A tụọla onye mgbasaozi ọma Paul Mackenzie mkpọrọ afọ 200 maka ogbugbu ụmụaka 190

Paul Mackenzie onyeisi ụlọụka 'Good News International Ministries' otu okpukperechi o hiwere n'afọ 2003.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe Ukwu dị na Mombasa nke mba Kenya amaala onye ụkọchukwu Paul Mackenzie ikpe ma tụọ ya nga afọ narị abụọ (200years).

A tụrụ Mackenzie na mmadụ 28 ndị ọzọ mkpọrọ maka igbu ọchụ metụtara ụmụaka 190 na otu okenye.

Ọkaikpe Diana Kavedza kwuru na ntaramahụhụ a bụ ihe kwesịrị Mackenzie maka agwọ ọjọọ ọ kpasịrị ụmụaka 190 ahụ nwụrụ anwụ.

A tụkwara ndị otu ya mmadụ 28 mkpọrọ malite n'afọ 10 ruo afọ 160 maka ọrụ dị iche iche ha rụrụ n'otu okpukpere ya.

Nwoke a bụ onye mere onwe ya ụkọchukwu gwara ndị na-eso ụzọ ya ka gwaga n'ime ọhịa Shakahola bụ ebe e mechara hụụ ozu ọtụtụ ha n'ime ili na-emighi emi.

Ntaramahụhụ a bụ nnukwu ihe n'usoro ikpe mpụ metụtara ọnwụ ndị mmadụ mere n'ime ọhịa Shakahola dị na mpaghara Kilifi bụ nke tụrụ mba ahụ n'anya n'afọ 2023

N'ụbọchị 19 Ọktoba 2026, ka Ọkaikpe Kavedza mara mmadụ 29 ikpe na ha mere mpụ igbu ọchụ n'ọnụ ebubo 191 e boro ha.

Ụlọikpe ahụ kpebiri na ndị ọkaiwu gọọmenti gosipụtara ikpe ahụ nkeọma ma gosipụta ihe akaebe na-enweghị obi abụọ nke doro anya na ndị e boro ebubo mere mpụ ahụ.

Onyeisi na-ahụ maka ikpe Ọha (ODPP) rịọrọ ụlọikpe ka ọ maa Mackenzie ikpe ọnwụ. Ha kwuru na oke mpụ a na ajọọ omume ndị ahụ mere kwesịrị ụdị ntaramahụhụ kachasị ike nke iwu kwadoro.

Otu n'ime ndị a mara ikpe bụ Enos Amanya Ngala, kwetara na ya mejọrọ n'ihe gbasara mpụ igbu ọchụ 191 ahụ niile, ma ụlọikpe mara ya ikpe dabere n'ihe o kwetara n'onwe ya.

Kedu ka o si mee?

Paul Mackenzie yi uwe ohie nwere akara ojii na ọcha e ji

Mackenzie manyere ndị otu ya n'ike ibu ọnụ ma nye ha iwu ka ha hapụ ụmụ ha ka agụụ gbuo ha ka ha nweeike izute Jesus.

Mgbe ụmụaka ndị ahụ nwụsịrị, e liri ha n'ili ndị na-adịghị omimi n'ime ọhịa Shakahola, nke dị nso n'ụsọ oke osimiri Kenya, ebe Mackenzie na-edu ndị na-eso ụzọ ya si mpaghara dị iche iche nke mba ahụ abịa.

Mackenzie bụ onye ndu ụlọụka 'Good News International Ministries' otu okpukperechi o hiwere n'afọ 2003.

Ozizi otu Mackenzie machibidoro agụmaakwụkwọ iwu ma kọwaa ọgwụgwọ nke ọgbara ọhụrụ dịka ihe ọjọọ.

Ndị na-eso ụzọ ya na-efe ofufe n'ọhịa Shakahola, ọtụtụ n'ime ha anaghị alaghachi n'ụlọ ha ọzọ.

E jidere Mackenzie n'afọ 2023 mgbe a chọtara ihe karịrị ozu mmadụ 400 n'ili ndị na-adịghị omimi n'ime ọhịa Shakahola.