Lee iwu ọhụrụ e wepụtara maka ndị mbịarambịa chọrọ ibi na UK ruo ebighi ebi

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gọọmenti UK ekwuola na ndị mbịarambịa agaghịzi enweta ikike ibi na UK ruo mgbe ebighị ebi naanị n'ihi na ha biri afọ ise. Ugbua, mmadụ ga-enweta ikike ahụ dabere n'ọrụ ọma ya, ego ọ na-akpata, na àgwà ya.

Ndị na-akpata nnukwu ego ga-enwe ike nweta ikike obibi ahụ mgbe afọ atọ gachara.

Ndị na-akpata karịa nde paụnds iri ise (£50,27) kwa afọ, tinyere ụfọdụ ndị ọrụ ọha dịka ndị dọkịta, ndị nọọsụ na ndị nkuzi, ga-enweta ya mgbe afọ ise gachara.

Ndị ọzọ ga-eche ruo afọ iri.

Ndị mebiri iwu mbata na ọpụpụ nwereike ichere ruo afọ 20 maọbụ karịa.

Tupu mmadụ enweta ikike obibi ruo ebighi ebi, ọ ga-eme ihe ndị a:

  • Enweghị akụkọ mpụ ọbụla.
  • Na-asụ Bekee nke ọma.
  • Enweghị ụgwọ ọbụla o ji gọọmenti maọbụ ndị na-akwụ ụtụisi.
  • Na-atụnye ụtụ National Insurance mgbe niile.

Maka ndị ọrụ nlekọta mmadụ (care workers), gọọmenti kwuru na n'ihi ọrụ ọma ha rụrụ n'oge ọrịa COVID-19, ndị gbasoro iwu visa ha ma na-akpata opekatampe £25,000 kwa afọ, ga-enwe ike nweta ikike obibi mgbe afọ ise gachara.

N'ihi na ụfọdụ ụlọọrụ ji usoro a gwuo ndị mmadụ chandum, gọọmenti anapụla ihe ruru ụlọọrụ 1,800 ikike ha nwere ịkpọbata ndị ọrụ si mba ọzọ.

Ndị na-erughị eru ịnata ikike obibi mgbe afọ ise gachara ga-enweta visa ọhụrụ nke ga-adị afọ ise ọzọ. Mgbe ha mechara ya, ha nwereike ịrịọ maka ikike obibi ruo ebighi ebi.

N'ozuzu, mgbanwe a pụtara na ọtụtụ ndị mbịarambịa ga-eche karịa afọ ise tupu ha enweta ikike ibi na UK ruo mgbe ebighi ebi. Ma gọọmenti kwuru na o nweghị onye a ga-achụpụ n'ihi mgbanwe ndị a, n'ihi na a ga-enye onye ọbụla ohere itinye akwụkwọ maka visa ọhụrụ.

Usoro yiri nke a ga-emetụtakwa ndị ọrụ ọha nọ na ngalaba ahụike na agụmakwụkwọ bụ ndị bịarutere n'otu oge ahụ.

Iwu gbasara inweta ọnọdụ obibi ruo ebighi ebi ga-aga n'ihu na-arụ ọrụ dịka ha si arụ ọrụ mgbe mmadụ tinyere akwụkwọ arịrịọ ya, dịka ọ na-adịbu na Britain na mbaụwa.

N'ihi mgbanwe ndị a, a na-atụ anya na ihe karịrị mmadụ 500,000 ga-eche karịa afọ ise tupu ha enweta ọnọdụ obibi ruo ebighi ebi, nke ga-ebelata ọtụtụ ijeri paụnd n'ego a na-eji akwado ọdịmma mmadụ.

A gaghị amanye onye ọbụla ịhapụ obodo ahụ, ma onye ọbụla ga-enwe ohere ziri ezi inweta visa ọhụrụ nke nwereike ime ka o nweta ọnọdụ obibi ruo ebighi ebi mgbe afọ iri gachara.

Ntuziaka a na-akọkwa etu ndị gbara ọsọndụ nwereike isi nweta akwụkwọ obibi ruo ebighi ebi.

Ọ na-akwado ka ndị mmadụ jiri ụzọ iwu kwadoro bata, ma na-agwa ha ka ha ghara iji obere ụgbọmmiri maọbụ ụzọ iwu na-akwadoghi bata.

Ndị gbara ọsọndụ bịara site n'ụzọ 'Home Office' kwadoro ga-enwe ike inweta akwụkwọ obibi ruo ebighi ebi mgbe afọ ise gachara. Ndị ọzọ ga-echere afọ 20, ma ọ bụrụ na ha na-arụ ọrụ maọbụ na-amụ akwụkwọ, oge ahụ nwereike ibelata ruo afọ iri.

Onye ọbụla bịara site n'obere ụgbọmmiri maọbụ ụzọ nzuzo ọbụla ga-eche afọ 10 ọzọ. Nke a pụtara na ụfọdụ nwereike ichere ruo afọ 30 tupu ha enweta akwụkwọ obibi ruo ebighi ebi.

A gaghị anapụ onye ọbụla akwụkwọ obibi ruo ebighi ebi ma ọ bụrụ na o nwetala ya na mbụ. Ndị ezinaụlọ ụmụ amaala Britain, ndị Hong Kong British Nationals (Overseas), na ndịagha ga-aga n'ihu na-eji usoro ha na-eji ugbua.

Mba UK ga-enwekwa usoro mbata na obibi nke ga-adị mfe ma bụrụkwa nke na-akwado ndị ọrụ nwere nnukwu nka karịa mba ndị ọzọ dị n'Europe.