Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ihe butere nsogbu ọkụ latrịk ugbua na Nigeria - Minister of Power
Joseph Olasunkanmi Tegbe bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ latrịk na Nigeria enyela nkọwa maka ihe butere ọnọdụ ọkụ latrịk na-ada mba ugbua na Nigeria.
Olasunkanmi Tegbe nyere nkọwa ahụ n'akara X soshal midia ya n'abalị asaa nke ọnwa Nọvemba 2026 ma kwuo na ha na-agba mbọ idozi ihe mebiri.
N'okwu ya "amaara m ahụhụ ọnọdụ enweghị ọkụ latrịk tinyere ọtụtụ ezinaụlọ nakwa ndị na-azụahịa na steeti anọ nke a na-eme ugbua nakwa Lagos state na Abuja".
"Ọ bụ ihe anyị kwadoro imezi n'ebe nkese ọkụ latrịk bụ 'Egbin Power Station' nakwa ọgbatauhe anyị na-enwe banyere ikuku mmụọ 'gas' n'ọtụtụ 'thermal power station' so butuo ọkụ latrịk anyị na-ekese site na 'National Grid'.
Ọ sị na 'National Grid' na-atụke ọkụ latrịk atụke na mpaghara dị icheiche mana nsogbu ọzọ ha nwere bụ ndị na-ezuru akụrụngwa nakwa ụdọ ọkụ latrịk na Lagos state bụ nke butere e ji achọ ụzọ ọzọ ọkụ latrịk ga-esi abịa na Lagos.
Tegbe kwuru na ya na ndị ọrụ ya na-agba mbọ ime ka ọkụ latrịk lọghachite na mpaghara dị icheiche.
Ọ sị na ọtụtụ ga-enwe ọkụ latrịk bido ugbua ruo awa iri anọ na itoolu maọbụ awa asaa na abụọ na-abịa abịa.
"Anyị na ndị na-ebutere anyị 'gas' na-akpakwa, ọzọ bụ na anyịna-agba mbọ imezi akụrụngwa nakwa ụdọ ọkụ latrịk e mebiri" ka Tegbe kwuru.