriri ọtụtụ oche ọchịchị n'ụlọomeiwu ahụ karịa ndị ogbo ha ndị otu Republican bụ pati Onyeisiala Donald Trump.
Na ntuliaka ahụ, ụfọdụ ihe ndị a tụghị anya ya mere nke gụnyere etu ụmụafọ Nigeria na ndị isi ojii ọzọ si nwete oche ọchịchị n'ụlọomeiwu mba America.
Ụmụafọ Nigeria karịrị mmadụ iri nwetere oche ọchịchị ịnọchiteanya mpaghara America dị iche iche n'ulọomeiwu mba ahụ dịka Maryland, Texas, Washington DC, Pennsylvania, Georgia na ebe ndị ọzọ
Ụfọdụ ndị a gụnyere;
Will Jawando, Junior Ezeonu, Oye Owolewa, Carol Kazeem na Segun Adeyina bụ ndị zọrọ ọkwa ọchịchị n'aha otu Democratic Party.
Will Jawando

Ebe foto si, Will Jawando/Facebook
Jawando meriri na ntuliaka ọkwa onyeisi ọchịchị Montgomery County dị na Maryland dịka o meriri Esther Wells nke Republican Party.
Ọbaozi gọọmenti Montgomery County kpọpụtara Jawando dịka onye a họpụtara ịbụ onyeisi ọchịchị ọhụrụ ha.
Jawando bụ onye si na mpaghara Montgomery County Council. O nwere mgbọrọgwụ na Nigeria dịka nna ya bụ nwafọ Nigerie ebe nne ya bụ onye America.
Junior Ezeonu

Ebe foto si, Junior Ezeonu/facebook
Na Texas State, Junior Ezeonu, onye dị afọ iri abụọ na asaa (27), nwetara oche ọchịchị n'ụlọnnọchiteanya nke steeti ahụ maka District 101 mgbe o meriri Chris Turner onye nọbụ n'oche ahụ mbụ.
Ezeonu bụ naanị onye zọrọ oche ọchịchị na ntuliaka ahụ n'ihi na o nweghi onye otu Republican pụtarae ịzọsị ya ọkwa.
Ọ bụ nwafọ Nigeria a mụrụ n'Onitsha nke Anambra State mana ọ gara Texas, mba America mgbe ọ dị afọ abụọ.
A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye otu Grand Prairie City Council n'afọ 2021, ma mechaa bụrụ onye kachasị nta n'afọ ịbụ osote onye isi obodo (mayor pro tempore) nke obodo ahụ.
Carol Kazeem

Ebe foto si, Carol Kazeem/Facebook
Nwada Carol Kazeem bụ onye otu Democratic Party meriri ọzọ n'oche ọchịchị n'ụlọnnọchiteanya Pennsylvania State ịnọchiteanya mpaghara 159 na ntuliaka.
Kazeem so n'ime ụmụafọ America nwere agbụrụ na Nigeria meriri oche ọchịchị n'ụlọomeiwu etiti America n'afọ 2022.
Oye Owolewa

Ebe foto si, Oye Owolewa/Facebook
Na Washington DC, Owolewa meriri otu n'ime oche ndị nnọchiteaanya obodo niile (at-large seats) na mpaghara Columbia Council.
Owolewa, onye na-arụ ọrụ ọgwụ (pharmacist) bụ nwa nne na nna ya si Kwara nakwa Osun State ma kwaga n'America.
Ọ rụrụ ọrụ mbụ dịka onye nnọchiteanya ndọ (shadow representative) nke mpaghara Columbia. Ọkwa na-achọ ka mpaghara Columbia bụrụ state zuruoke mana o nweghi ikike ịtụ vootu n'ụlọomeiwu America.
Segun Adeyina

Ebe foto si, Segun Adeyina
Adeyina, onye a mụrụ na Nigeria ma bụrụkwa onye otu Democratic Party, meriri ntuliaka ọzọ iji laghachi n'ụlọomeiwu state Georgia.
A họpụtara Adeyina mbụ n'ụlọomeiwu Georgia n'afọ 2022 ma na-anọchi anya akụkụ ụfọdụ nke Gwinnett County.
Ọ bụ onyeisi nchịkwa 'Nigerian American Public Advisory Committee', otu na-arụ ọrụ n'ịkụziri ndị mmadụ gbasara ntuliaka na idenye aha ndị si mba ọzọ bi n'America ka ha nwee ike ịtụ vootu.
Gabe Okoye nke Democratic Party meriri ntuliaka ịlaghachi n'ụlọomeiwu steeti Georgia, ebe ọ na-anọchite anya District 102.
Ndị ọzọ meriri na ntuliaka ịlaghachi n'ụlọomeiwu bụ:
Tish Naghise, Phil Olaleye, Solomon Adesanya na Esther Agbaje.




























