Democrats emeriela Republican ma kpokọrọ oche ọchịchị n'ụlọomeiwu mba America

Ndị mmadụ na-enwe aṅụrị maka mmeri ndị Democrats nwetere na ntuliaka ụlọomeiwu mba ahụ
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Democrats ekpokorola ọtụtụ oche ọchịchị n'ụlọomeiwu mba America karịa ndị Republican bụ ndị otu Onyeisiala Donald Trump.

Nke a bụ akụkọ ihe na-emetụbeghi na mbụ nye pati Republican, ebe ọtụtụ ndị Democrats arọtụbeghi ya na nrọ na nso nso a.

Onyeisiala Trump ewerela ọnụ ya kwupụta na ụlọntaakụkọ Fox News na "ndị Democrats mere ọfụma" – ma kwuo na ọgụ ha na Ịran na mbuli elu ego mmanụ ụgbọala so n'ihe mere ha jiri daa.

N'ụlọomeiwu Sineti, ndị Democrats meriri n'ụfọdụ ebe ndị Republican gbara mgbọrọgwụ nke gụnyere Texas, Ohio na Kansas – bụ ebe a họpụtabeghi onye Democrats kamgbe ihe ruru afọ 100 gara aga.

Dịka ha weere ọkwa kachasị n'ụlọomeiwu mba America, ndị Democrats nwereike ịkpagbu atụmatụ Onyeisiala Trump n'ime afọ abụọ fọọrọ ya maọbụ gbaa mbọ ịchutu ya nke ugboro atọ.

Ụfọdụ mmeri dara ụda na ntuliaka ahụ

Mmeri Adam Hamilton meriri na Kansas bụ nke mbụ ndị Democrat ga-emeri na Sineti kamgbe afọ 1932.

James Talarico bụ onye Democrat mbụ ga-emeri n'ọkwa Sineti na Texas kamgbe afọ 1988.

Annie Andrews meriri na South Carolina ma bụrụ nke mbụ ndị Democrats ga-emeri ọkwa Sineti kamgbe afọ 1998.

Ndị Democrat atụgharịala ọkwa Sineti na Maine nke Troy Jackson meriri bụkwanụ Susan Collins nke Republican jiri ọkwa ahụ kamgbe ihe chụwara afọ 30.

Ụfọdụ ụmụafọ America nwere agbụrụ na Nigeria meriri na ntuliaka ahụ

Ụfọdụ ụmụafọ America nwere agbụrụ na Nigeria meriri na ntuliaka ụlọomeiwu mba America

Na ntuliaka ahụ, e nwere ọtụtụ ndịisi ojii si mpaghara Africa nakwa Nigeria nwetere oche ọchịchị n'ụlọomeiwu mba America.

Ụfọdụ n'ime ha gụnyere;

Will Jawando nke Democratic Party meriri na ntuliaka ịbụ onyeisi ọchịchị Montgomery County na steeti Maryland.

Junior Ezeonu nke Democratic Party meriri na ntuliaka ịbanye n'ụlọomeiwu steeti Texas, ebe ọ ga-anọchite anya District 101. A mụrụ ya n'Onitsha, Anambra State.

Oye Owolewa nke Democratic Party meriri ntuliaka ịbụ onye otu kansụl ọchịchị District of Columbia (Washington DC).

Carol Kazeem nke Democratic Party meriri na ntuliaka ịlaghachi n'ụlọomeiwu steeti Pennsylvania, ebe ọ na-anọchite anya District 159.

Gabe Okoye nke Democratic Party meriri ntuliaka ịlaghachi n'ụlọomeiwu steeti Georgia, ebe ọ na-anọchite anya District 102.

Ndị ọzọ meriri na ntuliaka ịlaghachi n'ụlọomeiwu bụ:

Segun Adeyina, Tish Naghise, Phil Olaleye, Solomon Adesanya na Esther Agbaje.