Simon Ekpa: Ihe 10 akwụkwọ Ụlọikpe Mkpegharị Finland kwuru maka mkpebi ha nyere

Ebe foto si, Simon Ekpa/X
Ụlọikpe mba Finland ekwuola na mpụ Simon Ekpa mere e ji tụọ ya mkpọrọ na mba ahụ yiri nke e mere n'onọdụ agha.
Akwụkwo Ụlọikpe nke BBC News Igbo natara Ụlọikpe Mkpegharị nke Finland (Eastern Finland Court of Appeal) na nso nso a kwuru sị: " Ụlọikpe Mkpegharị kwudosiri ike na ikpe ụlọikpe mpaghara bụ 'Päijät-Häme District Court' mara Ekpa n'afọ 2025 maka mpụ iyi ndụ egwu."
"Mpụ Ekpa mere bụ ihe e mere n'ọnọdụ dịka ebe a na-alụ agha."
Akwụkwọ ikpe ahụ gara n'ihu kwuo na: "E wetuola ntaramahụhụ ya site n'afọ isii ruo afọ anọ n'ụlọmkpọrọ."
Ọzọ bụkwa na "Ọ ka ga-anọ na mkpọrọ."
Akwụkwọ ikpe ahụ nke ọkaikpe 'District Judge Heidi Myllys' goskwara na ụlọikpe ahụ dakwara Ekpa nha dị iche iche gụnyere EUR 29,549.07 bụ ụtụisi maka mpụ o mere.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Cheta na ọ bụ n'abalị 15 nke ọnwa Oktoba afọ 2026, Ụlọikpe Mkpegharị nke mba Finland belatara afọ ole Ekpa nwere ịnọ n'ụlọmkporo maka iyi ọha egwu site na afọ isii e nyeburu ya gbatuo afọ anọ mana ụlọikpe ahụ kwuru na ọ ka mara ya ikpe dịka ụlọikpe nke obere maburu ya.
Chetakwa na ụlọikpe mara ya ikpe maka iyi ọha egwu nakwa ibute tigbuo-zọgbuo n'Ọwụwa Anyanwu Nigeria site n'ozi ọ na-ezipu na soshal midia.
Dịka BBC News Igbo degara ụlọikpe ahụ akwukwo ozi iji nata akwụkwọ mkpebi ikpe ahụ, lee ihe iri gbara ọkpụrụkpụ dị n'akwụkwọ ikpe ahụ rutere anyị aka na nso nso a:

Ebe foto si, Simon Ekpa/X
1. Ụlọikpe kwusiri ike n' ikpe a maburu Simon Ekpa maka ebubo ịkpalite iyi ndụ ọha egwu ma isonyekwa n'ihe otu na-eyi ndụ egwu.
2. Ụlọikpe nabatara na Ekpa mere ihe nke a dịka "Praịm Minista gọọmenti gbara ọsọ ndụ" 'prime minister of the refugee government', na onye so na ndị isi agha ,"Biafra armed forces".
3. Ekpa gọrọ sị na nsogbu dị n'Ọwụwa Anyanwụ Nigeria bụ ihe Bekee kpọrọ "non-international armed conflict (NIAC)" maọbụ agha imeụlọ(Civil War), na ọ bụghị iyi ndụ egwu mana ụlọikpe anabataghị nke ahụ.
4. Ekpa gọrọ na ya esonyeghị maọbụ gbalia isonye n'otu Ipob kemgbe a nwụchiri Nnamdi Kanu. Ọ gọkwara na ya akpọghị onwe ya onye na-anọchi Nnamdi Kanu n'ọkwa(sucessor).
5. Ụloikpe ahụ hụrụ ihe yiri ọgụ e ji ngwaagha alụ dịka ha hụrụ ihe akaebe na ndịagha Nigeria ji 'ụgbọ agha (assault tanks), helịkọpta e ji alụ agha na ngwagha ndị ọzọ ha ji lụsoo ndị otu nnwereonwe ọgụ.
6. Mana ụlọikpe ahụ kwuru na tigbuo-zogbuo mere erughị nke agha dịka o si dị n'iwu mba ụwa dịka mwakpo ndị ahụ bụ ọ nọkata o mee, ọ dịteghị aka.
7. Ndị ọkaikpe ahụ kwuru na mwakpo otu tigbuo-zogbuo nke ha na Ekpa na-arụkọ bụ ịwakpo ogige ndị uweojii maọbụ ebe nkwụsị ha n'okporoụzọ 'checkpoint' n'olu Bekee ka ha na-emekarị, na ha emelighị nke ibu agha ogologo oge.
8. Ihe ọzọ ha ejighị nabata okwu Ekpa kwuru bụ na ọ bụ agha bụ na e nweghị igwe mmadụ gbara ọsọ ndụ dịka ọ na-adị n'agha, na "o nweghị ndi mwakpo ndịagha chụpụrụ na be ha n'ụzọ purụ iche" na mpaghara ahụ.
9. N'agbanyeghị na ụlọikpe ahụ jụrụ ịnabata ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ dịka agha, o kwetara na ihe Ekpa mere n'ọnọdụ ahụ yiri ihe na-eme n'oge ọgụ nke gụnyere, "mmadụ ịzọ onwe ya ma ọ dị na mkpa".
10. Ọ bụ n'ebe ahụ ka ụlọikpe ahụ guzoro were belata afọ ole e nyeburu ya ịnọ n'ụlọikpe. Ọ bụ n'ihi nke a ka ụlọikpe ahụ ji wetuo afọ ole ọ gara anọ site na afọ isii rituo afọ anọ ma kwuo kpọmkwem na mkpebi ahụ "apụtaghị na ụlọikpe nyere iwu ka a tọhapụ ya."































