Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ụlọikpe ewepụla Hope Uzodimma oche n'otele, nye Rochas Okorocha maka onye ga-azọrọ APC ọkwa Senetọ ga-anọchite Imo -West
Ụlọikpe nke Etiti dị n'Abuja enyela ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ Inec ntuziaka ka ha bipụta aha aka chịbụrụ Imo steeti bụ Rochas Okorocha dịka onye meriri na ntuliaka imeụlọ nke otu APC mere maka ọkwa onye ga-anọchite Imo-West n'Ụlọọmeiwu Ukwu Nigeria.
Ụlọikpe nke nyere iwu ahụ n'ụtụtụ Tozde,nyekwara iwu ka aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma kwụsị ịkpọ onwe ya onye ga-anọchite mpaghara ahụ na Ntuliaka a 2027.
N'ikpe nke bu akara,FHC/ABJ/CS/1854/2026) nke Okorocha gbara megide ụlọọrụ na ahazi ntuliaka,'Independent National Electoral Commission' (INEC), APC nakwa Uzodimma, Ọ gbaghara mbipụta nke Inec* bipụtara aha Uzodimma dịka onye ga-efere APC ọkọlọtọ maka ọkwa ịnọchite mpaghara Imo-West n'Ụlọọmeiwu Ukwu na ntuliaka 2027.
Ọkaikpe na n'isi ikpe ahụ bụ Jọstịs Egwuatu kwuru na ihe akaebe gosiri na ọ bụ Okorocha nwetara vootu kachasị na ntuliaka imeụlọ nke pati ha bụ APC mere maka ọkwa senetọ ga-anọchite mpaghara ahụ.
N'ihe onyonyo o wepụtara na soshal midia n'ogige ụlọikpe, ọkaiwu na-anọchịte Okorocha kwuru na "Anyị sị n'ụlọikpe pụta ugbua, ụlọikpe enyochaala ma nye Inec iwu ka ha, ozigbo ozigbo bipụta aha Rocha Okorocha dịka Senetọ ga-anọchite Imo West na ntuliaka ."
"Ọ bụ ya meriri na ntuliaka (Imeụlọ APC ) mana APC weghara Inec aha onye emerighị na ntuliaka."