Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Tinubu emezuola nkwa ya n'afọ 2023 inye ụmụafọ Nigeria ọkụ latrik?
Otu na-ahụ maka achụm ntavootu Onyeisiala Bola Tinubu maka ntuliaka 2027 ekwuola na ọtụtụ mmadụ aghọtaghị nkwa Tinubu kwere ụmụafọ Nigeria n'afọ 2023, na ọ ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ ọkụ latrik arụrụ arụ ma hụkwa na ọkụ anaghị anyụ anyụ.
Ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ bụ Dele Alake, kwuru n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde abalị mbụ nke ọnwa Nọvemba, na Tinubu kwere nkwa ahụ mgbe ọ na-agwa ndị otu ụlọọrụ azụmahịa na Lagos okwu tupu ntuliaka afọ 2023.
Alake kọwara na ụfọdụ ndị na-ekwu maka okwu ahụ ugbu a na-ewepụ akụkụ okwu Tinubu kwuru na ya ga-enye ndị Nigeria ezi nkọwa maọbụrụ na ya emezughị nkwa ahụ tupu ya abịa ịchụ ntavootu maka ọchịchị nke agba abụọ ya.
Alake kwuru na Tinubu kọwapụtara atụmatụ iji dozie nsogbu nhazi na ụlọọrụ dị iche iche na-ahụ maka n'ihe gbasara ọkụ latrik, ọkachasị atụmatụ ịkwụ ụgwọ n'ụlọ na azụmaahịa.
Pati All Progressive Congress (APC) kwuru na e kwesịrị iji ihe ndị Onyeisiala Tinubu mere na ngalaba ọkụ latrik kemgbe ọ malitere ọrụ n'afọ 2023, atụle ya.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Gịnị ka ọchịchị Tinubu mere maka ọkụ latrik?
Dịka Alake si kwuo, Tinubu binyere aka n'iwu ọkụ latrik 'Electricity Act 2023' abalị itoolu nke ọnwa Juun bụ izu abụọ ọ banyere n'ọchịchị.
Iwu ahụ nyere ndi ọchichi state dị iche iche na Nigeria ohere itinye aka n'ịmepụta na ikesa ọkụ latrik nke onwe ha.
O kwuru na st dịka Lagos, Enugu, Abia, Ekiti, Oyo, Kaduna na Niger amalitela ịmepụta ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latrik iji dọta ndị ọchụnta ego.
N'ihe gbasara inye ndị mmadụ mita ọkụ latrik, Alake kwuru na gọọmenti malitere 'Presidential Metering Initiative' iji dozie nsogbu nke ndị ahịa ọkụ latrik karịrị nde asaa na-enweghị mita, ma gbakwụnye na ha enyela ihe karịrị nde mmadụ mita n'okpuru atụmatụ ahụ.
Ọ gbakwụnyere na gọọmenti amalitela usoro iji dozie ụgwọ ochie karịrị ijeri naịra puku isii (₦6tn) e ji ụlọọrụ na-emepụta ọkụ na ndị na-ebunye mmanụ ọkụ gaasị, ma malitekwa ịgba ụgwọ ruru ijeri naịra puku anọ (₦4tn).
Alake kwetara na nsogbu ọkụ latrik ka dị na Nigeria, mana o kwuru na Tinubu ka kwụsiri ike n'ịrụ ọrụ iji dozie nsogbu ndị ahụ.
O kwuru na onyeisiala ga-akọwara ndị Nigeria ihe gọọmenti ya mere maka ọkụ latrik nakwa ihe fọdụrụ ime, tupu ọ malite ịchụ ntavootu maka ọchịchị nke abụọ ya.
Kedụ ihe ụmụafọ Nigeria na-ekwu?
Dịka Nigeria na-akwado ime ntuliaka ọha n'afọ 2027, ọtụtụ ndị a ma ama na Nigeria akatọla Onyeisiala Tinubu maka ọnọdụ enweghị ọkụ latrik na mpaghara dị iche iche.
Onye ji ọkọlọtọ pati Africa Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa onyeisiala Nigeria bụ Atiku Abubakar, akatọla gọọmenti Bola Tinubu, ma boo ya ebubo na emezughị nkwa o kwere na ya ga-ewetere ụmụafọ Nigeria ọkụ latrik na-adịgide adịgịde.
N'ozi ọnụ na-ekwuru otu achụm ntavootu Atiku bụ Phrank Shaibu, wepụtara na Sọnde, ka Atiku kwuru na ọtụtụ ezinụlọ na ndị ji ego achụnta ego ka nọ n'ọchịchịrị, n'agbanyeghị ego ha na-akwụ maka ọkụ latrik na nke ha na-emefu n'ịzụta mmanụ ụgbọala iji mụọ igwe ọkụ latrik.
O katọrọ usoro nkewa ndị na-amụ ọkụ latrik bụ nke a kpọrọ 'Band A, B, C, D na E,' n'olu Bekee, ebe ụgwọ ha na-akwụ na-adabere n'ọkwa ha nọ.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị nọ na 'Band A', bụ ndị na-akwụ ụgwọ dị elu, ka na-enwe nsogbu ọkụ latrik.
Onye bụbu osote onyeisiala kwuru na ọ ga-ewepụ usoro ịkwụ ụgwọ ọkụ latrik nke ọkwa ise dị ugbu a, ma jiri usoro ọ sịrị ga-adị mma, doo anya ma dị ọnụ ala dochie ya.