Fifa U17 Women's World Cup: Nigeria emeriela Japan ma turu ugo nke mbụ mba Africa ọbụla

Flamingos of Nigeria
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Otu egwu bọọlụ Flamingos Nigeria emeriela mba Japan n'asọmpi ikpeazụ n'asọmpi bọọlụ Iko mbaụwa nke ụmụnwaanyị na-erubeghị afọ 17 ma ma bute iko asọmpi ahụ.

Nigeria ji goolu abụọ a satara otu merie mba Japan n'asọmpi ikpeazụ ahụ kpọtụrụ n'ama egwuregwu Mohammed VI Football Complex dị na Rabat, Morocco.

Ka ọ dị ugbua, Nigeria bụ mba mbụ ụmụnwaanyị bọọlụ na-erubeghị afọ 17 na-eruru ugo n'asọmpi Iko mbaụwa ụmụnwaanyị na-akarịbeghị afọ 17.

Nke a bụ foto mgbe Nigeria zutere mba Mexico na FIFA U17 ụmụnwaanyị na 
RABAT, MOROCCO.