Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ngagharịiwe maka ọnụ ahịa na-arị elu etiwapụla na mba Germany
Ụmụ 'Gen Z' na-akpọ onwe ha 'Gen Z regelt' ebidola ime ngagharịiwe maka ọnụ ahịa na-arị elu na mba Germany.
Ha bidoro ime ngagharịiwe ahụ kemgbe ụbọchị Satọde na Frankfurt dị na mba Germany.
Ewepụ Frankfurt ngagharịiwe nakwa ọgbaaghara tiwapụkwara na mpaghara Berlin, Cologne na Hamburg dịka ndị uweojii si kwuo.
Ndị uweojii na mba ahụ ji mmiri ọkụ na-achụsasị ndị mmadụ mana ndị na-eme ngagharịiwe ji okwute na karama na-atụ ndị uweojii.
Ngagharịiwe ahụ bidoro n'udo dịka puku pụrụ puku mmadụ sonyere na ya tupu ọgbaaghara adabata na ya.
Kedụ ndị bụ 'Gen Z regelt' ?
Ndị a na-ahazị ngagharịiwe ugbua maka ọnụ ahịa na-arị elu na mpaghara dị icheiche na mba Germany kpọrọ onwe ha "Gen Z regelt".
'Gen Z regelt' pụtara n'olu Igbo "Ọgbọ ndị Gen Z nwere ọnọdụ ndu" maọbụ "Gen Z takes charge" n'olu Bekee.
Ihe ndị mere ha ji eme ngagharịiwe ahụ gunyere na gọọmenti adịghị akwado ngalaba akụmụakwụkwọ nke ọma, ego mmefu gọọmenti ha na-ada mba, nakwa ngalaba ndịagha.
Mịnịsta na-ahụ maka ime mba germany bụ Alexander Dobrindt kwuru n'abalị garaaga ka ndị uweojii gbochiri ngagharịiwe yiri udiri nke e mere na Paris ma kwuo ka e nye ndị na-eme ngagharịiwe 'nnukwu ntaramaahụhụ' maka mwakpo ụlọahịa ndị mmadụ na izuru ihe.