Enugu Air: Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ dịka ụgbọelu a ga-amalite isi Lagos fega London

Enugu Air
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ njem ụgbọelu 'Enugu Air amala ọkwa na malite n'abalị mbụ nke ọnwa Disemba afọ 2026, na ha ga-amailite ibu ndị njem si Lagos gaa London.

Okporo ọhụrụ ahụ nke mepere ha ohere ị na-efega mba ofesi na-abịa na mmezu dịka ụlọọrụ ụgbọelu ahụ na ụlọọrụ Omni-Blu Aviation(OBA) nwere nkwekọrịta.

Ozi ha wepụtara n'akara ọbaozi ha na X kwuru sị, "Anyị ji obiụtọ na-ekwupụta na enyela anyị nkwado isi Lagos gaa LondonGawwick site na nkwekọrịta dị n'etiti Enugu Air na Omni-Blu Aviation(OBA).."

Mana dịka ụfọdụ na-anụrị ma na-eto na nzọpụ ụkwụ Gọọmentị Enugu state bụ dị nwe ụgbọelu ahụ maka ịkwalite steeti ahụ site na ụkwụ a ha zọpụrụ, ụfọdụ ndị ọzọ na-ajụ ihe mere na ụgbọelu ahụ esighị Enugu aga London.

Onye kpọrọ onwe ya Nigeria Arise n'ọbaozi X ji ụlọọrụ ụgbọelu Ethiopia Airlines na British Airways(BA maa atụ kwuru na ụlọọrụ ndị si ebe ọbụla aga ebe ha jiri mere aha ụgbọelu ha.

'Enugu Air kwesịrị ịbụ isi ebe niile fega Enugu. Ịkwụsị n'ebe ọzọ abụghị enugu pụtara na ọ bụghịzị Enugu Air."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ịnnọcent Chukwudubem kwuru na obi bụ ya sọ ụtọ oge ọ nụru akụkọ ahụ mana oge o leruru anya ala hụ ebe ụgbọelu ahụ ga-esi efebụ abụghị Enugu, o jụọ ya oyi.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2