Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ifeanyichukwu Joseph: Ihe anyị ma maka nwokorobia a sị si n'ụlọelu tụtuo nwanne enyi ya nwaanyị n'Imo state
Ndị uweojii Imo state kwuru na ha anwụchiela otu nwokorobịa maka ebubo na o si n'elu ụlọelu tutuo nwanne enyi ya nwaanyi.
A nwụchiri Ifeanyichukwu Joseph gbara afọ 26 n'ebe Okporoụzọ Ejike Mbonu dị n' Ikenegbu,Owerri,Imo state ụbọchị ụka ,abalị mbụ nke ọnwa Novemba , afo 2026 maka ịtụtu Chiamaka Chukwuokore gbara afọ 17 n'elu ụlọelu ogogo abụọ dịka ọ gbalịrị iwakpo nwata nwagbọghọ ahụ, nke nwaanyị ajụ.
Akụkọ kwuru na enyi nwaanyị Joseph mere njem ma hapụ nwanne ya nwaanyị na enyi ya nwoke n'ụlọ, nke nwoke gbaliri idina ya, nke nwaanyị ajụ, ya atụtuo ya n'elu ụlọelu.
Agwa nwata nwoke ahụ kpara kpalitere iwe igwe ndị mmadụ ndị gbakọrọ ma kụwa ya ihe tupu ndị uweojii abịa zọpụta ya, ma kpụrụ ya pụọ.
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ebe ndị e chere bụ ndị uweojii napụtara ya n'aka igwe ndị mmadụ na-achụso ya, tinye ya n' ụgbọala ntakịrị(Korokwe)buru ya pụọ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Imo Steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha anwụchiela nwoke ahụ n'ezie.
Ọ kọwara na ndị uweojii gbarutere ebe ahụ n'oge iji gbochie ndị mmadu ịkụgbu nwoke ahụ n'ebe ihe ahụ mere.
Ọ kọwakwara na ebugala nwata nwaanyị ahụ e cheburu na ọ nwụrụ anwụ n'ụlọọgwụ.
Akụkọ ka na-abịa.