INEC sị ha achọpụtala ndị tinyere foto AI n'ime akwụkwọ ndekọ ndị ga-atụ vootu

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission, INEC enyela nkọwa banyere etu foto AI si banye na ndekọ ndị ga-atụ vootu n'afọ 2027.

Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ICT n'ụlọọrụ INEC bụ Lawrence Bayode gwara ụlọọrụ mgbasaozi na Nigeria na nnyocha ha merela gosiri na ọ bụ ndị ụfọdụ ndị ọrụ ha na-edebanye aha ndị ga-atụ vootu tinyere foto e ji akụrụngwa AI rụọ.

Lawrence Bayode kọwaara na e mere nke a na mpaghara dị iche iche na Nigeria.

N'okwu ya "anyị nwere ndị gara ọrụ idebenye aha ndị mmadụ. Ọtụtụ n'ime ha nwere ikike imepe akụrụngwa ndekọ aha ndị mmadụ".

Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ foto ndị ahụ abụghị AI ebe ọtụtụ n'ime ha bụ maka na usoro e si debanye aha ndị ahụ adịghị mma.

Bayode kwuru na Inec ahụla ndekọ ndị ahụ ma ghọta etu foto AI ahụ si banye na ndekọ ndị ga-atụ vootu mana ihe ha na-enweghi ike ịkọwanwu bụ ihe kpatara ndị ọrụ ha ji mee ihe ha mere.

Etu ihe a si bido

Ihe a niile bidoro mgbe ụlọọrụ INEC bipụtara ma kesaa aha ndị ga-atụ vootu na ntuliaka 2027 na website ha.

N'oge ahụ ka ndị mmadụ chọpụtara na ọtụtụ foto dị na ndekọ Inec bipụtara na website ha bụ nke a na-enyo enyo na e ji akụrụngwa Ai rụpụta.

Igwe mmadụ na soshal midia katọrọ Inec ma kpọọ oku ka ha mee ezigbo nnyocha maka nke ahụ.

N'oge ahụ ka Inec kwere nkwa na ha ga-enyocha foto Ai ndị ahụ.

Inec kwetere na foto ndị ahụ so na nke ha bipụtara na website ha.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Mohammed Kudu Haruna wepụtara n'abalị Tuzde 27 Ọktoba 2026, ka ụlọọrụ ahụ mere ka o doo anya na ndekọ ahụ ha tinyere na website ha n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba 2026 bụ otu ndekọ mbụ ahụ ha gosiri n'ihu ọha mmasdụ site n'Ọktoba 9 ruo 15.