Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Binance na-agba mbọ inweghachite ego Crypto ha ruru ijeri dọla 6.3 a sị ndị ohi ịntanetị na North Korea zuuru
- Onye dere ya, Jaroslav Lukiv
- Onye dere ya, Joe Tidy
- Ndị mere akụkọ a, Cyber correspondent, BBC World Service
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Binance bụ ụlọọrụ kachasị ukwuu n'ụwa na-ahụ maka azụmaahịa ego crypto, kwuru na ha akpachiela ihe dịka ọkara n'ego ndị ọhi ịntanetị a kpọrọ 'hacker' zuuru. Ndị hacker ahụ zuru akụ dijitalụ ruru ijeri dọla 6.3, nke a na-ekwu na ọ bụ ohi crypto kachasị ukwuu e metụrụla.
Binance kwuru na ha echekwala ihe dịka ijeri dọla 3 n'ime ego ahụ, mana ụfọdụ ego ndị ọzọ ka nọ n'aka ndị hacker a na-amaghị ndị ha bụ.
Na mbụ, ụlọọrụ ahụ chere na nsogbu ahụ sitere n'ịwakpo kọmputa otu n'ime ndị ọrụ ha. Ma mgbe ha nyochachara nke ọma, ha chọpụtara na mwakpo ahụ sara mbara karịa ka ha tụrụ anya.
Ụlọọrụ dị iche iche na-enyocha azụmaahịa crypto kwuru na o nwereike ịbụ otu ndị hacker si North Korea mere mwakpo a. Ohi a karịrị nke e mere n'elu ikpo okwu Bybit na 2025, ebe a zuru ijeri dollar 1.5.
US Secret Service kwuru na ha na-arụsi ọrụ ike ịchọpụta ndị mere mwakpo ahụ, ịchọta ego ndị e zuru, igbochi ka e jiri ha mee ihe, ma weghachite ha azụ.
Gọọmenti America kwukwara na ha ga-achọpụta ndị mere mpụ a ma mee ka ha zara ọnụ ha. Binance kwuru na ha na ngalaba nchekwa FBI na-arụkọkwa ọrụ n'ịchọ ndị omempụ ahụ.
Ọ bụ ezie na Binance kwuru na ọrụ ha n'America emetụtaghị mwakpo ahụ, America ka na-enyere aka n'ịchọpụta ebe ego ndị e zuru nọ.
Mwakpo ahụ metụtakwara ụfọdụ ego crypto dịka Tether na Circle, ndị e jikọtara uru ha na dọla nke America.
Binance mesiri ndị ahịa ha obi ike site n'ikwu na:
"Ego unu nọ n'udo. Anyị ga-akwụghachị ego ndị ahịa ọbụla furu n'ihi mwakpo a."
Na mbụ, Binance kwụsịrị ọrụ itinye ego (deposit) na iwepụta ego (withdrawal) n'ọbaozi ha. Ma mechaa wepụta ozi ọhụrụ sị na:
"Itinye ego adịghị enwe nsogbu ọbụla."
Onye isiụlọọrụ Binance bụ Richard Teng, kwuru, sị: "Ọ bụghị naanị otu onye mere mwakpo a. Nnyocha mbụ anyị gosiri na nsogbu nchekwa a nwereike ịbụ n'ihi kọmputa (laptọọpụ) a wakporo. Ma nnyocha anyị mere gosiri na e nwere ebe ndị ọzọ ndị omempụ si banye n'usoro nchekwa anyị."
Teng kọwakwara na ndị hacker ahụ jiri ụzọ pụrụiche kpuchie ihe ama ha. Dịka ya si kwuo, ha jiri usoro a na-akpọ "self-destruct mechanism", nke na-ebibi ngwaọrụ na ihe ama ha jiri arụ ọrụ mgbe ha na-apụ. Nke a mere ka o sie ike ịchọpụta ụzọ ha sị rụọ ọrụ ahụ.
Na mbụ, Binance kwuru na nsogbu ahụ nwereike ịmalite site n'ịwakpo laptọọpụ otu onye ọrụ ha na-ahụ maka teknụzụ (DevOps engineer). Ma ka nnyocha na-aga n'ihu, ụlọọrụ ahụ chọpụtara na ndị omempụ ahụ banyere n'usoro nchekwa ha n'ụzọ sara mbara karịa ka a tụrụ anya ya.
Ka ọ dị ugbu a, ụlọọrụ TRM Labs, nke na-eji ọgụgụ isi kọmputa (AI) eme nnyocha, kwuru na ntọala mwakpo a yiri mwakpo e mere na mba North Korea n'oge gara aga, gụnyere mwakpo e mere ụlọọrụ Bybit.
N'ime afọ ise gara aga, ndị hacker ezurula nnukwu ego crypto n'ụwa niile.
N'ọtụtụ n'ime mwakpo ndị a niile, ndị nnyocha na-atụ aka n'ebe ndị hacker si North Korea nọ. Ha na-akpọkarị otu a Lazarus Group maọbụ TraderTraitor. Aha ndị a na-ezo aka n'otu ndị omempụ internet a na-ekwu na ha na-arụ ọrụ maka gọọmenti North Korea.
Ụlọọrụ nnyocha crypto a na-akpọ Chainalysis kwuru na ha nwere nnukwu ntụkwasị obi na mmadụ maọbụ otu sitere na North Korea so na mwakpo Binance a.
North Korea bụ mba dara ogbenye nke ukwuu, nke na-enweghị nnukwu ụlọọrụ mmepụta ihe ma nwekwaa ọtụtụ mmachi mbaụwa tinyere n'isi ha. Ndị ọkachamara na-ekwu na gọọmenti obodo ahụ na-eji mpụ internet eme ụzọ isi nweta ego.
N'agbanyeghị nke a, North Korea na-agọnahụ mgbe niile na ha na-etinye aka n'ụdị mpụ ndị a. Ma ọtụtụ ihe ama sitere n'ịgbaso ụzọ ego crypto si aga na nkwupụta ndị mmadụ gbapụrụ n'obodo ahụ emeela ka ọtụtụ ndị kweta na e nwere njikọ siri ike.
N'ihi nke a, ọtụtụ ndị ọkachamara kwenyere na North Korea nwereike ịbụ naanị mba n'ụwa nke na-eji ọrụ hacking dị ka otu ụzọ isi nweta ego maka gọọmenti ya.