Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Etu e si tụnye Doris Ogala na-azọrọ AAC ọkwa Gọvanọ Abia state na mkpọrọ
Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị na Lagos atụnyere onye ihe ejije Nollywood mabụrụkwa onye na-azọ ọkwa gọvanọ Abia steeti n'okpuru otu AAC bụ Doris Ogala Umezuruike na mkpọrọ n'ụbọchị Wenezde.
A tụnyere Ogala n'ụlọmkpọrọ maka ebubo metụtara iji ịntanet emekpa ụkọchukwu a ma ama nwe ụlọụka 'Mountain of Liberation and Miracles Ministries' bụ Chris Okafor ahụ nke Bekee kpọrọ 'cyberbulling' nakwa ịgbalị ịnapụta ụkọchukwu ahụ ego.
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka Ogala bụ akpa n'isi na-agụ egwu sị, "Revolution Dey!"
"E ji iwu emigide obere mmadụ. Anaghị atụ egwu ị ga mkpọrọ. Aga m apụta."
Ụlọọrụ Ọkaiwu nke Lagos state na-ebo ya ebubo na o ji foto ọtọ nakwa ozi intanet eyi ụkọchụkuw ahụ egwu.
Dịka a kpurụ ya ụlọikpe, ọkaiwu nke steeti bụ Tolulope Mokolu, gwara ụlọikpe na Ogala ma ụma gbaa foto ọtọ Ụkọchukwu Okafor n'anwụ n'ọbaozi soshal midia intanet na anataghị ya ikike n'agbata ọnwa Septemba afọ 2024 na Maachị afọ 2026.
Mana Ogala gọrọ sị na ikpe amaghị ya n'ebubo ahụ.
Akụkọ ka na-abịa