Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Donald Trump enyela nne Javits Frimpong bụ nwafọ mba Ghana e gburu na Bronx akwụkwọ ikike njem Visa
Onyeisiala mba America bụ Donald Trump enyela Doris Adu Gyamfi bụ nne Javits Frimpong e gburu na mpaghara Bronx dị na America akụkwọ ikike njem Visa ka ọ nweike ịkwanyere nwa ya nwoke ugwu ikpeazu.
Javits Frimpong bụ nwatakịrị nwoke dị afọ iri na ise. A gbagburu ya n'ụbọchị Thursday n'ụzụ ụtụtụ.
Mayor New York bụ Zohran Mamdani ji akara X kwuo na Onyeisiala Donald Trump ekwetela ka e nye nne Javits Frimpong akwụkwọ ikike njem Visa.
Zohran Mamdan kwuru sị na ọ bụ n'ekwentị ka ya na Donald Trum nwere mkpebi ahụ ma kọwa ọnwụ Frimpong dịka "ihe ụfụ nne na nna ọbụla ekwesighị inwete ọkachasị ndị nke nọ n'ebe tereaka."
''Nne Javits Frimpong kwesiri ịbịa kwanyere ya ugwu ikpeazụ ma nọrọ ebe a gwa ya laa nke ọma. Ọ bụ n'ekwentị ka m na Onyeisiala Trump kpachara nkata ọ ma kwete ka e nye ya akwụkwọ ikike njem Visa ozugbo ozugbo".
''Onye ọbụla na New York City na-eri uju maka ọdachi a".
Etu e si gbuo Javits Frimpong
Nna Javits Frimpong kwuru na a gbagburu ya n'ihe dịka elekere itoolu n'ihe dịka tinkomtinkom iri abụọ.
Ebe a gbagburu Javits Frimpong dị nsọ n'ụlọ ha. A gbara ya egbe ahụ mgbe ọ na-aga akwụkwọ.
Mana ihe butere e ji gbagbuo ya edobeghị anya.
Ugbua a na-chọ ụmụaka atọ a na-enyo enyo na ha gburu Javits Frimpong maka na ha si n'ebe ọ nwụrụ gbapụ ọsọ.
Foto sitere na nyocha a na-eme gosiri oge Javits Frimpong na-agba ọsọ ndụ ya dịka a na-achụ ya ọsọ ebe otu onye n'ime ndị ahụ nyi uwe ojii ma kpuchie ihu ya.