Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Etu ị ga-esi e ji ekwentị gị ebite ego n'aka Gọọmentị Etiti
Gọọmentị Etiti amapụtala atụmatụ ga-enye ụmụ Nigeria ohere ibite ego maka ịzụ ihe ndị dị oke mkpa dịka nri, ọkụ latrik na ụmụ kịrịkịrị ihe ndị ọzọ site n'ekwentị ha.
Site n'atụmatụ a kpọrọ, 'Spark' nke ụlọọrụ 'Nigerian Consumer Credit Corporation' bụ ndị a makwa dịka 'CrediCorp' na-ahazi, mmadụ nwereike inweta mgbazinye ego site n'akara USSD na-ejighị nnukwu ekwentị maọbu data.
Dịka ụlọọru ahụ siri kwuo, atụmatụ ahụ ga-enye ohere ka ndị na-agbaziribeghi ego na mbụ nwee ohere ịgbazite ego.
Etu ị ga-esi agbazite ego 'Spark'
Dịka Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Ụzọ Nwagbala, si kwuo n'ozi ha wepụtara n'akara ọbaozi ha na X, atụmatụ ahụ bụ ohere ndị mmadụ ibite ego ọmụrụnwa ya pere mpe iji gboo mkpa ezinaụlọ dịka nri, ọkụ sola nakwa ihe ndị ọzọ.
Ha na-emeli nke a site n'ịpị akara *347*333# n'ekwentị ha.
Lee usoro asatọ ị ga-eso iji nweta ohere mbite ego a:
1. Pịa akara *5120# n'ekwentị iji debanye aha gị maka mbite ego ahụ
2. Nabata iwu na usoro so ya nke Bekee a kpọrọ, 'Terms and Conditions'.
3. Tinye akara anọ ikpeazụ nke akara BVN gị
4. Tinye akara anọ Bekee kpọrọ PIN ị chọrọ iji agbape maọbu gbachie ihe ọbụla iji USSD gị eme
5. Họrọ ụdị mbibi ego ị chọrọ.
6. Lee ma nabata iwu nakwa usoro so ya
7. Binye aka n'akara ụlọakụ gị dịka ọ dị n'ihu ekwentị gị
8. Ị ga-enweta ozi n'ekwentị gị ma nweta ego ibiri n'ime nkeji abụọ maọbụ ise.
Kedụ ndị tozuru inweta ịgbazite ego gọọmentị a?
- Onye na-arụ ọrụ oyibo ma nke steeti ma nke Gọọmenti Etiti maọbụ ọrụ nkuzi maọbụ orụ yiri ọrụ ndịagha.
- Ị ga-adị agbata afọ 22 na afọ 58.
- Ị ga-eweta akwụkwọ gosiri na ijighị ụgwọ n'aka ụlọọrụ 'Credit Bureau Nigeria'
- Ị ga-enwe akara 'Bank Verification Number' a ma dịka BVN.
- Ị ga-abụ onye nọrọla ọnwa atọ ebe ị na-arụ ọrụ ma bụrụkwa onye anọbeghị karịa afọ 34 .
- Aha ụlọọrụ gị ga-adị n'aha ụlọọrụ gọọmentị kwadoro isonye n'atụmatụ a
- Ụlọọrụ CrediCorp ga-ama ego ole ị na-eri n'ụgwọọnwa