Mkpebi ụlọikpe ịchụpụ David Mark emetụtara Atiku Abubakar?

Aha onyonyo, Akụkọ maka ụlọikpe dị elu chụpụrụ David Mark dịka onyeisioche otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị African Democratic Congress, ADC.
Mkpebi ụlọikpe ịchụpụ David Mark emetụtara Atiku Abubakar?
Mgbe e biputara ya

Dịka ụlọikpe ukwu dị n'Abuja chụrụla David Mark n'ọrụ dịka onyeisioche pati African Democratic Congress (ADC) ma kagbuo ihe niile pati ahụ merela iji sonye na ntuliaka na-abịa n'afọ 2027, ajụjụ dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ, kedụ etụ mkpebi a ga-esi metụta Atiku Abubakar dịka onye ga-eji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2027?

Ọkaiwu Luka Musa Haruna so na ndị ọkaịwụ wepụrụ okwu ahụ n'ụlọikpe kọwara na mkpebi a pụtara na pati ADC agaghị enwe ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa ọbụla n'afọ 2027.

Ọzọkwa bụ na Atiku Abubakar na ndị ọzọ niile ji ọkọlọtọ pati ahụ na-azọ ọkwa akụọla afọ n'ala ma ọ bụrụ na mkpebi ahụ guzoro.

Cheta na ọ bụ nwaamadị a na-akpọ Nafiu Bala Gombe bụ onye gbara akwụkwọ wegara okwu ahụ n'ụlọikpe.

Gombe kwuru na David Mark abụghị onyeisi oche otu Pati ADC kama na ọ bụ ya onwe ya kwesiri ịbụ onyeisioche pati ahụ dịka Ralph Nwosu bụbu onyeisioche ha gbara arụkwaghịm.

Ọ gwara ụlọikpe ka ọ machie David Mark na Aregbesola bụ odeakwụkwọ ADC ikwu na ha bụ ndịisi pati ADC.